\id EZR - Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 \ide UTF-8 \h Ezra \toc1 Ezra \toc2 Ezra \toc3 Ezr \mt1 Ezra \c 1 \s1 Sairọs enyere ndị na-alaghachi aka \p \v 1 Nʼafọ mbụ nke ọchịchị Sairọs, eze Peshịa, ime ka okwu \nd Onyenwe anyị\nd* nke sitere nʼọnụ Jeremaya mezuo, \nd Onyenwe anyị\nd* kpaliri mmụọ Sairọs, eze Peshịa ka o mee mkpọsa nʼalaeze ya niile, ma denyekwa ya nʼakwụkwọ iwu, sị, \pmo \v 2 “Otu a ka Sairọs, eze Peshịa kwuru, \pm \nd “ ‘Onyenwe anyị\nd* Chineke nke eluigwe, e nyela m alaeze\f + \fr 1:2 \fr*\ft Alaeze Sairọs gbatịrị site nʼIndia jeruo Ijipt, ma sitekwa nʼebe dị warawara nʼosimiri Uhie ruo Kush.\ft*\f* niile nke dị nʼụwa, o nyekwala m ọrụ iwuru ya ụlọnsọ na Jerusalem, nke dị na Juda. \v 3 Ya mere, onye ya ọbụla nʼetiti ndị ya nwere ike ịga Jerusalem nke dị na Juda, gaa wuo ụlọnsọ \nd Onyenwe anyị\nd*, Chineke Izrel, bụ Chineke nọ na Jerusalem. Ka Chineke ha nọnyekwara ha. \v 4 Ma nʼobodo ọbụla ebe ndị fọdụrụ ndụ bi, ka ndị nọ nʼebe ahụ nye ha onyinye ọlaọcha na ọlaedo, na akụ na anụ ụlọ nʼụzọ enyemaka, tinyere onyinye afọ ofufu maka ụlọnsọ ukwu Chineke nke dị na Jerusalem.’ ” \p \v 5 Mgbe ahụ, Chineke tinyere ọchịchọ ịlaghachi Jerusalem\f + \fr 1:5 \fr*\ft Nke a bụ ogologo ụzọ dị narị kilomita itoolu maọbụ otu puku. Ọ ga-ewe onye ije ihe dịka ọnwa abụọ, maọbụ atọ iji ụgbọala nke ịnyịnya na-adọkpụ ruo Jerusalem.\ft*\f* nʼobi ndịisi ezinaụlọ Juda na Benjamin na ndị nchụaja, na ndị Livayị. Ha kwadokwara ịlaghachi maka ịrụ ọrụ ụlọnsọ \nd Onyenwe anyị\nd* ahụ na-atụfughị oge. \v 6 Ndị Juu bi na gburugburu Peshịa nyere ndị nke na-alaghachi Jerusalem onyinye ihe ọlaọcha na ọlaedo, na anụ ụlọ na ihe ndị ọzọ, na onyinye dị oke ọnụahịa dị iche iche, tinyere onyinye afọ ofufu ha. \p \v 7 Nke ka nke, eze Sairọs chịpụtara ọtụtụ ngwongwo nke ụlọnsọ \nd Onyenwe anyị\nd* nke Nebukadneza sitere na Jerusalem bukọrọ gaa debe nʼụlọ chi ya. \v 8 Sairọs bụ eze Peshịa, chịpụtara ha site nʼaka Mitredat, onye bụ odozi akụ, onye gụrụ ha ọnụ nye Sheshbaza, onye bụ onyeisi ndị Juu ahụ na-alaghachi Jerusalem na Juda. \b \li4 \v 9 Nke a bụ ọnụọgụgụ ngwongwo ndị ahụ: \b \li1 efere ọlaedo iri atọ (30), \li1 efere ọlaọcha otu puku (1,000), \li1 efere ọlaọcha iri abụọ na itoolu (29), \li1 \v 10 efere nta ọlaedo iri atọ (30), \li1 efere ọlaọcha nta narị anọ na iri (410), \li1 ngwongwo ndị ọzọ otu puku (1,000). \b \li4 \v 11 Nʼime ihe ndị a niile, ọnụọgụgụ ihe e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ dị puku ise na narị anọ (5,400). \b \p Sheshbaza bulatara ihe ndị a mgbe ya na ndị ahụ a dọọrọ nʼagha hapụrụ Babilọn na-alọta Jerusalem. \c 2 \s1 Ọnụọgụgụ ndị lọtara \li4 \v 1 Ugbu a, ndị a bụ ndị obodo niile a na-achị achị, bụ ndị sitere na ndọta nʼagha nke Nebukadneza, eze Babilọn, onye dọtara ha nʼagha buru ha laa Babilọn. Ha lọghachitere na Jerusalem nakwa Juda, onye ọbụla nʼobodo nke ha. \v 2 Ndịisi ha na Zerubabel soo, bụ Jeshua, Nehemaya,\f + \fr 2:2 \fr*\ft Nehemaya a na-ekwu ihe banyere ya nʼebe a, abụghị nke dere akwụkwọ Nehemaya\ft*\f* Seraya, Reelaya, Mọdekai, Bilshan, Mispa, Bigvai, Rehum na Baana. \b \li4 Ihe ndepụta ọnụọgụgụ ndị ikom Izrel bụ nke a: \li1 \v 3 Ndị agbụrụ Parosh, puku abụọ, otu narị na iri asaa na abụọ (2,172). \li1 \v 4 Ụmụ Shefataya, narị atọ na iri asaa na abụọ (372). \li1 \v 5 Ụmụ Ara, narị asaa na iri asaa na ise (775). \li1 \v 6 Ụmụ Pahat-Moab (site nʼụmụ Jeshua na Joab), dị puku abụọ na narị asatọ na iri na abụọ (2,812). \li1 \v 7 Ụmụ Elam, otu puku na narị abụọ na iri ise na anọ (1,254). \li1 \v 8 Ụmụ Zatu, narị itoolu na iri anọ na ise (945). \li1 \v 9 Ụmụ Zakai, narị asaa na iri isii (760). \li1 \v 10 Ụmụ Bani, narị isii na iri anọ na abụọ (642). \li1 \v 11 Ụmụ Bebai, narị isii na iri abụọ na atọ (623). \li1 \v 12 Ụmụ Azgad, otu puku na narị abụọ na iri abụọ na abụọ (1,222). \li1 \v 13 Ụmụ Adonikam, narị isii na iri isii na isii (666). \li1 \v 14 Ụmụ Bigvai, puku abụọ na iri ise na isii (2,056). \li1 \v 15 Ụmụ Adin, narị anọ na iri ise na anọ (454). \li1 \v 16 Ụmụ Atea, site na Hezekaya, iri itoolu na asatọ (98). \li1 \v 17 Ụmụ Bezai, narị atọ na iri abụọ na atọ (323). \li1 \v 18 Ụmụ Jora, otu narị na iri na abụọ (112). \li1 \v 19 Ụmụ Hashum, narị abụọ na iri abụọ na atọ (223). \li1 \v 20 Ụmụ Giba, iri itoolu na ise (95). \b \li1 \v 21 Ndị ikom Betlehem, otu narị na iri abụọ na atọ (123). \li1 \v 22 Ndị ikom Netofa, iri ise na isii (56). \li1 \v 23 Ndị ikom Anatot, otu narị na iri abụọ na asatọ (128). \li1 \v 24 Ndị ikom Azmavet, iri anọ na abụọ (42). \li1 \v 25 Ndị ikom Kiriat Jearim,\f + \fr 2:25 \fr*\ft Maọbụ, \ft*\fqa Kiriat Arim\fqa*\f* Kefira na Beerọt, narị asaa na iri anọ na atọ (743). \li1 \v 26 Ndị ikom Rema na Geba, narị isii na iri abụọ na otu (621). \li1 \v 27 Ndị ikom Mikmash, otu narị na iri abụọ na abụọ (122). \li1 \v 28 Ndị ikom Betel na Ai, narị abụọ na iri abụọ na atọ (223). \li1 \v 29 Ndị ikom Nebo, iri ise na abụọ (52). \li1 \v 30 Ndị ikom Magbish, otu narị na iri ise na isii (156). \li1 \v 31 Ụmụ Elam nke ọzọ, otu puku, narị abụọ na iri ise na anọ (1,254). \li1 \v 32 Ụmụ Harim, narị atọ na iri abụọ (320). \li1 \v 33 Ụmụ Lod, Hadid na Ono, narị asaa na iri abụọ na ise (725). \li1 \v 34 Ụmụ Jeriko, narị atọ na iri anọ na ise (345). \li1 \v 35 Ụmụ Senaa, puku atọ, narị isii na iri atọ (3,630). \b \li4 \v 36 Ndị nchụaja: \li1 ndị agbụrụ Jedaya (site nʼezinaụlọ Jeshua), narị itoolu na iri asaa na atọ (973) \li1 \v 37 ndị Imea, otu puku na iri ise na abụọ (1,052) \li1 \v 38 ndị Pashua, otu puku na narị abụọ na iri anọ na asaa (1,247) \li1 \v 39 ndị Harim, otu puku, otu narị na asaa (1,107). \b \li4 \v 40 Ndị Livayị: \li1 Ndị agbụrụ Jeshua na Kadmiel (nke ụmụ Hodavaya), iri asaa na anọ (74). \b \li4 \v 41 Ndị ọbụ abụ: \li1 Ndị agbụrụ Asaf,\f + \fr 2:41 \fr*\ft Asaf bụ otu nʼime ndị Livayị, onye Devid họpụtara maka ịhụ ihe banyere abụ. \+xt 1Ih 15:19; 16:5\+xt*\ft*\f* otu narị, na iri abụọ na asatọ (128). \b \li4 \v 42 Ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu:\f + \fr 2:42 \fr*\ft Ndị a bụ ndị nche ụlọ ukwu, ha si nʼebo Livayị. \+xt 1Ih 15:18\+xt*\ft*\f* \li1 Ndị agbụrụ Shalum, Atea, Talmon, Akub, Hatita na Shobai. Ha dị otu narị, na iri atọ na itoolu (139). \b \li4 \v 43 Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ: \li2 Ndị agbụrụ\f + \fr 2:43 \fr*\ft Maọbụ, \ft*\fqa ikwu\fqa*\f* Ziha, Hasufa na ndị Tabaot, \li2 \v 44 Keros, Siaha, Padon, \li2 \v 45 Lebana, Hagaba, Akub, \li2 \v 46 Hagab, Shalmai, Hanan, \li2 \v 47 Gidel, Gaha, Reaya, \li2 \v 48 Rezin, Nekoda, Gazam, \li2 \v 49 Ụza, Pasea Besai, \li2 \v 50 Asna, Meunim, Nefusim, \li2 \v 51 Bakbuk, Hakufa, Hahua, \li2 \v 52 Bazlut, Mehida, Hasha, \li2 \v 53 Bakos, Sisera, Tema, \li2 \v 54 Nezaya na Hatifa. \li4 \v 55 Agbụrụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi, \li2 ya bụ ndị agbụrụ Sotai, Hasoferet, Peruda, \li2 \v 56 Jaala, Dakon, Gidel \li2 \v 57 Shefataya, Hatil, na Pokeret-Hazebaim na Ami. \li4 \v 58 Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, na ụmụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi, dị narị atọ na iri itoolu na abụọ (392). \b \li4 \v 59 Ndị a bụ ndị ọzọ sitere nʼobodo Tel Mela, Tel Hasha, Kerub, Adọn na Imea, nke dị nʼala Peshịa lọta. Ma ha enweghị ike igosi ezinaụlọ ebe agbụrụ ha si nʼIzrel. \li1 \v 60 Ndị agbụrụ Delaya, Tobaya na Nekoda, narị isii na iri ise na abụọ (652). \b \li4 \v 61 Sitekwa nʼetiti ndị nchụaja: \li1 Ndị agbụrụ Hobaya, Hakoz na Bazilai, nwoke lụrụ ada Bazilai onye Gilead, a kpọọ ya aha nʼaha ha. \li4 \v 62 Ndị a chọrọ ebe e depụtara usoro ọmụmụ ha nʼakwụkwọ, ma ha achọtaghị ha, nʼihi ya, e wepụrụ ha nʼọrụ nchụaja dịka ndị na-adịghị ọcha. \v 63 Onyeisi ọchịchị nyere iwu ka ha ghara iri ihe dịkarịsịrị nsọ tutu ruo mgbe e nwere onye nchụaja na-eji Urim na Tumim ajụta ase. \b \li4 \v 64 Nkpọkọta ọnụọgụgụ ndị niile lọtara dị iri puku anọ na abụọ, na narị atọ, na iri isii (42,360), \v 65 nke a agụnyeghị ndị ohu ndị ikom na ndị inyom dị puku asaa na narị atọ na iri atọ na asaa (7,337), ndị ikom na ndị inyom, ndị ọbụ abụ\f + \fr 2:65 \fr*\ft Tinyere ndị Livayị na-abụ abụ, e nwere ọtụtụ ndị ọzọ na-abụ abụ nʼoge mmemme dị iche iche, dịka nʼoge ọlụlụ nwanyị, na nʼoge mmemme olili, ya bụ ọnwụ.\ft*\f* dị narị abụọ (200). \v 66 Ịnyịnya dị narị asaa na iri atọ na isii (736), ebe ịnyịnya muul dị narị abụọ na iri anọ na ise (245). \v 67 Ịnyịnya kamel ha dị narị anọ na iri atọ na ise (435), ebe ịnyịnya ibu dị puku isii, na narị asaa, na iri abụọ (6,720). \b \p \v 68 Mgbe ha bịarutere nʼụlọ \nd Onyenwe anyị\nd* dị na Jerusalem, ụfọdụ nʼime ndịisi ezinaụlọ nyere onyinye afọ ofufu maka i ji rụzie ụlọ Chineke ka o guzo nʼọnọdụ ya. \v 69 Onye ọbụla nʼime ha webatara nʼụlọakụ ihe o nwere ike inye nʼihi ọrụ a. Ha nyere darik ọlaedo dị puku iri isii na otu (61,000),\f + \fr 2:69 \fr*\ft Maọbụ, \ft*\fqa narị kilogram ise,\fqa*\f* maịna ọlaọcha dị puku ise (5,000)\f + \fr 2:69 \fr*\ft Maọbụ, \ft*\fqa ọlaọcha ruru puku kilogram atọ\fqa*\f* na onyinye uwe ndị nchụaja, otu narị (100). \p \v 70 Ndị nchụaja, ndị Livayị, ndị ọbụ abụ, ndị na-eche ọnụ ụzọ ama, na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, tinyere ụfọdụ ndị mmadụ ọzọkwa, ha na ndị Izrel niile fọdụrụ gara biri nʼobodo nke aka ha. \c 3 \s1 Mwugharị ebe ịchụ aja \p \v 1 Mgbe o ruru ọnwa asaa nʼafọ, ndị Izrel nọkwa nʼobodo ha niile, ndị mmadụ zukọtara nʼotu na Jerusalem. \v 2 Mgbe ahụ, Jeshua, nwa Jozadak na ndị nchụaja ndị ọzọ, na Zerubabel nwa Shealtiel na ndị na-enyere ya aka malitere iwugharị ebe ịchụ aja Chineke Izrel maka ịchụ aja nsure ọkụ nʼelu ya dịka Mosis onye nke Chineke si nye nʼiwu. \v 3 Nʼagbanyeghị oke egwu maka ndị niile gbara ha gburugburu, ha gara nʼihu wughachikwa ebe ịchụ aja ahụ na ntọala ya chụọkwa aja nʼelu ya nye \nd Onyenwe anyị\nd*, bụ aja nsure ọkụ nke ụtụtụ na nke uhuruchi. \v 4 Ha mekwara mmemme ụlọ Ikwu dịka e dere ya nʼiwu Mosis, chụọkwa aja nsure ọkụ dị iche iche nʼụbọchị niile nke mmemme ahụ. \v 5 Mgbe ihe ndị a gasịrị, ha chụrụ aja nsure ọkụ nke a na-achụ mgbe niile, na nke aja maka ọnwa ọhụrụ, na aja ndị ọzọ maka mmemme ndị ọzọ dị nsọ a kara aka nke \nd Onyenwe anyị\nd*. Ha chụkwara aja onyinye nke ha ji nye \nd Onyenwe anyị\nd* onyinye afọ ofufu. \v 6 Ndị nchụaja bidoro ịchụ aja nsure ọkụ nye \nd Onyenwe anyị\nd* nʼabalị mbụ nke ọnwa nke asaa. Ọ bụ ezie na a tọbeghị ntọala ụlọnsọ ukwu \nd Onyenwe anyị\nd*. \s1 Mwugharị ụlọnsọ ukwu \p \v 7 Ha nyere ndị ọrụ na-edo nkume na ndị ọkpọ ǹtu ego, nyekwa ndị Saịdọn na ndị Taịa ihe oriri, na ihe ọṅụṅụ na mmanụ oliv, ka ha nwee ike isite nʼosimiri Lebanọn budata osisi sida ndị ahụ rute Jopa, dịka ikike Sairọs bụ eze Peshịa si kwadoo ya. \p \v 8 Nʼọnwa nke abụọ nke afọ abụọ site mgbe ha bịarutere nʼụlọ Chineke na Jerusalem. Mmadụ niile ahụ lọtara Juda so rụọ ọrụ. Zerubabel nwa Shealtiel, Jeshua nwa Jozadak na ndị fọdụrụ na ụmụnne ha, bụ ndị nchụaja na ndị Livayị, na ndị niile si na ndọta nʼagha lọta Jerusalem, malitere ịrụ ọrụ ahụ. Ha họpụtara ndị Livayị niile gbara iri afọ abụọ rigoo ka ha lekọta ihe banyere ọrụ ụlọ \nd Onyenwe anyị\nd*. \v 9 Jeshua na ụmụ ya ndị ikom, na ụmụnne ya, Kadmiel na ụmụ ya, ndị si nʼikwu Hodavaya, ha na ụmụ Henadad na ụmụ ha, na ụmụnna ha, ha niile bụ ndị Livayị, jikọtara aka na-elekọta ndị na-arụ ụlọnsọ ukwu Chineke ahụ. \p \v 10 Mgbe ndị na-ewu ụlọ tọrọ ntọala ụlọnsọ \nd Onyenwe anyị\nd* ahụ, ndị nchụaja ahụ niile yii uwe ha jide opi nʼaka. Otu a kwa ndị Livayị, ụmụ ndị ikom Asaf jikwa ogene ha na-eto \nd Onyenwe anyị\nd* dịka usoro iwu Devid, eze Izrel nyere ha si dị. \v 11 Ha ji abụ otuto na ekele bụkuo \nd Onyenwe anyị\nd* abụ sị: \q1 “Ọ dị mma, \q2 ịhụnanya ya nʼebe Izrel nọ na-adị ruo ebighị ebi.” \m Mmadụ niile jiri oke olu too \nd Onyenwe anyị\nd* nʼihi ntọala ụlọnsọ ukwu ahụ ha tọrọ. \v 12 Ma ụfọdụ ndị merela agadi nʼetiti ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị ndu nke ikwu dị iche iche, bụ ndị chetara ụlọnsọ ukwu ahụ Solomọn wuru, kwara akwa hie nne, mgbe ndị ọzọ nọ na-eti mkpu ọṅụ. \v 13 Ya mere, e sitere nʼebe dị nnọọ anya nụ ụzụ ọṅụ na ụda akwa ndị mmadụ ahụ. Ma o nweghị onye nwere ike ịkọwata nke bụ mkpu akwa maọbụ mkpu ọṅụ, nʼihi na ụzụ ahụ dị ukwuu. \c 4 \s1 Ndị iro \p \v 1 Mgbe ndị iro Juda na Benjamin\f + \fr 4:1 \fr*\ft Sameria bụ isi obodo alaeze ugwu, ndị agbụrụ Benjamin bụ ndị bi nʼobodo ugwu Izrel, ya mere ha ji bụrụ ndị Sameria.\ft*\f* nụrụ na ndị ahụ a dọtara nʼagha alọtala, nụkwa na ha na-ewugharị ụlọnsọ ukwu \nd Onyenwe anyị\nd*, Chineke Izrel, \v 2 ha bịakwutere Zerubabel na ndịisi ezinaụlọ sị ha, “Kwerenụ ka anyị nyere unu aka nʼọrụ iwu ụlọ a, nʼihi na anyị hụrụ Chineke unu nʼanya dịka unu onwe unu si hụ ya nʼanya. Lee na kemgbe Isahadon eze Asịrịa butere anyị nʼebe a, anyị alabeghị azụ ịchụrụ ya aja.” \p \v 3 Ma Zerubabel, na Jeshua na ndịisi ọzọ zara sị ha, “Unu enweghị oke ọbụla nʼọrụ iwuru Chineke anyị ụlọnsọ. Naanị ndị anyị ga-ewuru \nd Onyenwe anyị\nd*, Chineke Izrel ụlọ ukwu a dịka Sairọs eze Peshịa nyere nʼiwu.” \p \v 4 Ya mere ndị niile nọ ha gburugburu malitere ime ihe ga-ewetara ndị Juda ịda mba nʼobi, na ihe ga-eme ka ụjọ tụọ ha ịga nʼihu nʼọrụ iwu ụlọ ahụ. \v 5 Ha ji ngarị gota ụfọdụ ndịisi ka ha megide ha, mebikwaa atụmatụ ha niile nʼoge niile Sairọs bụ eze Peshịa, ruokwa nʼoge Daraiọs ghọrọ eze ọhụrụ Peshịa. \s1 Mmegide nʼoge ọchịchị eze Ahasuerọs na Ataksekses \p \v 6 Na mmalite ọchịchị Sekses, ha deere ya akwụkwọ ebubo megide ndị Juda na Jerusalem. \p \v 7 Nʼụbọchị niile ahụ Ataksekses bụ eze ndị Peshịa, ka Bishlam, na Mitredat, na Tabeel, na ndị otu ya fọdụrụ degaara Ataksekses akwụkwọ. E dere akwụkwọ ozi ahụ nʼodide akwụkwọ ndị Aramaik, a sụgharịkwara ya nʼasụsụ Aramaik. \p \v 8 Ndị ọzọ soro ha gbaa ajọ izu a bụ Rehum onyeisi ọchịchị, na Shimshai ode akwụkwọ. Ha deere Ataksekses akwụkwọ megide ndị Jerusalem sị ya: \pmo \v 9 “Akwụkwọ ozi a si nʼaka Rehum, onyeisi agha na Shimshai ode akwụkwọ, na ndị otu anyị ndị ọzọ, na ndị ikpe, na ndịisi obodo na-elekọta ndị ahụ niile si Tripolis, na Peshịa, na Erek, na Babilọn, na Susa nke dị nʼElam, \v 10 na ọtụtụ ndị ọzọ ahụ onye ukwu ahụ na onye a na-asọpụrụ bụ Ashobanipal\f + \fr 4:10 \fr*\ft Maọbụ, \ft*\fqa Osanapa, \fqa*\ft dịka e si sụgharịa ya nʼakwụkwọ nsọ ụfọdụ\ft*\f* si nʼala ha bupụ bute na Sameria, na obodo ndị ọzọ dị nʼọdịda anyanwụ Yufretis.” \p \v 11 Nke a bụ ihe ha dere nʼakwụkwọ ha zigaara \pmo Eze Ataksekses. \pmo Ọ bụ gị, eze ukwu Ataksekses, ka ndị ohu gị bi nʼakụkụ ọdịda anyanwụ Yufretis na-edetara akwụkwọ a. \pm \v 12 Nke a bụ ime ka ị mata na ndị Juu si Babilọn lọta Jerusalem ọhụrụ a ebidola iwughachi obodo ọjọọ nke nnupu isi ahụ. Ha ewuolarị mgbidi ya, tọkwaa ntọala ya. \pm \v 13 Anyị chọrọ ka o doo gị anya na ọ bụrụ na ha ewuchaa ya, ọ ga-abụ nsogbu nye alaeze gị, nʼihi na ndị Juu agaghị ekwekwa ịtụrụ gị ụtụ isi ha. \v 14 Ebe anyị na-asọpụrụ gị dịka nna anyị ukwu, anyị achọghị ka ihe ọjọọ mee nʼalaeze gị, ya mere anyị ji kpebie idere gị akwụkwọ a. \v 15 Anyị chọrọ ka i leba anya nʼakwụkwọ akụkọ nke mgbe ochie, ka ị chọpụta na ọ dịghị mgbe Jerusalem na-ejighị bụrụ obodo nnupu isi. Nʼezie, ọ bụ nʼihi nnupu isi a na nkwulu nke ha na-ekwulu ndị eze dị iche iche, ka e ji bibie ya na mbụ. \v 16 Anyị chọrọ ka ị mata na ọ bụrụ na e wuchaa mgbidi obodo a, ọ ga-esi ike ka akụkụ alaeze gị a, nke dị ruo nʼosimiri Yufretis, bụrụkwa nke gị ọzọ. \p \v 17 Eze ahụ si otu a saa akwụkwọ ahụ, \pmo Ọ sịrị ha, Rehum onyeisi ọchịchị, na Shimshai ode akwụkwọ, na ndị otu ha bi na Sameria ruo nʼọdịda anyanwụ nke osimiri Yufretis. \pmo Ndeewonụ. \pm \v 18 Akwụkwọ ozi ahụ unu zitere anyị, agụọla ma tapịakwaa ya nʼihu m. \v 19 Enyere m iwu ka e nyochaa chọpụta, e mere nyochaa, a chọpụtakwara ya nʼakwụkwọ na obodo a siterị nʼoge gara aga bụ obodo na-ebuli onwe ya megide ọtụtụ ndị eze,\f + \fr 4:19 \fr*\ft Ebe a na-arụtụ aka na nsogbu, na nnupu isi dịrịị nʼoge ọchịchị eze Hezekaya, Jehoiakim nakwa Zedekaya, megide ọchịchị ike nke ndị iro ha na-achị ha. \+xt 2Ez 18; 19; 2Ez 24:20; 2Ih 36:13.\+xt*\ft*\f* bụrụkwa ebe na-akpali nnupu isi na okwu na-eweta ọgbaaghara. \v 20 Jerusalem e nweela ụfọdụ ndị eze nke chịrị nʼIzrel, ndị dị ike a maara aha ha, ndị alaeze ha gbasara rute nʼosimiri Yufretis, ndị a na-atụkwara ụtụ dị iche iche. \v 21 Ugbu a, nye iwu ka ndị ikom ndị ahụ kwụsị ọrụ, ka a ghara iwuzi obodo a tutu ruo mgbe m ga-enye iwu. \v 22 Lezienụ anya ka unu ghara i lepụrụ okwu a anya. Gịnị ga-eme ka a hapụ ihe iyi egwu a ka ọ gaa nʼihu, ime ka ihe jọrọ alaeze a njọ karịa? \p \v 23 Ngwangwa a gụrụ akwụkwọ ozi si nʼaka eze Ataksekses, nye Rehum na Shimshai bụ ode akwụkwọ, na ndị otu ha, ha mere ọsịịsọ gakwuru ndị Juu na Jerusalem jiri ike kwagide ha ka ha kwụsị ịrụ ọrụ ahụ. \b \p \v 24 Ya mere, ha kwụsịrị ịrụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu Chineke na Jerusalem tutu ruo nʼafọ abụọ nke ọchịchị Daraiọs eze Peshịa. \c 5 \s1 Akwụkwọ ozi Tatenai dere \p \v 1 Ugbu a, ndị amụma, bụ Hegai, na Zekaraya nwa Ido buru amụma nye ndị Juu nọ na Juda nakwa Jerusalem. Ọ bụ nʼaha Chineke nke Izrel, onye na-achị ha ka ha buru amụma ahụ. \v 2 Mgbe ahụ, Zerubabel nwa Shealtiel, na Jeshua nwa Jozadak malitekwara iwu ụlọnsọ Chineke nʼJerusalem. Ndị amụma Chineke ahụ nọnyeere ha na-enyekwara ha aka. \p \v 3 Ma Tatenai, onye na-achị mba niile dị nʼọdịda anyanwụ Yufretis, na Sheta Bozenai, na ndị enyi ha, gara Jerusalem jụọ ndị Juu sị; “Onye nyere unu ike ibido iwuzi ụlọnsọ a na mgbidi Jerusalem?” \v 4 Ha jụkwara ha ajụjụ sị: “Gịnị bụ aha ndị na-arụ ụlọ a?” \v 5 Ma anya Chineke ha dịkwasịrị nʼahụ ndị okenye ndị Juu, ha akwụsịghị ha ọrụ ruo mgbe akwụkwọ ozi ruru Daraiọs, na mgbe ọsịsa ya bịara site nʼakwụkwọ ozi. \p \v 6 Nke a bụ akwụkwọ ozi Tatenai, onye na-achị ala dị nʼọdịda anyanwụ Yufretis, na Sheta Bozenai, na ndịisi ọzọ degara eze Daraiọs: \v 7 Ha zigara ya akwụkwọ ozi, nke e si otu a dee, \pmo Daraiọs bụ eze nwe akwụkwọ a, \pmo Anyị ekelee gị. \pm \v 8 Ọ dị mma ka eze mata na anyị jeruru mpaghara ala Juda, nʼebe ahụ ụlọnsọ ukwu Chineke dị. Anyị chọpụtara na ndị ahụ ji nkume a wara awa na-ewu ya, na-edokwa osisi na-elu mgbidi ya. Ọrụ ahụ na-agakwa nʼihu nke ọma na-esepụghị aka nʼokpuru nlekọta ha. \pm \v 9 Anyị jụrụ ndị okenye ajụjụ sị: Onye nyere unu ikike ibido iwuzi ụlọnsọ a na mgbidi Jerusalem? \v 10 Anyị jụkwara ha aha ha, ka anyị si otu a mee ka ị mata aha ndị ndu ha. \pm \v 11 Ma nke a bụ ihe ha zaghachiri anyị: \b \pm “Anyị onwe anyị bụ ndị ohu Chineke nke eluigwe na ụwa. Anyị na-ewugharị ụlọnsọ nke otu eze ukwu ndị Izrel wuru nʼoge gara aga. \v 12 Ma nʼihi na nna nna anyị ha mere ka iwe wee Chineke nke eluigwe, o weere ha nyefee nʼaka Nebukadneza, onye Kaldịa, bụ eze Babilọn, onye bibiri ụlọnsọ a ma dọrọ ndị bi nʼala ahụ nʼagha laa Babilọn. \pm \v 13 “Ma otu ọ dị, nʼafọ mbụ nke ọchịchị Sairọs, eze Babilọn, eze Sairọs nyere iwu ka e wugharịa ụlọnsọ Chineke a. \v 14 O sikwa nʼụlọnsọ dị na Babilọn wepụta ngwongwo ọlaọcha na ọlaedo si nʼụlọnsọ Chineke nke Nebukadneza si nʼụlọnsọ Chineke dị na Jerusalem bupụ bulaa nʼụlọnsọ dị na Babilọn. Mgbe ahụ eze Sairọs nyefere ha nʼaka otu nwoke a na-akpọ Sheshbaza, onye ọ họpụtara dịka gọvanọ. \v 15 Ọ gwara ya sị, ‘buru ngwongwo ndị a bulaa ha nʼụlọnsọ dị na Jerusalem, wugharịakwa ụlọnsọ Chineke nʼọnọdụ ya mbụ.’ \pm \v 16 “Ya mere, ọ bụ Sheshbaza a bịara tọọ ntọala ụlọnsọ dị na Jerusalem. Sitekwa nʼoge ahụ ruo ugbu a, ha nọ na-arụ ya ma ha arụchabeghị ya.” \b \pm \v 17 Ugbu a, ọ bụrụ na ọ dị eze mma nʼobi, ya nye iwu ka e nyochaa nʼụlọ a na-echebe akwụkwọ ochie nke ndị eze Babilọn, ịchọpụta maọbụ eziokwu na eze Sairọs nyere iwu dị otu a iwugharị ụlọnsọ Chineke dị na Jerusalem. Ka eze gwakwa anyị ihe bụ mkpebi ya banyere okwu a. \c 6 \s1 Iwu Daraiọs \p \v 1 Ya mere, Daraiọs nyere iwu ka a chọpụta nʼụlọ a na-echebe akwụkwọ ochie nke ndị Babilọn ma ọ dị akwụkwọ ọbụla dị otu ahụ. \v 2 Emesịa, a chọpụtara otu akwụkwọ nʼụlọeze dị na Ekbatana nʼala Midia. Nke a bụ ihe e dere nʼime akwụkwọ ahụ: \pmo Akwụkwọ ozi eze; \pm \v 3 Nʼafọ mbụ nke Sairọs bụ eze, o nyere iwu banyere ụlọnsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem ebe ndị Juu na-efe Chineke. \b \pm A ga-ewughachi ụlọnsọ ukwu ahụ ka ọ bụrụ ebe ịchụ aja, ka a tọsiekwa ntọala ya ike. Ịdị elu ya ga-adị iri mita atọ, obosara ya ga-abụkwa otu ihe ahụ. \v 4 Ahịrị atọ nke oke nkume ka a ga-eji tọọ ntọala ya, tinyere otu ahịrị osisi. A ga-esi nʼụlọakụ eze Sairọs kwụọ ụgwọ ihe ndị a niile. \v 5 Ọzọkwa, a ga-ebughachikwa ngwongwo ọlaedo na ọlaọcha niile nke ụlọ Chineke, ndị Nebukadneza sitere nʼụlọnsọ ahụ dị nʼJerusalem buru gaa Babilọn, doghachikwa ha nʼụlọ Chineke. \b \pm \v 6 Mgbe a gụsịrị ya, Daraiọs zighachiri Tatenai onye na-achị Yufretis,\f + \fr 6:6 \fr*\ft Maọbụ, \ft*\fqa Ala ofe mmiri\fqa*\f* na Sheta Bozenai, na ndịisi ọzọ nọ nʼọdịda anyanwụ Yufretis ozi sị ha, Unu hapụ ha ka ha rụọ ọrụ ha. \v 7 Unu egbochila owuwu ụlọ Chineke ahụ. Kwerenụ ka onyeisi ndị Juu na ndị okenye Juu wughachi ụlọ Chineke a nʼebe e wuru ya na mbụ. \pm \v 8 Ọzọ, ana m enye iwu na nke a bụ ihe unu na-aghaghị imere ndị okenye, na ndị Juu niile na-ewugharị ụlọnsọ Chineke ahụ. \pm Ka unu site nʼụtụ isi a na-atụrụ m kwụọ ụgwọ e ji ewu ụlọ ahụ na-atụfughị oge ọbụla. \v 9 Unu nye ha ihe ọbụla dịkwa ha mkpa, ụmụ oke ehi na ebule, ụmụ atụrụ, ha ga-eji chụọrọ Chineke nke eluigwe aja. Nyekwanụ ha ọka wiiti, na mmanya, na nnu, na mmanụ oliv, dịka ndị nchụaja rịọrọ, bụ ndị nọ na Jerusalem, aghaghị inye ha ihe ndị a kwa ụbọchị niile na-esepụghị aka. \v 10 Ka ha nwee ike ịchụ ezi aja nye Chineke nke eluigwe, kpeekwaara mụ na ụmụ m ekpere. \pm \v 11 Ana m enye iwu na onye ọbụla ga-agbanwe okwu a, ka ehopụta osisi nʼụlọ ya jiri kwụgbuo ya. A ga-emekwa ụlọ ya ka ọ bụrụ ebe ikpofu ahịhịa. \v 12 Chineke ahụ, onye mere Jerusalem ebe obibi ya, ga-ebibi eze ọbụla maọbụ mba ọbụla gbanwere iwu a, maọbụ bibie ụlọnsọ ahụ ọzọ. \pm Ọ bụ Daraiọs na-enye iwu a. Ka onye ọbụla were ike ya niile debe ya. \s1 Ido ụlọnsọ ahụ nsọ \p \v 13 Ya mere, nʼihi iwu ahụ eze Daraiọs zitere, Tatenai, onyeisi ọchịchị nʼala ofe mmiri, na Sheta Bozenai, na ndị otu ha, mere ihe niile dịka ozi ahụ si dị na-atụfughị oge ọbụla. \v 14 Nʼihi ya, ndịisi Juu gara nʼihu nʼọrụ, ihe na-agakwara ha nke ọma site na nkwusa onye amụma, bụ Hegai, na Zekaraya, nwa Ido. Ha wuchara ụlọnsọ ahụ dịka iwu Chineke Izrel nyere si dị, nakwa dịka Sairọs, na Daraiọs, na Ataksekses, ndị eze Peshịa, nyekwara nʼiwu. \v 15 Ha wusiri ya nʼabalị nke atọ nʼọnwa isii (dị ka ọgụgụ afọ ndị Juu si dị) nʼafọ nke isii nke ọchịchị Daraiọs. \p \v 16 Ụmụ Izrel, bụ ndị nchụaja na ndị Livayị, na ndị fọdụrụ nʼime ndị e mere ka ha ga biri nʼala ọzọ, ji ọṅụ mee mmemme nke ido ụlọ nke Chineke ahụ nsọ na gbaghee ya. \v 17 Nʼihi ido ụlọ ahụ nsọ, ha ji oke ehi dị otu narị nʼọnụọgụgụ, na narị ebule abụọ, na narị atụrụ anọ chụọ aja, werekwa mkpi iri na abụọ chụọ aja mmehie nʼihi ndị Izrel niile, dịka ebo niile nke Izrel si dị. \v 18 Ha guzobere ndị nchụaja na nkewa ha, ndị Livayị nʼotu ha maka ije ozi nke Chineke na Jerusalem, dịka e dere ya nʼakwụkwọ iwu Mosis. \s1 Mmemme Ngabiga \p \v 19 Ndị ahụ emere ka ha gaa biri nʼala ọzọ, mere Mmemme Ngabiga nʼabalị iri na anọ nke ọnwa mbụ. \v 20 Ndị nchụaja na ndị Livayị edoola onwe ha ọcha, ha niile dịkwa ọcha. Ndị Livayị nʼonwe ha gburu ọtụtụ atụrụ Mmemme Ngabiga maka ndị nchụaja, na ndị Livayị ndị ọzọ, na ndị ahụ niile lọtara alọta site na mba ọzọ. \v 21 Ya mere, ndị Izrel niile bụ ndị ahụ lọtara site nʼebe e mere ka ha gaa biri riri ihe ahụ, ha na ndị ahụ niile kewapụrụ onwe ha juu ibi ajọọ ndụ nke ndị mba ọzọ bi nʼala ahụ na-ebi, nʼihi ịchọ \nd Onyenwe anyị\nd*, Chineke nke Izrel. \v 22 Ha sokwa mee mmemme achịcha na-ekoghị eko, nke ha mere ụbọchị asaa. Oke ọṅụ jupụtara nʼala Izrel niile nʼihi na \nd Onyenwe anyị\nd* mere ka eze Asịrịa nwee obiọma nʼebe Izrel nọ, nyere ha aka iwugharị ụlọnsọ ukwu Chineke, onye bụ Chineke Izrel. \c 7 \s1 Ezra abịaruo Jerusalem \p \v 1 Mgbe nke a gasịrị, nʼoge ọchịchị Ataksekses bụ eze Peshịa. Ezra bụ nwa Seraya nwa Azaraya, Azaraya nwa Hilkaya, \v 2 bụ nwa Shalum, nwa Zadọk, nwa Ahitub, \v 3 nwa Amaraya, nwa Azaraya, nwa Meraiot, \v 4 Meraiot nwa Zerahaya; Zerahaya nwa Uzi, Uzi nwa Buki; \v 5 Buki nwa Abishua, Abishua nwa Finehaz; Finehaz nwa Elieza, Elieza nwa Erọn onyeisi nchụaja. \v 6 Ezra a si Babilọn bịarute. Ọ bụ onye ọka nʼihe gbasara iwu ahụ \nd Onyenwe anyị\nd*, Chineke Izrel nyere Mosis. Eze nyere ya ihe niile nke ọ rịọrọ, nʼihi na aka \nd Onyenwe anyị\nd* Chineke ya dịkwasịrị nʼahụ ya. \v 7 Ụfọdụ ndị Izrel, ndị nchụaja, ndị Livayị, ndị ọbụ abụ, ndị nche na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, soro ya jee Jerusalem nʼafọ asaa nke ọchịchị eze Ataksekses. \p \v 8 Ezra bịaruru Jerusalem nʼọnwa nke ise, nke afọ asaa nke ọchịchị eze. \v 9 Ọ hapụrụ Babilọn nʼabalị mbụ nke ọnwa mbụ, rute Jerusalem nʼabalị mbụ nke ọnwa ise nʼihi na Chineke nọnyeere ya. \v 10 Nke a mere nʼihi na Ezra kpebiri nʼobi ya ịmụ, na idebe iwu \nd Onyenwe anyị\nd*, na ịbụ onye ozizi nke okwu Chineke nye ụmụ Izrel. \s1 Akwụkwọ ozi Ataksekses degara Ezra \p \v 11 Nke a bụ ndepụta akwụkwọ ozi eze, bụ Ataksekses degaara Ezra onye nchụaja, na onye ozizi, na onye ọka nʼihe gbasara iwu na ụkpụrụ nke \nd Onyenwe anyị\nd* nyere Izrel: \pmo \v 12 Ataksekses, eze na-achị ndị eze ọzọ, \pmo na-edegara Ezra akwụkwọ, bụ onye nchụaja, bụrụkwa onye nkuzi okwu Chineke nke eluigwe. \pmo Ndeewo! \pm \v 13 Ugbu a, ana m enye iwu ka onye Izrel ọbụla bi nʼalaeze m, ma ndị nchụaja, na ndị Livayị, ndị wepụtara onwe ha ị soro gị gaa Jerusalem, ha nwere ike ịga. \v 14 Eze na mmadụ asaa ndị na-adụ ya ọdụ na-eziga gị Juda na Jerusalem ka ị gaa leba anya nʼiwu Chineke nke dị gị nʼaka. \v 15 Ọzọkwa, ịga e were onyinye ọlaedo na ọlaọcha ndị a eze na ndị ndụmọdụ ya ji afọ ofufu nye Chineke nke Izrel, onye ebe obibi ya dị na Jerusalem. \v 16 Tinyere ọlaedo na ọlaọcha nke i nwere ike ịnata nʼala ahụ niile nʼakụkụ niile nke Babilọn, tinyekwara onyinye ihuọma si nʼaka ndị mmadụ, na ndị nchụaja niile, maka ụlọnsọ ukwu Chineke ha dị na Jerusalem. \v 17 Ị ga-eji ego niile ndị a zụọ oke ehi, na ebule, na atụrụ, na onyinye mkpụrụ ọka, na onyinye ihe ọṅụṅụ, e ji achụ aja nʼebe ịchụ aja nke ụlọnsọ Chineke dị na Jerusalem. \pm \v 18 Ọ bụrụ na ego amapụta nʼime ya, gị na ụmụnne gị ga-eji ya mee ihe unu maara bụ uche Chineke unu. \v 19 Ngwongwo niile e bunyere gị maka ije ozi nʼụlọnsọ Chineke, buru ha buruo nʼihu Chineke nke Jerusalem. \v 20 Ma ihe ndị ọzọ nke fọdụrụ nʼihi ụlọnsọ Chineke gị, nke kwesiri na i mere, ị nwere ike site nʼụlọakụ eze mee ha. \pm \v 21 Mụ, bụ Ataksekses, na-eziga iwu a nye ndị na-elekọta ego nʼọdịda anyanwụ osimiri Yufretis sị ha, ihe ọbụla Ezra, onye nchụaja, na onye nkuzi okwu Chineke nke eluigwe chọrọ site nʼaka unu, unu nye ya. \v 22 Ọ bụladị ruo ọlaọcha dị otu narị talenti, ya na narị akpa ọka wiiti ise, na narị galọọnụ mmanya vaịnị isii, na narị efa\f + \fr 7:22 \fr*\ft Nke a bụ narị galọọnụ isii\ft*\f* nke mmanụ oliv na nnu nʼọtụtụ ọbụla, dịka ọ chọrọ ya. \v 23 Ihe ọbụla ọzọ, nke Chineke nke eluigwe chọrọ, ka e mee ha nʼụzọ kwesiri nye maka owuwu ụlọnsọ Chineke nke eluigwe. Nʼihi gịnị ka iwe Chineke ga-eji dakwasị eze na ụmụ ya ndị ikom? \v 24 Ana m enyekwa iwu na ndị nchụaja niile, ndị Livayị niile, ndị ọbụ abụ niile, ndị nche niile, ndị ozi ụlọnsọ niile, na ndị ọzọ niile na-arụrụ Chineke ọrụ, agaghị atụ ụtụ ọbụla. \pm \v 25 “Ugbu a, Ezra, ị ga-eji amamihe Chineke gị nyere gị họpụta ndị ikpe, na ndịisi, ndị ga-achị obodo niile dị nʼọdịda anyanwụ nke osimiri Yufretis. Ọ bụrụ na ha amazighị iwu Chineke nke ọma, ị ga-akụziri ha. \v 26 Ahụhụ ga-adịrị onye ọbụla jụrụ idebe iwu Chineke, na iwu eze, ga-abụ ọnwụ, maọbụ nchụpụ site nʼala ya gaa mba ọzọ, maọbụ ịnakọrọ ya ihe niile o nwere, maọbụ ịtụba ya nʼụlọ mkpọrọ.”\f + \fr 7:26 \fr*\ft E dere akwụkwọ ozi a, nke sitere nʼamaokwu nke iri na abụọ ruo nke iri abụọ nʼisii nʼasụsụ Aramaik (ndị Siria) nke bụ usoro asụsụ mba na mba ji emerikọta ihe nʼoge ahụ.\ft*\f* \p \v 27 Otuto dịrị \nd Onyenwe anyị\nd* Chineke nna nna anyị ha, onye mere ka eze kpebie ime ka ụlọnsọ \nd Onyenwe anyị\nd* dị na Jerusalem dị mma ile anya. \v 28 Keleekwa Chineke onye nyere m ihuọma nʼihu ndị ndụmọdụ ya, na nʼihu ụmụ eze, bụ ndịisi ọchịchị dị ike. Nʼihi na aka \nd Onyenwe anyị\nd* Chineke m nọnyeere m. Eji m obi ike chịkọta ndịisi site nʼIzrel ka ha soro m gaa. \c 8 \s1 Ndịisi ezinaụlọ niile so Ezra lọta \li4 \v 1 Ndị a bụ usoro ọmụmụ ndịisi ezinaụlọ ahụ niile sooro m site na Babilọn laghachi mgbe Ataksekses bụ eze: \b \li1 \v 2 ndị ikwu Finehaz, \li2 Geshọm; \li1 ndị ikwu Itama, \li2 Daniel; \li1 ndị ikwu Devid, \li2 Hatush \v 3 ndị ikwu Shekanaya; \li1 ndị ikwu Parosh, \li2 Zekaraya na narị mmadụ na iri ise (150) ndị so ya denye aha ha nʼakwụkwọ. \li1 \v 4 Ndị ikwu Pahat-Moab, \li2 Eliehoenai nwa Zerahaya dị narị mmadụ abụọ (200), \li1 \v 5 ndị ikwu Zatu, \li2 Shekanaya nwa Jahaziel na narị mmadụ atọ (300) so ya. \li1 \v 6 Ndị ikwu Adin, \li2 Ebed nwa Jonatan na iri mmadụ ise (50) so ya. \li1 \v 7 Ndị sitere nʼikwu Elam, \li2 Jeshaya nwa Atalaya, na iri ndị ikom asaa (70), \li1 \v 8 ndị sitere nʼikwu Shefataya, \li2 Zebadaya nwa Maikel, na iri ndị ikom asatọ (80). \li1 \v 9 Ndị sitere nʼikwu Joab, \li2 Ọbadaya nwa Jehiel na narị ndị ikom abụọ na iri na asatọ (218), \li1 \v 10 ndị sitere nʼikwu Bani, \li2 Shelomit nwa Josifaya na narị ndị ikom na iri isii (160). \li1 \v 11 Ndị sitere nʼikwu Bebai; \li2 Zekaraya nwa Bebai na ndị ikom iri abụọ na asatọ (28), \li1 \v 12 ndị sitere nʼikwu Azgad, \li2 Johanan nwa Hakatan na narị ndị ikom na iri (110). \li1 \v 13 Ndị sitere nʼikwu Adonikam, \li2 ndị ikpeazụ, ndị aha ha bụ Elifelet, na Jeuel na Shemaya na iri ndị ikom isii (60) bụ ndị so ha, \li1 \v 14 ndị sitere nʼikwu Bigvai, \li2 Utai na Zakua na iri ndị ikom asaa (70) bụ ndị so ha. \s1 Nlọrute na Jerusalem \p \v 15 Akpọkọtara m ha nʼakụkụ osimiri na-erubanye nʼAhava, anyị nọrọ nʼebe ahụ ụbọchị atọ. Mgbe m leruru anya nʼetiti ndị mmadụ zukọrọnụ, ha na ndị nchụaja bịara, a chọpụtara m na o nweghị ọ bụladị otu onye Livayị nọ nʼebe ahụ. \v 16 Mgbe ahụ, ezigara m ozi kpọọ Elieza, Ariel, Shemaya, Elnatan, Jarib, Elnatan, Netan, Zekaraya na Meshulam, ndị bụ ndịisi. Ezikwara m ozi kpọọ Joiarib na Elnatan, bụ ndị maara ihe. \v 17 Enyere m ha iwu ka ha gakwuru Ido, onyendu nọ na Kasifia. Agwara m ha ihe ha ga-agwa Ido na ndị Livayị ibe ya, bụ ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ dị na Kasifia, ka ha zite ndị ga-eje ozi ka ha bịakwute anyị maka ụlọnsọ Chineke. \v 18 Chineke gosikwara anyị obiọma zitere anyị nwoke a na-akpọ Sherebaya na ụmụ ya, na ụmụnne ya, ndị ọnụọgụgụ ha dị iri na asatọ (18). Sherebaya bụ nwa Mahali, nwa Livayị nwa Izrel, bụrụkwa nwoke nwere ezi uche. \v 19 Chineke sitere nʼikwu Merari zite Hashabaya, na Jeshaya, tinyere ụmụnne ya na ụmụ ha ndị ikom, ndị ọnụọgụgụ ha dị iri ndị ikom abụọ (20). \v 20 Ha zitekwara narị abụọ na iri abụọ (220) site na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ. Otu nke Devid na ndịisi ya họpụtara hiwee, maka inyere ndị Livayị aka. E deturu aha ha niile nʼotu nʼotu. \p \v 21 Nʼebe ahụ, ka m nọ kpọsaa obubu ọnụ nʼakụkụ osimiri Ahava, nʼihi iweda onwe anyị ala nʼihu Chineke anyị, na ịrịọ ya ka o duo anyị, ụmụ anyị na akụ anyị niile, nʼụzọ ziri ezi nʼije anyị, ma nọnyekwara anyị. \v 22 Nʼihi na ihere ekweghị m rịọ eze ka o dunyere anyị ndị agha, na ndị na-agba ịnyịnya ga-edu anyị, ichebe anyị nʼụzọ, site nʼaka ndị iro. Nʼihi na anyị agwalarị eze na Chineke, onye anyị na-efe, na-echebe ndị niile na-efe ya; gwakwa ya na oke iwe ya na-adakwasị ndị niile gbakụtara ya azụ. \v 23 Ya mere, anyị buru ọnụ, kpee ekpere, rịọ Chineke ka o chebe anyị. O chebekwara anyị. \p \v 24 Ahọpụtara m ndị nchụaja iri na abụọ ndị a: Sherebaya, Hashabaya na mmadụ iri ndị ọzọ bụ ụmụnna ha ka ha hụ maka ọlaọcha, na ọlaedo, na efere ọlaedo ahụ, na ihe ndị ọzọ ahụ eze na ndị na-adụ ya ọdụ, na ndịisi ọchịchị ya, na ụmụ Izrel niile nyere maka ụlọnsọ ukwu Chineke anyị. \v 25 Eji m ihe ọtụtụ tụọ onyinye ọlaọcha na ọlaedo na ihe ndị ọzọ eze, na ndị ndụmọdụ ya, na ndịisi ozi ya, na ndị Izrel nyere maka ụlọnsọ ukwu Chineke. \v 26 E jiri m ihe ọtụtụ tụnye ha ọlaọcha dị narị talenti isii na iri ise (ya bụ 650), na ngwongwo ọlaọcha dị otu narị talenti (ya bụ 100), na ọlaedo dị otu narị talenti (ya bụ 100). \v 27 Iri efere ọlaedo abụọ (20) nke ọnụahịa ya bụ puku darik (1,000),\f + \fr 8:27 \fr*\ft Ya bụ kilogram asatọ na ụma anọ\ft*\f* tinyere efere bronz abụọ e hichaziri nke ọma, nke dị oke ọnụahịa dị ka efere ọlaedo. \p \v 28 Emesịa, agwara m ha okwu sị ha, “Lee, unu onwe unu na ihe ndị a niile bụ ihe dị nsọ nye \nd Onyenwe anyị\nd*. Ọlaọcha na ọlaedo ndị a bụkwa onyinye afọ ofufu e nyere \nd Onyenwe anyị\nd* Chineke nna nna unu ha. \v 29 Chenụ ha nche, debekwa ha nke ọma, tupu ruo mgbe unu ga-atụ ha nʼihu ndịisi nchụaja, na ndịisi Livayị, na ndịisi ụlọ nke Izrel nʼime Jerusalem, nʼime ụlọakụ nke ụlọ \nd Onyenwe anyị\nd*.” \v 30 Ya mere, ndị nchụaja na ndị Livayị kwenyere ibu ọlaọcha na ọlaedo, na ngwongwo ihe nsọ ndị ahụ, buga ha nʼụlọnsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem. \p \v 31 Anyị hapụrụ osimiri Ahava nʼụbọchị nke iri na abụọ nke ọnwa mbụ, chee ihu anyị ịga Jerusalem. Chineke nọnyekwaara anyị, dọpụta anyị site nʼaka ndị iro ọbụla, na nʼaka ndị ohi. \v 32 Nʼikpeazụ, anyị rutere Jerusalem nʼudo, zukwaa ike ụbọchị atọ. \p \v 33 Nʼụbọchị nke anọ, site nʼoge anyị ruru, e jiri ihe ọtụtụ tụọkwa ọlaọcha na ọlaedo ahụ, ha na ngwongwo ihe nsọ ndị ọzọ ahụ. E mere nke a nʼụlọnsọ ukwu Chineke. Ndị tụrụ ha bụ Meremot nwa Ụraya onye nchụaja, na Elieza nwa Finehaz. Jozabad nwa Jeshua, na Noadaya nwa Binui, ndị Livayị, sokwa tụọ ha. \v 34 Ihe niile zuru ezu dịka ịdị arọ ha si dị. E dekwara ọnụọgụgụ ihe a tụpụtara nʼakwụkwọ nʼoge ahụ. \p \v 35 Emesịa, onye ọbụla nʼime anyị si esi lọta chụụrụ Chineke Izrel aja nsure ọkụ. E ji oke ehi iri na abụọ chụọ aja maka ebo Izrel niile, ya na iri ebule itoolu na isii, na iri ụmụ ebule asaa na asaa. Ma e ji mkpi iri na abụọ chụọ aja mmehie. E jichakwa ha niile chụọ aja nsure ọkụ nye \nd Onyenwe anyị\nd*. \v 36 E nyere ndịisi ọrụ eze niile, na ndịisi ọchịchị\f + \fr 8:36 \fr*\ft Ndịisi ọrụ eze bụ ndị ọchịchị nke mpaghara dị iche iche nke alaeze ahụ dị nʼaka. Ndịisi ọchịchị ọzọ niile na-arụ nʼokpuru ha.\ft*\f* niile dị nʼofe ọdịda anyanwụ osimiri Yufretis akwụkwọ iwu ahụ eze nyere. Ndịisi a nyekwara aka nʼọrụ iwughachi ụlọnsọ Chineke ahụ. \c 9 \s1 Ekpere Ezra banyere ịlụrịta di na nwunye \p \v 1 Mgbe e mesịrị ihe ndị a, ndịisi bịakwutere m sị, “Ndị Izrel na ndị nchụaja, na ndị Livayị, ekewapụghị onwe ha site nʼetiti ndị agbataobi ha, na omume arụ ha niile,\f + \fr 9:1 \fr*\ft Omume rụrụ arụ, ọ bụ mgbe ọnwa itoolu gasịrị site na nʼoge Ezra lọghachiri Jerusalem ka ha mere ihe ndị a megidere iwu Chineke nyere ha nʼakwụkwọ. \+xt Dit 7:3-4; Nkp 3:5-6.\+xt*\ft*\f* dịka nke ndị Kenan, na ndị Het; na ndị Periz, na ndị Jebus, na ndị Amọn, na ndị Moab, na ndị Ijipt, na ndị Amọrait. \v 2 Ha alụtarala onwe ha nwunye site nʼụmụ ndị inyom mba ọzọ ndị a, lụtakwara ụmụ ha ndị ikom. Ha agwakọtala mkpụrụ nsọ na ndị dị iche iche nọ ha gburugburu. Ọ bụ ndị ndu na ndịisi ọchịchị ha bụ ndị butere ụzọ nʼibi ndụ ekwesighị ntụkwasị obi a.” \p \v 3 Ma mgbe m nụrụ nke a, adọwara m uwe ahụ m na uwe mwụda m,\f + \fr 9:3 \fr*\ft ịdọwa uwe bụ otu ihe na-egosi ọnọdụ iru ụjụ. E depụtara nke a nʼakwụkwọ \+xt Lev 10:6; Neh 13:25; 10:29-30.\+xt*\ft*\f* dọpụkwa ụfọdụ agịrị isi nke isi m, na ajị afụọnụ m, nọdụkwa ala nʼọnọdụ mgbagwoju anya. \v 4 Mgbe ahụ, ndị niile mara jijiji nʼokwu Chineke nke Izrel, gbakọtara m gburugburu nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi nke ndị ahụ e mere ka ha jee biri na mba ọzọ lọtaranụ. Mụ onwe m nọkwa nʼọnọdụ mgbagwoju anya ruo oge ịchụ aja nsure ọkụ nke anyasị. \p \v 5 Nʼikpeazụ, nʼoge aja uhuruchi, esitere m nʼiweda onwe m ala bilie, eji m uwe na uwe mwụda dọkara adọka daa nʼala nʼikpere m, chilie aka m abụọ elu, tikuo \nd Onyenwe anyị\nd* Chineke m \v 6 nʼekpere sị, \pm “Ihere na-eme m, Chineke m, amaghị otu m ga-esi lelie anya m lekwasị gị nʼihu, nʼihi na mmehie anyị babigara ụba oke, ikpe ọmụma dị na-eche anyị dịkwa ukwuu, nʼezie o ruola eluigwe. \v 7 Site nʼụbọchị nna nna anyị ha ruo taa, ikpe ọmụma anyị adịla ukwuu. Nʼihi mmehie anyị, anyị na ndị eze anyị, na ndị nchụaja anyị ka enyefere nʼaka mma agha, na ndọta nʼagha, na ịpụnara anyị ihe nʼike na nweda nʼala nʼaka ndị eze ala mba ọzọ, dịka ọ dị taa. \pm \v 8 “Ma ugbu a, na nwa oge nta a, gị bụ \nd Onyenwe anyị\nd* Chineke anyị egosila anyị amara, mee ka ole na ole fọdụrụ anyị. O nyeela anyị ọnọdụ siri ike nʼime ebe nsọ ya. Chineke anyị na-enye anya anyị ìhè, mee ka anyị kurutu ume ndụ nʼoge a site nʼọnọdụ ịbụ ohu anyị. \v 9 Nʼihi na ndị ohu\f + \fr 9:9 \fr*\fk Ndị ohu \fk*\ft Nʼoge a ndị Juu nọọ nʼokpuru ọchịchị alaeze ọzọ. \+xt Neh 9:36; Dit 28:47-48\+xt*\ft*\f* ka anyị bụ, ma nʼihi obiọma na obi ebere gị, ị gbakụtaghị anyị azụ nʼọnọdụ ịbụ ohu anyị. Kama i mere ka ndị eze Peshịa gosi anyị obi ebere. Ha enyekwala anyị ndụ ọhụrụ, nke anyị ga-eji nwee ike wughachi ụlọnsọ Chineke anyị, ma wuziekwa ebe ya niile dakpọrọ adakpọ. Ọzọkwa, o nyekwala anyị ebe ize ndụ site na mwugharị nke mgbidi Juda na Jerusalem. \pm \v 10 “Ugbu a, Chineke anyị, gịnịkwa ka anyị nwere ikwu banyere ihe ndị a niile mere? Lee na anyị ahapụla gị ọzọ, hapụkwa ịgbaso iwu gị, \v 11 nke i ji dọọ anyị aka na ntị site nʼọnụ ndị amụma, bụ ndị ohu gị. Nʼihi na i si nʼọnụ ha kwuo sị, ‘Ala ahụ unu na-abanye inweta bụ ala nke ndị bi nʼime ya mere ka ọ rụọ arụ. Nʼihi na ndị bi nʼime ya esitela nʼomume ọjọọ ha mee ka akụkụ ala ahụ niile rụọ arụ. \v 12 Ya mere, unu enyekwala ụmụ ha ndị ikom ụmụ unu ndị inyom ka ha lụrụ, maọbụ kwenye ka ụmụ unu ndị ikom lụọ ụmụ ha ndị inyom. Unu achọkwala udo nke ọdịmma ọbụla nʼetiti unu na ha nʼoge ọbụla, ka unu dị ike, rie ezi ihe nke ala ahụ, hapụkwara ya ụmụ unu dịka ihe nketa ha ruo mgbe ebighị ebi.’ \pm \v 13 “Ma ihe niile dakwasịrị anyị bụ maka ajọ omume anyị, nʼihi ikpe ọmụma dị ukwuu anyị. Ma lee, Chineke anyị ataghị anyị ahụhụ dịka ịdị ukwuu nke mmehie anyị si dị, kama, o mekwara ka ole na ole nʼime anyị fọdụ. \v 14 Ma anyị ọ ga-emebi iwu gị ọzọ, site nʼịlụ ndị a rụrụ arụ nʼomume ha? Ị gaghị eweso anyị iwe ruo na ị ga-ebibi anyị kpamkpam, na-afọdụghị otu onye? \v 15 Ma gị, \nd Onyenwe anyị\nd*, Chineke Izrel, ị bụ onye ezi omume. Lee anyị ka anyị guzo nʼihu gị nʼọnọdụ ikpe ọmụma anyị, ọ bụ ezie na o nweghị onye ọbụla nʼime anyị kwesiri iguzo nʼihu gị nʼihi nke a.” \c 10 \s1 Nkwupụta mmehie \p \v 1 Mgbe Ezra na-ekpe ekpere, na-ekwupụta mmehie ndị a, na-akwa akwa, na-atụ onwe ya nʼala nʼihu ụlọ Chineke, igwe ndị Izrel dị ukwuu, bụ ndị nwoke, na nwanyị, na ụmụntakịrị gbara ya gburugburu soro ya na-akwa akwa dị ilu. \v 2 Mgbe ahụ, Shekanaya nwa Jehiel, onye agbụrụ Elam, sịrị Ezra, “Anyị emehiela megide Chineke anyị, nʼihi nʼịlụ ndị inyom mba ọzọ ndị gbara anyị gburugburu. Ma otu ọ dị, olileanya ka dịrị ndị Izrel. \v 3 Ugbu a ka anyị gbaa ndụ nʼihu Chineke anyị, izilaga ndị inyom ndị mba ọzọ ndị a na ụmụ ha dịka ndụmọdụ onyenwe m Ezra, na ndị na-atụ egwu iwu Chineke anyị si dị. Ka e mee ihe ndị a dịka iwu si dị. \v 4 Biko, bilie gwa anyị ụzọ anyị ga-esi dozie ihe niile mebiri emebi. Anyị ga-eme ihe i kwuru.” \p \v 5 Mgbe ahụ, Ezra biliri jụọ ndịisi ndị nchụaja na ndị Livayị, na Izrel niile, ma ha ga-eme ihe Shekanaya kwuru. Ha niile ṅụrụ iyi kwenye na ha ga-eme ya. \v 6 Mgbe ahụ, Ezra si nʼihu ụlọ Chineke pụọ banye nʼime ọnụụlọ Jehohanan, nwa Eliashib. Mgbe ọ nọ nʼebe ahụ, o righị nri ọbụla, ọ ṅụghị mmiri ọbụla, nʼihi na ọ nọgidere na-eru ụjụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi nke ndị si nʼebe a dọtara ha nʼagha lọta. \p \v 7 E zisara ozi na Juda na Jerusalem niile na a chọrọ ịhụ ndị niile si esi lọta na Jerusalem. \v 8 Ndịisi na ndị okenye kpebiri na onye ọbụla nke na-abịaghị nʼụbọchị atọ, dịka atụmatụ ha si dị, na a ga-anara onye ahụ akụ niile o nwere, kewapụkwa onye ahụ site na mkpọkọta ndị Izrel e mere ka ha gaa biri nʼala ọzọ. \b \p \v 9 Mgbe ụbọchị atọ ahụ zuru, ndị ikom Juda na Benjamin niile zukọrọ na Jerusalem. Nʼụbọchị nke iri abụọ nke ọnwa itoolu, mmadụ niile zukọrọ nọdụ nʼama dị nʼihu ụlọnsọ Chineke. Mmiri dị ukwuu zoro nʼụbọchị ahụ. Ụjọ tụkwara ndị ahụ niile zukọrọ nʼihi oke mmiri ozuzo ahụ na nʼihi okwu ahụ. \v 10 Mgbe ahụ Ezra onye nchụaja, biliri ọtọ, sị ha, “Unu emehiela, nʼihi na unu lụrụ ndị inyom mba ọzọ, si otu a tụkwasị ihe nʼikpe ọmụma dịrị Izrel. \v 11 Ugbu a, sọpụrụnụ \nd Onyenwe anyị\nd*, bụ Chineke nna nna unu ha, meekwanụ ihe bụ nzube ya. Kewapụnụ onwe unu site nʼebe ndị mba ọzọ nọ, nakwa ebe nwunye ndị unu si mba ọzọ lụta.” \p \v 12 Nzukọ niile ahụ zara nʼotu olu sị. “Okwu gị ziri ezi, Anyị aghaghị ime dịka i kwuru.” \v 13 Ma ha zakwara sị, “Nke a abụghị ihe anyị ga-eme nʼotu ụbọchị maọbụ nʼụbọchị abụọ, nʼihi na aka ọtụtụ mmadụ nʼime anyị dị na mmehie ahụ. Mmiri na-ezosikwa ike, anyị enwekwaghị ike ịnọgide ruo oge dị anya. \v 14 Ka ndịisi anyị guzobe mkpọkọta niile. Ka ndị niile nọ nʼobodo anyị ndị lụrụ nwanyị site na mba ọzọ bịa nʼoge a kara aka, ha na ndị okenye na ndị ikpe nke obodo ọbụla, ruo mgbe oke iwe Chineke banyere okwu a sitere nʼebe anyị nọ pụọ.” \v 15 Ma ndị na-ekweghị ka e mee ya otu a bụ naanị Jonatan nwa Asahel na Jazeia nwa Tikva, na Meshulam na Shabetai onye Livayị. \p \v 16 Ya mere, ndị ahụ niile si esi lọta, mere dịka mkpebi ahụ si dị. Ezra họpụtara ụfọdụ ndị ikom, ndị bụ ndịisi ezinaụlọ, e si nʼezinaụlọ ọbụla họpụta otu onye. E dekwara aha ndị niile a họpụtara nʼakwụkwọ. Ya mere, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa iri, ndị a malitere inyocha okwu ndị a. \v 17 Mgbe ọnwa atọ gasịrị, ya bụ, nʼabalị mbụ nke ọnwa mbụ nʼafọ, ha rụchara ọrụ banyere ndị ikom lụrụ ndị inyom mba ọzọ. \s1 Ndị lụrụ ndị mba ọzọ \li4 \v 18 A chọpụtara nʼetiti ụmụ ndị nchụaja, na ndị a lụrụ ndị inyom si na mba ọzọ. \li1 Ndị si nʼikwu Jeshua nwa Jozadak na ụmụnne ya bụ, \li2 Maaseia, Elieza, Jarib na Gedaliya. \v 19 Ha niile jikọrọ aka kpebiekwa na ha ga-ezila ndị nwunye ha. Onye ọbụla wetara ebule site nʼigwe atụrụ dịka ihe ikpe ọmụma. \li1 \v 20 Ndị si nʼikwu Imea bụ \li2 Hanani, na Zebadaya. \li1 \v 21 Ikwu Harim: \li2 Maaseia, Ịlaịja, Shemaya, Jehiel na Uzaya. \li1 \v 22 Ndị si nʼikwu Pashua: \li2 Elioenai, Maaseia, Ishmel, Netanel, Jozabad, na Eleasa. \b \li4 \v 23 Nʼime ndị Livayị: \li2 Jozabad, Shimei, Kelaya (onye a na-akpọkwa Kelita), Petahaya, Juda na Elieza. \li1 \v 24 Nʼime ndị na-abụ abụ, \li2 Eliashib. \li1 Nʼime ndị nche ọnụ ụzọ: \li2 Shalum, Telem, na Uri. \b \li4 \v 25 Nʼetiti ndị Izrel ndị ọzọ: \li1 Site nʼikwu Parosh: \li2 Ramaya, Izaya, Malkija, Mijamin, Elieza, Malkija na Benaya. \li1 \v 26 Site nʼikwu Elam: \li2 Matanaya, Zekaraya, Jehiel, Abdi, Jeremot na Ịlaịja. \li1 \v 27 Site nʼikwu Zatu: \li2 Elioenai, Eliashib, Matanaya, Jeremot, Zabad na Aziza. \li1 \v 28 Site nʼikwu Bebai: \li2 Jehohanan, Hananaya, Zabai, na Atlai. \li1 \v 29 Site nʼikwu Bani, \li2 Meshulam, Maluk, Adaya, Jashub, Sheal na Jeremot. \li1 \v 30 Site nʼikwu Pahat-Moab, \li2 Adna, Kelal, Benaya, Maaseia, Matanaya, Bezalel, Binui, na Manase. \li1 \v 31 Site nʼikwu Harim: \li2 Elieza, Ishija, Malkija, Shemaya, Shimeon, \v 32 Benjamin, Maluk na Shemaraya. \li1 \v 33 Site nʼikwu Hashum, \li2 Matenai, Matata, Zabad, Elifelet, Jeremai, Manase na Shimei. \li1 \v 34 Site nʼikwu Bani, \li2 Maadai, Amram, Uel, \v 35 Benaya, Bedeia, Keluhi \v 36 Venaya, Meremot, Eliashib \v 37 Matanaya, Matenai na Jaasu. \li1 \v 38 Site nʼikwu Bani: \li2 Binui na Shimei, \v 39 Shelemaya, Netan, Adaya, \v 40 Maknadebai, Shashai, Sharai, \v 41 Azarel, Shelemaya, Shemaraya, \v 42 Shalum, Amaraya na Josef. \li1 \v 43 Site nʼikwu Nebo: \li2 Jeiel, Matitaia, Zabad, Zebina, Jadai, Juel na Benaya. \b \li4 \v 44 Ndị a niile lụrụ ndị inyom site na mba ọzọ. Ha zilagara ha na ụmụ ha.