\id 2SA - Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 \ide UTF-8 \h 2 Samuel \toc1 2 Samuel \toc2 2 Samuel \toc3 2Sa \mt1 2 Samuel \c 1 \s1 Devid anụ maka ọnwụ Sọl \p \v 1 Mgbe Sọl nwụsịrị, Devid si ebe ọ gara tigbuo ndị Amalek lọghachi. Devid nọrọ ụbọchị abụọ na Ziklag. \v 2 O ruo, nʼụbọchị nke atọ, otu nwoke si nʼọmụma ụlọ ikwu Sọl bịakwutere ya. Uwe nwoke a yi nʼahụ dọwara adọwa. Isi ya dịkwa aja aja. Ọ batara daa nʼala nʼihu Devid nʼọnọdụ inye ya nsọpụrụ. \p \v 3 Devid jụrụ ya sị, “Ebee ka i si bịa?” \p Nwoke ahụ zara sị, “Esi m nʼọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel gbapụta.” \p \v 4 Devid jụrụ ya sị, “Gịnị mere? Biko gwa m.” \p Nwoke ahụ zara sị, “Ndị agha Izrel niile agbaala ọsọ. Ọtụtụ nʼime ndị agha Izrel anwụọkwala. Sọl na Jonatan nwa ya nwụkwara!” \p \v 5 Devid jụrụ ya sị, “Olee otu i si mata na Sọl na Jonatan anwụọla?” \p \v 6 Nwokorobịa ahụ sịrị ya, “Ọ dapụtara na m nọ nʼugwu Gilboa hụ Sọl mgbe ọ dabeere nʼùbe ya. Mgbe ahụ ụgbọ agha ndị iro na ndị na-agba ịnyịnya agha na-esosi ya ike. \v 7 Mgbe ọ hụrụ m, ọ kpọrọ m ka m bịakwute ya. Azara m ya sị, ‘Gịnị ka m nwere ike ime?’ \p \v 8 “Ọ jụrụ m sị, ‘Ị bụ onye?’ \p “Azara m ya sị, ‘Abụ m onye Amalek.’ \p \v 9 “Ọ sị m, ‘Biko, bịa guzo nʼakụkụ m ka ị gbuo m, nʼihi na ọ bụ ezie na m dị ndụ, ma anọ m nnọọ nʼoke ihe mgbu nke ọnwụ.’ \p \v 10 “Ya mere, eguzoro m nʼakụkụ ya, gbuo ya, nʼihi na amaara m na ọ gaghị adị ndụ tee anya. Ọ bụkwa mgbe m gbusịrị ya ka m kpupụrụ ya okpueze dị ya nʼisi, gbapụtakwa ya mgbaaka dị nʼogwe aka ya, chịrị ha, ka m chịtara gị ha, onyenwe m.” \p \v 11 Mgbe Devid na ndị ikom ya nụrụ ihe ndị a. Ha dọwara uwe ha. \v 12 Ha ruru ụjụ. Kwaa akwa. Bukwaa ọnụ ruo oge anyasị nʼihi Sọl na Jonatan nwa ya nwoke, na nʼihi ndị agha \nd Onyenwe anyị\nd* na ụlọ Izrel. Nʼihi na ha dara site na mma agha. \p \v 13 Mgbe ahụ, Devid jụrụ nwokorobịa ahụ wetara ozi ahụ ajụjụ sị, “Olee ebe i si bịa?” \p Ọ zara sị ya, “Abụ m onye ọbịa, onye Amalek.” \p \v 14 Devid jụrụ ya sị, “Gịnị mere i ji setịpụ aka gị, na-atụghị ụjọ, tigbuo onye \nd Onyenwe anyị\nd* tere mmanụ?” \p \v 15 Devid kpọrọ otu nʼime ndị ikom ya sị ya, “Gbuo ya!” Nwoke ahụ weere mma agha gbuo ya. \v 16 Mgbe ahụ Devid sịrị ya, “Ọbara gị laa gị nʼisi, nʼihi na ị ji ọnụ gị kwupụta sị, ‘Egburu m onye \nd Onyenwe anyị\nd* tere mmanụ.’ ” \s1 Abụ akwa Devid maka Sọl na Jonatan \p \v 17 Emesịa, Devid depụtara abụ akwa a nʼihi Sọl na Jonatan. \v 18 O nyere iwu ka akụziere ndị Juda, abụ ùta a. E dere ya nʼime akwụkwọ Jesha. \q1 \v 19 “Ebube gị, gị Izrel, abụrụla ihe e gburu nʼebe gị niile dị elu. \q2 Lee ka ndị bụ dike si daa! \b \q1 \v 20 “Ekwutela ya na Gat.\f + \fr 1:20 \fr*\ft Obodo Gat na Ashkelọn dị nʼala Filistia. \+xt 1Sa 6:17; 1Sa 27:2\+xt*\ft*\f* \q2 Ekwusala ya nʼokporoụzọ Ashkelọn.\f + \fr 1:20 \fr*\ft Otu obodo nʼime ala ndị Filistia \+xt Jer 25:20\+xt*\ft*\f* \q1 Ka ada ndị Filistia ghara ịṅụrị ọṅụ. \q2 Ka ụmụ inyom ndị a na-ebighị ugwu ghara iti mkpu ọṅụ. \b \q1 \v 21 “Unu ugwu Gilboa, \q2 ka igirigi maọbụ mmiri ozuzo ghara ịbịakwasị unu. \q2 Ka mmiri ozuzo gharakwa izokwasị nʼaja mbuli elu unu.\f + \fr 1:21 \fr*\ft Ka ubi unu dị nʼelu ugwu ghara ịmịpụta mkpụrụ\ft*\f* \q1 Nʼihi na nʼelu unu ka a nọ merụọ ọta\f + \fr 1:21 \fr*\ft Ọ bụ akpụkpọ anụ a mịkpọrọ amịkpọ, nke e tere mmanụ ka e ji eme ọta. Ọ bụ mmanụ ahụ e teere ya, na-eme ka ọ ghara ịma ebu, meekwa ka ọ na-amị amị, i ji gbochie ka àkụ a gbara ghara imife nʼọta ahụ. Ma ọta ndị a, nʼihi na ha amịjuola ọbara nʼebe ọ dị ukwuu, ha adịghị abakwa uru ọta na-aba nʼoge agha.\ft*\f* ndị dị ike. \q2 E, ọta Sọl, nke a na-adịghị etekwa mmanụ. \b \q1 \v 22 “Site nʼọbara ndị e gburu egbu, \q2 site nʼanụ ahụ ndị dị ike. \q1 Ụta Jonatan alọghachighị azụ. \q2 Mma agha Sọl agbaghịkwa aka lọghachi. \q1 \v 23 Sọl na Jonatan, \q2 na ndụ ha bụ ndị a hụrụ nʼanya. Ndị jupụtara nʼamara. \q2 Ma nʼọnwụ, nkewa ọbụla adịghị nʼetiti ha. \q1 Ha dị gara gara karịa ugo. \q2 Ha dị ike karịa ọdụm. \b \q1 \v 24 “Ụmụada\f + \fr 1:24 \fr*\ft Maọbụ, \ft*\fqa Ụmụ ndị inyom Izrel.\fqa*\f* Izrel, \q2 kwaaranụ Sọl akwa. \q1 Onye na-eji uwe uhie uhie chọọ unu mma. \q2 Onye ji uwe na ihe ịchọ mma ọlaedo chọọ unu mma. \b \q1 \v 25 “Lee ka ndị dị ike si daa nʼetiti ọgbọ agha. \q2 E gbuola Jonatan nʼelu ugwu; \q1 \v 26 ana m eruru gị ụjụ, gị Jonatan, nwanne m \q2 nʼihi na ihe dị oke ọnụahịa ka ị bụụrụ m. \q1 Ịhụnanya\f + \fr 1:26 \fr*\ft \+xt 1Sa 18:1-4; 19:2; 20:17\+xt*\ft*\f* i nwere nʼebe m nọ dị omimi \q2 karịa ịhụnanya ndị nwanyị. \b \q1 \v 27 “Lee ka ndị dị ike si daa! \q2 Ngwa agha niile abụrụla ihe lara nʼiyi!” \c 2 \s1 Devid abụrụ eze ndị Juda \p \v 1 Dịka oge na-aga, Devid jụrụ \nd Onyenwe anyị\nd* ase sị, “M ga-ebili gbagoo nʼotu obodo dị na Juda?” \p \nd Onyenwe anyị\nd* sịrị, “Gbagoo.” \p Devid jụkwara, “Olee ebe m ga-agbago?” \p \nd Onyenwe anyị\nd* zara, “Hebrọn.” \p \v 2 Devid na nwunye ya abụọ, Ahinoam onye Jezril, na Abigel nwunye ochie Nebal onye Kamel gara nʼebe ahụ. \v 3 Devid kpọkwaara ndị ikom ahụ ya na ha so, onye ọbụla nʼime ha durukwaara ezinaụlọ ya, ga biri na Hebrọn na obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu. \v 4 Ndị ikom Juda bịakwutere Devid na Hebrọn. Tee ya mmanụ ịbụ eze ebo Juda niile. \p Mgbe Devid nụrụ na ọ bụ ndị ikom Jebesh Gilead liri Sọl, \v 5 o zigaara ha ndị ozi ka ha sị ha, “Ka \nd Onyenwe anyị\nd* gọzie unu nʼihi obiọma unu gosiri site nʼili Sọl, nna unu ukwu, nʼụzọ kwesiri ekwesi. \v 6 Ka \nd Onyenwe anyị\nd* gosikwa unu obiọma na ikwesi ntụkwasị obi. Mụ onwe m ga-egosikwa unu otu ụdị amara a, nʼihi ihe a unu mere. \v 7 Ma ugbu a, bụrụnụ dike na dimkpa, nʼihi na Sọl nna unu ukwu anwụọla. Ọzọkwa, ndị Juda niile eteela m mmanụ ịbụ eze ha.” \s1 Agha dara nʼetiti ezinaụlọ Devid na Sọl \p \v 8 Ma Abna\f + \fr 2:8 \fr*\ft Abna, bụ nwa nwanne nna Sọl. Ọ bụ ọchịagha Sọl, onye gbalịsịrị ike ihu nʼocheeze Sọl dịgidere na-aga nʼihu. \+xt 1Sa 14:50; 2Sa 3:6\+xt*\ft*\f* nwa Nea, ọchịagha ndị agha Sọl edurularịị Ishboshet, nwa Sọl, dubata ya nʼobodo Mahanaim. \v 9 Ọ nọrọ nʼebe ahụ mee ya eze ndị Gilead, ndị Ashuri\f + \fr 2:9 \fr*\ft Ndị Ashuri bụ ndị ezinaụlọ si nʼebo Asha \+xt Nkp 1:31-32; Jos 19:24-31\+xt*\ft*\f* na ndị Jezril; na ndị Ifrem, ndị Benjamin na Izrel niile. \p \v 10 Ishboshet nwa Sọl gbara iri afọ anọ mgbe ọ ghọrọ eze ndị Izrel. Ọ chịkwara afọ abụọ. Ma otu ọ dị, ndị Juda niile nọgidere nʼokpuru Devid. \v 11 Ogologo oge niile Devid chịrị dịka eze ndị Juda na Hebrọn bụ afọ asaa na ọnwa isii. \p \v 12 Otu ụbọchị, Abna nwa Nea, duuru ndị agha Ishboshet nwa Sọl site na Mahanaim jee Gibiọn. \v 13 Ma Joab,\f + \fr 2:13 \fr*\ft Dịka Abna, ọchịagha Sọl, bụ nwa nwanne nna ya \+xt 1Sa 2:8\+xt* Otu a ka Joab, ọchịagha Devid, Abishai na Asahel dị nye Devid. Ha bụ ụmụ nwanne ya nwanyị.\ft*\f* nwa Zeruaya dukwaara ndị agha Devid pụọ izute ha nʼọdọ mmiri Gibiọn. Otu ndị nọdụrụ ala nʼotu akụkụ ọdọ mmiri, ndị nke ọzọ nʼakụkụ ọzọ nke ọdọ mmiri ahụ. Ha cherịtara onwe ha ihu. \p \v 14 Abna gwara Joab sị, “Ka ụfọdụ ụmụ okorobịa pụta nʼihu anyị maa aka mgba.” \p Joab sịrị, “Ka ha pụta.” \p \v 15 Ha pụtara ka a gụpụtachara ha. Ha dị mmadụ iri na abụọ site nʼetiti ndị agha Benjamin na Ishboshet nwa Sọl, mmadụ iri na abụọ site nʼetiti ndị agha Devid. \v 16 Nwoke ọbụla jidere ibe ya nʼisi were mma agha ya manye ya nʼakụkụ, si otu a wetara onwe ha ọnwụ. Ọ bụ nke a mere e ji kpọọ ebe ahụ dị na Gibiọn, Helkat Hazurim, nke pụtara Ala mma agha. \p \v 17 Agha siri ike dara nʼụbọchị ahụ. Ma ndị agha Devid lụgburu Abna na ndị agha Izrel. \p \v 18 Ụmụ Zeruaya atọ nọ nʼebe ahụ, ya bụ, Joab, na Abishai na Asahel. Asahel bụ nwoke na-agba ọsọ dịka mgbada. \v 19 Ọ chụwara Abna ọsọ, ọ dịghị mgbe ọ tụgharịrị gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe mgbe ọ nọ na-achụ ya ọsọ. \v 20 Mgbe Abna lere anya nʼazụ hụ ya ka ọ na-abịa, ọ kpọrọ ya oku sị ya, “Ọ bụ gị Asahel?” \p Asahel zara sị, “Ọ bụ m.” \p \v 21 Abna gwara ya okwu sị ya, “Tụgharịa nʼakụkụ aka nri maọbụ aka ekpe, jide otu nʼime ụmụ okorobịa ndị a. Napụ ya ngwa agha ya niile.” Ma Asahel akwụsịghị ịchụ ya ọsọ. \p \v 22 Abna gwara Asahel ọzọ sị, “Laghachi azụ. Kwụsị ịchụ m ọsọ! Gịnị mere m ga-eji tigbuo gị? Olee otu m ga-esi lekwasị nwanne gị Joab anya nʼihu ma m gbuo gị?” \p \v 23 Ma Asahel jụrụ ịlaghachi azụ. Nʼihi ya, Abna weere isi ùbe ya mapuo ya afọ. Ùbe ahụ sikwa ya nʼazụ pụta. Ọ dara nʼala, nwụọ otu mgbe ahụ. Ndị niile bịaruru ebe ahụ ọ dara nwụọ kwụsịrị. Ha agakwaghị nʼihu ịchụ ndị ọzọ. \p \v 24 Ma Joab na Abishai chụgidere Abna ọsọ. Anwụ adaala mgbe ha bịarutere nʼugwu nta Ama, nke dị Gịa nso, nʼụzọ e si aga nʼọzara Gibiọn. \v 25 Ndị ikom Benjamin chịkọtara onwe ha ọnụ dịnyere Abna. Ha niile guzooro nʼelu otu ugwu dịka otu usuu ndị agha. \p \v 26 Mgbe ahụ, Abna kpọrọ Joab oku sị ya, “Ọ bụ ruo ole mgbe ka anyị ga na-eji mma agha na-egburita onwe anyị? Olee mgbe ị ga-akpọghachi ndị gị ka ha hapụ ịchụ na igbu ụmụnne ha? Ị maghị na ihe dị otu a ga-eweta obi ilu?” \p \v 27 Joab zara sị, “Eji m aha Chineke ṅụọ iyi na-asị na ọ bụrụ na i gbara nkịtị, ndị a gaara achụso ụmụnna ha ọsọ na-akwụsịghị ruo nʼụtụtụ echi.” \p \v 28 Mgbe ahụ, Joab fụrụ opi\f + \fr 2:28 \fr*\ft Ị fụụ opi ike, nwere ike ị bụ ịkpọsa mbido agha, maọbụ mkpọsa ka a kwụsị agha. \+xt Nkp 7:16-20; 2Sa 2:28; 20:22\+xt*\ft*\f* ike ya. Nke a mere ka ndị ya kwụsị ịchụ ndị Izrel. Ha kwụsịkwara ibu agha. \p \v 29 Nʼabalị ahụ, Abna na ndị ikom ya jere ije gafee ndagwurugwu Jọdan, gabigakwa osimiri Jọdan, jee ije nʼụtụtụ echi ya tutu ha eruo Mahanaim. \p \v 30 Joab kwụsịrị ịchụ Abna ọsọ, ọ chịkọtara ndị agha niile. Mgbe ọ gụrụ ha ọnụ, ọ chọpụtara na mmadụ iri na itoolu nʼime ndị ikom Devid, tinyere Asahel nwanne ya, bụ ndị na-alọtaghị agha. \v 31 Ma ndị ikom Devid gburu narị ndị agha Benjamin atọ na iri isii, bụ ndị so Abna. \v 32 Emesịa, Joab na ndị agha ya buuru ozu Asahel gaa lie ya na Betlehem, nʼili nna ya. Ha jere ije abalị ahụ niile tutu ha erute Hebrọn mgbe chi bidoro ịbọ. \c 3 \p \v 1 Agha dị nʼetiti ndị ụlọ Sọl na ụlọ Devid dịịrị ruo oge toro ogologo. Ma ka Devid na-aga nʼihu na-esiwanye ike, ụlọ Sọl na-aga azụ na-ada ada. \b \s1 Ụmụ Devid \li4 \v 2 A mụtaara ọtụtụ ụmụ ndị ikom nye Devid mgbe ọ nọ na Hebrọn. \b \li1 Ọkpara ya bụ Amnọn nke, Ahinoam bụ nwanyị Jezril mụrụ. \li1 \v 3 Nke abụọ bụ Kiliab, nke Abigel, nwunye ochie Nebal, onye Kamel mụrụ. \li1 Nke atọ bụ Absalọm, nke Maaka nwa nwanyị Talmai, bụ eze Geshua\f + \fr 3:3 \fr*\ft Geshua, bụ otu mpaghara nʼalaeze ndị Siria ebe Absalọm gbalagara maka ize ndu. \+xt Jos 13:13; 1Sa 27:8; 2Sa 13:37-38; 14:32; 15:8\+xt*\ft*\f* mụrụ. \li1 \v 4 Nke anọ bụ Adonaịja, nwa nwoke Hagit. \li1 Nke ise bụ Shefataya nwa Abital; \li1 \v 5 nke isii bụ Itream, nwa nwoke Egla nwunye Devid. \b \li4 Ndị a ka a mụtaara Devid na Hebrọn. \s1 Abna adịnyere Devid \p \v 6 O ruo, mgbe agha na-aga nʼihu nʼetiti ụlọ Sọl na ụlọ Devid, na Abna nọ na-eme ka ọnọdụ ya sie ike nʼụlọ Sọl. \v 7 Ma Sọl nwererịị otu iko nwanyị aha ya bụ Rizpa, nwa Aịa. Ishboshet jụrụ Abna ajụjụ sị, “Gịnị mere gị na iko nwanyị nna m ji dinaa?” \p \v 8 Iwe were Abna nke ukwuu nʼihi ihe Ishboshet kwuru. Ya mere, ọ zara, “Ọ bụ isi nkịta nke ụlọ Juda ka m bụ? Taa ka m ji obi m niile na-ejere ụlọ nna gị, bụ Sọl, na ezinaụlọ ya, na ndị enyi ya ozi. Ewerebeghị m gị nyefee nʼaka Devid. Ma lee, ugbu a i na-ebo m ebubo ajọ omume nʼihe metụtara nwanyị a. \v 9 Ka Chineke mesoo Abna mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na m emereghị Devid ihe ndị ahụ niile \nd Onyenwe anyị\nd* sitere nʼịṅụ iyi kwee nkwa inye ya. \v 10 Ịnapụ ụlọ Sọl alaeze ahụ, na ime ka ocheeze Devid guzosie ike nʼebe Izrel niile na Juda niile nọ, site na Dan ruo Bịasheba.”\f + \fr 3:10 \fr*\ft Mgbe ọbụla e kwuru otu a, site na Dan ruo Bịasheba, ọ bụ banyere ndị Izrel niile ka a na-ekwu maka ya. Nke a bụ i site na nsọtụ ebe ugwu ruo na nsọtụ ndịda. \+xt Nkp 20:1; 1Sa 3:20; 2Sa 17:11; 1Ez 4:25\+xt*\ft*\f* \v 11 Ishboshet ekwughị ihe ọbụla nʼihi na ọ na-atụ Abna egwu. \p \v 12 Ngwangwa, Abna zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru Devid sị ya, “Onye nwee ala a? Ka mụ na gị gbaa ndụ. Aga m enyere gị aka kpọghachite ndị Izrel ka ha dịnyeere gị.” \p \v 13 Devid sịrị, “Ọ dị mma. Mụ na unu ga-agba ndụ. Ma ọ dị otu ihe m chọrọ nʼaka unu. Unu agaghị ahụ ihu m anya ma ọ bụrụ na unu eduteghị Mikal, nwa Sọl, mgbe unu ga-abịa ịhụ m.” \v 14 Devid ziri Ishboshet nwa Sọl ozi sị ya, “Dulatara m nwunye m Mikal, nʼihi na ọ bụ narị apị ndị Filistia ka m ji lụtara ya onwe m.” \p \v 15 Na-atụfughị oge, Ishboshet nyere iwu ka e site nʼaka di ya bụ Paltiel, nwa Laish, kpọpụta ya. \v 16 Mgbe ha du ya na-aga, Paltiel sogidere ya nʼazụ na-akwa akwa tutu ha eruo Bahurim. Nʼebe ahụ ka Abna nọ sị ya, “Laghachi ugbu a.” Ọ tụgharịrị laa. \p \v 17 Abna na ndị okenye Izrel kparịtara ụka. Ọ chetaara ha sị ha, “Ọ dịla anya kemgbe unu na-achọ ka Devid bụrụ eze unu. \v 18 Ugbu a meenụ ya, nʼihi na \nd Onyenwe anyị\nd* kweere Devid nkwa, ‘Site nʼaka ohu m bụ Devid ka m ga-esi zọpụta ndị m bụ Izrel site nʼaka ndị Filistia, nakwa site nʼaka ndị iro ha niile.’ ” \p \v 19 Abna gwakwara ndị Benjamin okwu. Emesịa, o jere Hebrọn ịgwa Devid ihe niile ndị Izrel na ndị Benjamin zubere ime. \v 20 Abna, ya na iri ndị ikom abụọ so gakwuru Devid na Hebrọn. Mgbe ha ruru, Devid meere ha oke oriri. \v 21 Mgbe ahụ, Abna sịrị Devid, “Ka m gaa ngwangwa ga kpọkọtaa ndị Izrel niile, nye onyenwe m bụ eze, ka gị na ha gbaa ndụ, ka ị bụrụ eze ndị niile mkpụrụobi gị na-achọsi ike.” Ya mere Devid zilara Abna. Ọ laa nʼudo. \s1 Joab egbuo Abna \p \v 22 Nʼotu mgbe ahụ, ndị ikom Devid na Joab si nʼebe ha gara ịpụnara ndị mmadụ ihe lọta, bukọrọ ọtụtụ ihe nkwata. Ma Abna anọghịkwa na Hebrọn ya na Devid, nʼihi na Devid ezipụla ya, ọ pụọla nʼudo. \v 23 Mgbe Joab na ndị agha ya lọtara, a kọọrọ ya na Abna, nwa Nea, bịara hụ eze, na ọ laakwala nʼudo. \p \v 24 Ya mere Joab jekwuuru eze sị ya, “Gịnị ka i mere? Lee, Abna bịakwutere gị. Gịnị mere i ji hapụ ya ka ọ laa? Lee ya ugbu a, ọ laala! \v 25 Ị maara onye Abna nwa Nea bụ? Ọ bịara ịghọ gị aghụghọ, na inyocha njegharị gị, ịchọpụta ihe niile ị na-eme.” \p \v 26 Mgbe Joab si nʼihu Devid pụta, o zipụrụ ndị ozi ka ha sochie Abna azụ, gwa ya ka ọ laghachi. Ha hụrụ ya nʼolulu mmiri Sira. O sokwara ha laghachi, ma Devid amaghị ihe banyere nke a. \v 27 Mgbe Abna lọghachiri na Hebrọn, Joab duuru ya gaa nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama, dịka ọ chọrọ ka ha kparịtaa ụka. Ngwangwa, ọ mịpụtara nwa mma ya, jiri ya magbuo Abna, nʼihi ịbọ ọbọ ọbara nwanne ya, bụ Asahel. \p \v 28 Mgbe emesịrị, Devid nụrụ banyere ya, ọ sịrị, “Aka m dị ọcha, ya na nke alaeze m nʼihu \nd Onyenwe anyị\nd* banyere ọbara Abna, nwa Nea. \v 29 Ka ikpe ọmụma a dakwasị Joab nʼisi, nakwa ezinaụlọ nna ya niile, ka a gharakwa ịhụ nʼụlọ Joab onye na-adịghị arịa ọrịa ahụ ihe ntokasị, maọbụ ọrịa ekpenta, maọbụ onye ji mkpara eji akpa akwa, maọbụ onye ga-anwụ site na mma agha, maọbụ onye ụkọ nri adịghị akọ.”\f + \fr 3:29 \fr*\ft \+xt Dit 21:6-9; 1Ez 2:32-33\+xt*\ft*\f* \p \v 30 Ya mere, Joab na Abishai nwanne ya gburu Abna, nʼihi na Abna gburu nwanne ha Asahel nʼagha Gibiọn. \p \v 31 Emesịa, Devid kpọrọ Joab na ndị niile so ya sị ha, “Dọwaanụ uwe unu, yikwasị onwe unu akwa mkpe, jegharịakwanụ nʼọnọdụ iru ụjụ nʼihi Abna.” Eze, bụ Devid nʼonwe ya so ndị bu ozu Abna nʼazụ. \v 32 Ha liri Abna na Hebrọn. Eze na ndị Izrel niile kwara akwa nʼakụkụ ili ahụ nʼihi Abna. \p \v 33 Eze bụrụ abụ akwa nʼihi Abna, sị, \q1 “O kwesiri ka Abna nwụọ dịka onye nzuzu? \q2 \v 34 E kekwaghị aka gị abụọ ihe. \q2 E kekwaghị ụkwụ gị abụọ agbụ. \q1 Ị nwụrụ dịka onye ndị ajọ omume gburu.” \p Mmadụ niile bekwara akwa ọzọ nʼihi ya. \p \v 35 Mgbe ahụ, ndị mmadụ bịakwutere Devid rịọọ ka o ritụ ihe, mgbe ìhè ụbọchị ka dị, ma Devid ṅụrụ iyi sị, “Ka Chineke mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na m edetụ achịcha maọbụ ihe ọbụla ọzọ ọnụ tutu ruo mgbe anyanwụ dara.” \p \v 36 Ndị mmadụ nụrụ ihe o kwuru, okwu ahụ tọkwara ha ụtọ. Nʼezie, ihe niile eze mere tọrọ ha ụtọ. \v 37 Nʼụbọchị ndị mmadụ niile nọ ebe ahụ ka Izrel niile matara na eze amaghị ihe banyere ọnwụ Abna, nwa Nea. \p \v 38 Devid jụrụ ndị ikom ya ajụjụ sị, “Unu ghọtakwara na onye a dara nʼIzrel taa bụ nwa eze na onye dị mkpa? \v 39 Ọ bụ ezie na m bụ onye \nd Onyenwe anyị\nd* tere mmanụ ịbụ eze, ma o nweghị ihe m pụrụ ime ụmụ ndị ikom Zeruaya ndị a, nʼihi na ha dị ike karịa m. Ka \nd Onyenwe anyị\nd* kwụghachi onye ọjọọ ihe ọjọọ ọ mere.” \c 4 \s1 Ọnwụ Ishboshet \p \v 1 Mgbe Ishboshet nwa Sọl nụrụ na Abna anwụọla na Hebrọn. Ọ tụrụ egwu. Ndị Izrel tụkwara egwu hie nne. \v 2 Nʼoge a, nwa Sọl nwere mmadụ abụọ ndị bụ ndịisi ndị na-aga apụnara ndị mmadụ ihe. Aha otu onye bụ Baana, aha onye nke ọzọ bụ Rekab. Ha abụọ bụ ụmụ Rimọn onye Beerọt, nke dị nʼebo Benjamin. A na-agụ ndị Beerọt dịka ndị Benjamin, \v 3 nʼihi na ndị Beerọt gbara ọsọ agha gbalaa Gitaim, obodo ndị Benjamin. Ha bikwa nʼebe ahụ ruo taa dịka ndị ọbịa. \p \v 4 (Jonatan nwa Sọl nwere otu nwa nwoke dara ngwụrọ nʼụkwụ ya abụọ. Ọ gbara afọ ise mgbe akụkọ banyere Sọl na Jonatan si Jezril bịarute ha. Nwanyị na-eku ya kuuru ya bido ịgbapụ ọsọ, ma dịka ọ na-agba ọsọ, nwantakịrị nwoke ahụ dara nʼala ghọọ onye ngwụrọ. Aha ya bụ Mefiboshet.) \p \v 5 Nʼoge a, Rekab na Baana ụmụ Rimọn, onye Beerọt bịaruru nʼụlọ Ishboshet nʼoge ehihie, mgbe ọ nọ na-ezu ike. \v 6 Ha banyere nʼime ime ụlọ, dịka a ga-asị na ha na-aga iburu ọka wiiti. Mgbe ha banyere nʼebe ahụ, ha mara Ishboshet mma nʼafọ. Emesịa, Rekab na nwanne ya Baana si nʼụlọ ahụ zopu onwe ha. \p \v 7 Ha abatala nʼụlọ mgbe Ishboshet dinara nʼelu ihe ndina ya, nʼime ụlọ ndina ya. Mgbe ha machara ya mma, gbuo ya, ha bipụrụ ya isi. Buru isi ya gbalaga. Jee ije abalị ahụ niile gafee ọzara. \v 8 Ha buuru isi Ishboshet butere Devid na Hebrọn, sị eze, “Taa ka \nd Onyenwe anyị\nd* bọọrọ onyenwe m eze ọbọ megide Sọl na mkpụrụ ya. Nke a bụ isi Ishboshet, nwa onye iro gị Sọl, onye chọsịrị ike iwepụ ndụ gị.” \p \v 9 Ma Devid zara Rekab na Baana ụmụ Rimọn onye Beerọt okwu sị ha, “Dịka \nd Onyenwe anyị\nd* si adị ndụ, onye napụtara m site na nsogbu m niile, \v 10 mgbe otu onye\f + \fr 4:10 \fr*\ft \+xt 2Sa 1:2-16\+xt*\ft*\f* bịakwutere m gwa m na Sọl anwụọla, na-eche nʼobi ya na o wetaara m oziọma. Egburu m ya na Ziklag, si otu ahụ kwụọ ya ụgwọ oziọma ahụ o chere na ọ wetaara m. \v 11 Ọ bụladị karịa nke a, mgbe ndị ikom ajọ omume gburu nwoke onye aka ya dị ọcha nʼụlọ ya, nʼelu ihe ndina ya?\f + \fr 4:11 \fr*\ft \+xt Jen 9:5-6; Abụ 9:12\+xt*\ft*\f* M ga-ahapụ ịbọtara onye e gburu egbu ọbọ, si otu a kpochapụ unu nʼụwa!” \p \v 12 Devid nyere ụmụ okorobịa ya iwu ka ha gbuo mmadụ abụọ ahụ. Ha gbukwara ha. Emesịa, ha bipụrụ aka ha na ụkwụ ha. Were ozu ha kwụba ya nʼakụkụ ọdọ mmiri Hebrọn. Ha wekwaara isi Ishboshet, lie ya nʼili Abna na Hebrọn. \c 5 \s1 Devid abụrụ eze ndị Izrel niile \p \v 1 Mgbe ahụ, ndị ebo Izrel niile bịakwutere Devid na Hebrọn, sị ya, “Lee, ọkpụkpụ gị na anụ ahụ gị ka anyị bụ. \v 2 Nʼoge gara aga, mgbe Sọl bụ eze na-achị anyị, ọ bụ gị duuru ndị agha Izrel nʼọgụ niile, ma ọpụpụ ma mbata. \nd Onyenwe anyị\nd* sịrị gị, ‘Ị ga-azụ ndị m, bụ Izrel, ị ga-abụkwa onye ga-achị ha.’ ” \p \v 3 Mgbe ndị okenye Izrel niile bịakwutere Devid na Hebrọn, ha na eze Devid gbara ndụ nʼihu \nd Onyenwe anyị\nd* na Hebrọn. Ha tere Devid mmanụ\f + \fr 5:3 \fr*\ft Otite mmanụ a, bụ nke ugboro atọ a na-ete Devid ịbụ eze ndị Izrel. \+xt 1Sa 16:13; 2Sa 2:4\+xt*\ft*\f* ịbụ eze Izrel. \p \v 4 Devid gbara iri afọ atọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịkwara iri afọ anọ. \v 5 Ọ chịrị ndị Juda niile na Hebrọn afọ asaa na ọnwa isii. Chịakwa ndị Izrel na Juda niile mgbe ọ nọ na Hebrọn na mgbe ọ nọ na Jerusalem iri afọ atọ na atọ, \s1 Devid adọta Jerusalem nʼagha \p \v 6 Eze na ndị ikom ya zọọrọ ije garuo Jerusalem ibuso ndị Jebus bi nʼebe ahụ agha. Ndị Jebus gwara Devid sị, “Ị gaghị abata nʼebe a, ọ bụladị ndị ìsì na ndị ngwụrọ nwere ike ịchụghachi gị azụ.” Ha na-eche sị, “Devid agaghị abata nʼebe a,” \v 7 nʼagbanyeghị okwu ndị a, Devid dọtara ebe ahụ e wusiri ike nke Zayọn nʼagha, ya bụ obodo Devid. \p \v 8 Nʼụbọchị ahụ, Devid kwuru sị, “Onye ọbụla ga-emeri ndị Jebus ga-esite nʼọnụ warawara ebe mmiri si abanye nʼobodo a banyekwuru ndị ngwụrọ na ndị ìsì a bụ ndị iro Devid.” Ọ bụ nke a mere ha ji ekwu okwu sị, “Ndị ìsì na ndị ngwụrọ agaghị abata nʼụlọeze ahụ.” \p \v 9 Devid biiri nʼebe ahụ e wusiri ike, kpọọ ya obodo Devid. O wuru akụkụ ebe dị gburugburu ya, site na Milo baa ruo nʼime ya. \v 10 Ma ọ gara nʼihu na-adị ukwuu karịa, nʼihi na \nd Onyenwe anyị\nd*, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyeere ya. \p \v 11 Hiram bụ Eze Taịa, zitere Devid osisi sida e ji ewu ụlọ, na ndị ǹka osisi, ndị na-ewu ụlọ. Ha wuuru Devid ụlọeze. \v 12 Mgbe ahụ, Devid ghọtara na \nd Onyenwe anyị\nd* emeela ka o guzosie ike dịka eze ndị Izrel. Bulikwa alaeze ya elu nʼihi ndị ya Izrel. \p \v 13 Mgbe Devid sitere na Hebrọn kwabata na Jerusalem; ọ lụrụ ndị inyom ọzọ, nwetakwara onwe ya ọtụtụ ndị iko nwanyị. Ọ mụtakwara ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị. \v 14 Ndị a bụ aha ụmụ a mụụrụ ya na Jerusalem: Shamua, Shobab, Netan, Solomọn,\f + \fr 5:14 \fr*\ft Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Batsheba mụtaara Devid \+xt 1Ih 3:5\+xt*\ft*\f* \v 15 Ibha, Elishua, Nefeg, Jafia, \v 16 Elishama, Eliada na Elifelet. \s1 Devid emerie ndị Filistia \p \v 17 Mgbe ndị Filistia nụrụ na eteela Devid mmanụ ị bụ eze ndị Izrel, ha pụrụ ka igwe ha niile ha ịchọ ya. Ma Devid nụrụ maka ya, gbadaa nʼime ebe ahụ e wusiri ike. \v 18 Ma ndị Filistia bịara, gbasaa onwe ha na Ndagwurugwu Refaim niile. \v 19 Mgbe ahụ, Devid jụrụ\f + \fr 5:19 \fr*\ft \+xt 1Sa 23:2; 2Sa 2:1; 5:23\+xt*\ft*\f* \nd Onyenwe anyị\nd* ase sị, “Ọ bụ m gaa buso ndị Filistia agha? Ị ga-enyefe ha nʼaka m?” \p \nd Onyenwe anyị\nd* zara sị ya, “Gaa, nʼihi na aghaghị m inyefe ndị Filistia nʼaka gị.” \p \v 20 Ya mere, Devid gara Baal-Perazim, meriekwa ha nʼebe ahụ. O kwuru sị, “\nd Onyenwe anyị\nd* enupula megide ndị iro m nʼihu m, dịka idee mmiri si enupu.” Nʼihi ya, a kpọrọ ebe ahụ Baal-Perazim. \v 21 Ndị Filistia hapụrụ arụsị niile ha nʼebe ahụ. Devid na ndị ikom ya chịkọtara ha chịpụ. \p \v 22 Ma ndị Filistia lọghachiri ọzọ, gbasaa onwe ha na Ndagwurugwu Refaim. \v 23 Nʼihi nke a, Devid jụrụ \nd Onyenwe anyị\nd* ase, ọ zara sị, “Esitekwala nʼihu ha gaa, kama gaa gburugburu ruo nʼazụ ha, buso ha agha na ncherita ihu osisi balsam ndị ahụ. \v 24 Ngwangwa ị nụrụ ụda ikiri ụkwụ nʼelu osisi balsam ndị ahụ, mee ngwa malite ọgụ, nʼihi na nke a pụtara na \nd Onyenwe anyị\nd* eburula unu ụzọ pụọ, itigbu ndị agha Filistia.” \v 25 Devid mere dịka \nd Onyenwe anyị\nd* nyere ya nʼiwu. O tigburu ndị Filistia, site na Geba ruo Gaza. \c 6 \s1 Mbubata igbe ọgbụgba ndụ na Jerusalem \p \v 1 Emesịa, Devid chịkọtara iri puku ndị agha Izrel atọ a zụziri azụzi, \v 2 Ya na ndị ikom ya niile gara Baala nʼime\f + \fr 6:2 \fr*\ft Ya bụ Kiriat Jearim. \+xt 1Ih 13:6\+xt*\ft*\f* Juda, isi nʼebe ahụ bugota igbe ọgbụgba ndụ Chineke, nke akpọkwasịrị Aha ya, bụ aha \nd Onyenwe anyị\nd*. Onye pụrụ ime ihe niile, onye na-anọkwasị nʼetiti cherubim. \v 3 Ha dọkwasịrị igbe Chineke ahụ nʼelu ụgbọala ọhụrụ ehi na-adọkpụ, buputa ya site nʼụlọ Abinadab nke dị nʼelu ugwu nta. Ọ bụ Ụza na Ahio, ụmụ Abinadab, na-edu ụgbọala ọhụrụ ahụ, \v 4 nke igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị nʼelu ya, Ahio butere ụzọ na-aga nʼihu igbe ahụ. \v 5 Devid na ndị Izrel weere ike ha niile na-aṅụ ọṅụ nʼihu \nd Onyenwe anyị\nd*. Ha ji abụ, ụbọ akwara, opi, une na ogene na ihe egwu dị iche iche, dịka ịgba na ekwe na-eti egwu. \p \v 6 Mgbe ha rutere nʼebe ịzọcha ọka nke Nakọn, Ụza setịpụrụ aka ya, jide igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ, nʼihi na ehi ahụ zọhiere ụkwụ. \v 7 Ma iwe \nd Onyenwe anyị\nd* dị ọkụ megide Ụza, nʼihi omume enweghị nsọpụrụ o mere. Ya mere, Chineke tigburu ya. Ọ nwụọ nʼebe ahụ nʼakụkụ igbe Chineke. \p \v 8 Mgbe ahụ, iwe were Devid, nʼihi ọnụma \nd Onyenwe anyị\nd* dakwasịrị Ụza. Ruo taa, a na-akpọ ebe ahụ Perez Ụza.\f + \fr 6:8 \fr*\fq Perez Ụza \fq*\ft pụtara \ft*\fqa ihe ntiwapụta megide Ụza\fqa*\f* \p \v 9 Devid tụrụ egwu \nd Onyenwe anyị\nd* nʼụbọchị ahụ. O kwuru sị, “Igbe ọgbụgba ndụ \nd Onyenwe anyị\nd* ọ ga-esi aṅaa bịakwute m?” \v 10 O kweghị ebubata igbe ọgbụgba ndụ \nd Onyenwe anyị\nd* ahụ nʼime obodo Devid, kama o bugara ya nʼụlọ Obed-Edọm, onye Git. \v 11 Igbe ọgbụgba ndụ \nd Onyenwe anyị\nd* nọrọ nʼụlọ Obed-Edọm, onye Git ọnwa atọ. \nd Onyenwe anyị\nd* gọzikwara ya na ezinaụlọ ya niile. \p \v 12 Mgbe a gwara eze bụ Devid si, “\nd Onyenwe anyị\nd* agọziela ezinaụlọ Obed-Edọm na ihe niile o nwere, nʼihi igbe ọgbụgba ndụ Chineke.” Nʼihi nke a, Devid ji oke ọṅụ gaa nʼụlọ Obed-Edọm, nʼihi ibugote igbe ọgbụgba ndụ Chineke, buga nʼobodo Devid. \v 13 Mgbe ndị bu igbe ọgbụgba ndụ \nd Onyenwe anyị\nd* ahụ zọrọ nzọ ụkwụ isii; ọ na-eji oke ehi na nwa ehi gbara abụba chụọ aja. \v 14 Devid ji ike ya niile na-ete egwu nʼihu \nd Onyenwe anyị\nd*. Ọ yi uwe efọọd e ji akwa ọcha dụọ nʼụbọchị ahụ, \v 15 mgbe ya na ndị Izrel niile ji iti mkpu na ụda ịfụ opi ike na-ebubata igbe ọgbụgba ndụ \nd Onyenwe anyị\nd*. \p \v 16 Mgbe ha bu igbe ọgbụgba ndụ \nd Onyenwe anyị\nd* na-abata nʼobodo Devid, Mikal, nwa Sọl lepụrụ anya site na oghereikuku ụlọ. Mgbe ọ hụrụ eze Devid ka ọ na-awụli elu na-etekwa egwu nʼihu \nd Onyenwe anyị\nd*, o ledara ya anya nʼime obi ya. \p \v 17 Ha bubatara igbe ọgbụgba ndụ \nd Onyenwe anyị\nd* ahụ, guzobe ya nʼọnọdụ ya nʼime ụlọ ikwu nke Devid manyere maka ya. Devid chụrụ aja nsure ọkụ na aja udo nʼihu \nd Onyenwe anyị\nd*. \v 18 Mgbe ọ chụsịrị aja nsure ọkụ na aja udo ndị a, ọ gọziri ndị Izrel nʼaha \nd Onyenwe anyị\nd*, Onye pụrụ ime ihe niile. \v 19 O nyekwara onye ọbụla nʼetiti igwe ndị Izrel niile ahụ, ma nwoke ma nwanyị, otu ogbe achịcha, ọkpụrụkpụ anụ na achịcha mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ. Ndị a niile lara, onye ọbụla nʼụlọ nke ya. \p \v 20 Mgbe Devid lọtara ka ọ gọzie ndị ụlọ ya, Mikal, ada Sọl pụtara izute ya, sị, “Lee ka eze Izrel si mee onwe ya onye dị ukwuu taa! Ọ gbara onwe ya ọtọ na mbara, nʼihu ndị ohu nwanyị nke ndị odibo ya dịka mmadụ efu.” \p \v 21 Ma Devid zara Mikal sị ya, “Ọ bụ nʼihu \nd Onyenwe anyị\nd* onye họpụtara m karịa nna gị\f + \fr 6:21 \fr*\ft \+xt 1Sa 13:14; 15:28\+xt*\ft*\f* maọbụ onye ọbụla ọzọ sitere nʼụlọ ya ka m tere egwu. E, \nd Onyenwe anyị\nd* ahụ họpụtara m ịbụ onyendu Izrel, ndị nke ya. Nʼezie, aga m aga nʼihu ịkpa agwa dịka onye nzuzu nʼihi ịsọpụrụ \nd Onyenwe anyị\nd*. \v 22 E, aga m aga nʼihu ịghọ onye na-enweghị uche, na onye e weturu ala nʼanya onwe m. Ma ụmụ agbọghọ ndị ahụ i kwuru okwu ha, ha ga-asọpụrụ m!” \p \v 23 Mikal, ada Sọl amụtaghị nwa ọbụla ruo nʼoge ọnwụ ya. \c 7 \s1 Nkwa Chineke kwere Devid \p \v 1 O ruo mgbe eze nọsara ahụ nʼụlọeze ya, mgbe \nd Onyenwe anyị\nd* mekwara ka o site nʼaka ndị iro ya nọ gburugburu zuru ike, \v 2 ọ sịrị Netan, bụ onye amụma, “Lee, mụ onwe m na-ebi nʼụlọ sida, ma igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị nʼime ụlọ ikwu.” \p \v 3 Netan zaghachiri eze sị, “Ihe ọbụla dị gị nʼobi gaa nʼihu mee ya, nʼihi na \nd Onyenwe anyị\nd* nọnyeere gị.” \p \v 4 Ma nʼabalị ahụ, okwu \nd Onyenwe anyị\nd* rutere Netan ntị, na-asị, \pm \v 5 “Gaa gwa ohu m Devid sị ya, ‘Otu a ka \nd Onyenwe anyị\nd* kwuru, Ọ bụ gị ga-ewuru m ụlọ ebe m ga-ebi? \v 6 Nʼihi na ebibeghị m nʼụlọ site nʼụbọchị m si nʼIjipt kpọpụta ndị Izrel ruo taa. Kama ana m ejegharị site otu ebe gaa ebe ọzọ, were ụlọ ikwu mere ebe obibi m. \v 7 Nʼebe ọbụla m na-ejegharị nʼetiti ndị Izrel niile, ọ dị mgbe m sịrị onye ọbụla nʼime ndị ọchịchị ha, ndị m nyere iwu ka ha zụọ ndị m Izrel, sị, “Gịnị mere unu ewubereghị m ụlọ sida?” ’ \pm \v 8 “Ma ugbu a, gwa Devid bụ ohu m, sị, ‘Otu a ka \nd Onyenwe anyị\nd*, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: Mụ onwe m sitere nʼọhịa ebe ịta nri nke ụmụ anụ ụlọ, sikwa nʼebe ị na-azụ igwe ewu na atụrụ kpọpụta gị. Mee gị onye na-achị ndị m Izrel. \v 9 Anọnyekwara m gị nʼebe ọbụla ị gara, kpochapụ ndị iro gị niile site nʼihu gị. Ugbu a, aga m eme ka aha gị dị ukwuu, dịka aha ndị ikom dịkarịsịrị ukwuu nʼụwa. \v 10 Aga m ahọpụta otu ebe nʼihi ndị m Izrel, kụkwa ha dịka osisi ka ha biri nʼebe obibi nke aka ha; ka ha ghara ị bụkwa ndị a na-esogbu ọzọ. Ndị ajọ mmadụ agaghị emegbukwa ha dịka ha mere na mbụ, \v 11 dịka ha na-emekwa siterị na mgbe m họpụtara ndị ndu nye ndị m Izrel. Aga m enyekwa gị ezumike site nʼebe ndị iro gị niile nọ. \pm “ ‘\nd Onyenwe anyị\nd* na-ekwupụtara gị, na \nd Onyenwe anyị\nd* ya onwe ya, ga-eguzobere gị ụlọ. \v 12 Mgbe ụbọchị gị nʼụwa zuru, mgbe i ga-esoro nna nna gị ha dinaa nʼọnwụ, aga m eme ka otu mkpụrụ gị bilie nọchie ọnọdụ gị, onye bụ anụ ahụ na ọbara gị, aga m emekwa ka alaeze ya guzosie ike. \v 13 Ọ bụ ya ga-ewuru m ụlọ. Aga m eme ka ocheeze nke alaeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.\f + \fr 7:13 \fr*\ft \+xt 7:16\+xt*\ft*\f* \v 14 Mụ onwe m ga-abụrụ ya nna. Ya onwe ya ga-abụkwara m nwa. Ọ bụrụ na o jehie, aga m eji mkpanaka mmadụ taa ya ahụhụ. Werekwa ihe otiti si nʼaka ndị mmadụ dụọ ya ọdụ. \v 15 Ma agaghị ewezuga ịhụnanya m site nʼebe ọ nọ, dịka m si wezuga ya site nʼebe Sọl nọ, bụ onye m wezugara site nʼihu gị. \v 16 Ụlọ gị na alaeze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi nʼihu m. A ga-eme ka ocheeze gị bụrụ ihe guzosiri ike ruo mgbe ebighị ebi.’ ” \p \v 17 Netan ziri Devid ozi dịka okwu niile nke ọhụ ahụ si dị. \s1 Ekpere Devid \p \v 18 Mgbe ahụ, eze Devid banyere nọdụ ala nʼihu \nd Onyenwe anyị\nd*, sị: \pm “Onye ka m bụ, Onye kachasị ihe niile elu, bụ \nd Onyenwe anyị\nd*, gịnịkwa ka ezinaụlọ m bụ, na ị mere ka m bịaruo nʼogogo ha otu a? \v 19 Onye kachasị ihe niile elu, bụ \nd Onyenwe anyị\nd*, dịka a ga-asị na nke a bụ ihe dị nta nʼanya gị. Ugbu a, i kwuola banyere ọdịnihu nke ụlọ ohu gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ \nd Onyenwe anyị\nd*, nke a bụkwa ụkpụrụ metụtara mmadụ efu. \pm \v 20 “Ma gịnị ọzọ ka Devid ga-agwa gị? O, Onye kachasị ihe niile elu, bụ \nd Onyenwe anyị\nd*. Nʼihi na ị maara ohu gị nke ọma. \v 21 Nʼihi okwu gị na dịka ọchịchọ obi gị si dị, i meela ihe a dị ukwuu, meekwa ka ohu gị mata ha. \pm \v 22 “Onye kachasị ihe niile elu, bụ \nd Onyenwe anyị\nd*, lee ka i si dị ukwuu! Ọ dịghị onye dịka gị. Ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ọ bụghị gị, dịka anyị nụrụ ya na ntị anyị. \v 23 Olee ndị dịka ndị gị, bụ Izrel, bụ otu mba nʼelu ụwa nke Chineke gara ịgbapụta dịka otu ndị nye onwe ya, na iji mere onwe ya aha, rụọkwa ọrụ ịtụnanya dị egwu dịkwa ukwuu nʼihi ha, site nʼịchụpụ mba dị iche iche na chi niile ha site nʼihu ndị gị, bụ ndị ị gbapụtara site nʼIjipt? \v 24 I meela ka ndị gị Izrel guzosie ike, dịka ndị nke gị ruo mgbe ebighị ebi. Ma gị onwe gị kwa, \nd Onyenwe anyị\nd*, abụrụla Chineke ha. \pm \v 25 “Ugbu a, \nd Onyenwe anyị\nd* Chineke, debe nkwa a nke i kwere banyere ohu gị na ụlọ ya ka ọ dịrị ruo mgbe ebighị ebi. Mezukwaa ihe niile dịka nkwa gị si dị \v 26 Ka aha gị bụrụ ihe dị ukwuu ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-asị, ‘\nd Onyenwe anyị\nd*, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke na-achị Izrel’ A ga-emekwa ka ụlọ ohu gị bụ Devid guzosie ike nʼanya gị. \pm \v 27 “O \nd Onyenwe anyị\nd*, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke Izrel, nʼihi na ị kpugheerela ohu gị ihe a, na-asị, ‘Aga m ewuru gị ụlọ.’ Ya mere, ohu gị ji nwee obi ike ikpere gị ekpere a. \v 28 O, Onye kachasị ihe niile elu, bụ \nd Onyenwe anyị\nd*, ị bụ Chineke nʼezie. Okwu gị kwesiri ntụkwasị obi.\f + \fr 7:28 \fr*\ft \+xt Ọpụ 34:8; Jos 21:45; Jọn 17:17\+xt*\ft*\f* I kweekwala ohu gị nkwa ihe ọma ndị a. \v 29 Ugbu a biko, ka ọ masị gị ịgọzi ụlọ ohu gị, ka ọ dịgide nʼihu gị ruo mgbe ebighị ebi. Nʼihi na gị, o Onye kachasị ihe niile elu, bụ \nd Onyenwe anyị\nd* ekwuola ya, sitekwa na ngọzị gị, ụlọ ohu gị ga-abụkwa ihe a gọziri agọzi ruo mgbe ebighị ebi.” \c 8 \s1 Mmeri nʼagha nke Devid meriri \p \v 1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, Devid meriri ndị Filistia. Mee ka ha nọdụ nʼokpuru ọchịchị ya. Ọ naara obodo Meteg-Amaa site nʼọchịchị ndị Filistia. \p \v 2 Devid merikwara ndị Moab.\f + \fr 8:2 \fr*\ft Ndị Moab bụ ndị agbụrụ Lọt \+xt Jen 19:37\+xt*, ha bichiri oke ala ndị Izrel nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Nwụrụ anwụ. Sọl lụgburu ha nʼoge gara aga. \+xt 1Sa 14:47\+xt* Devid zigara ndị ezinaụlọ ya na nke ndị ikwu ya nʼala Moab, mgbe ọ gbara ọsọ ndụ site nʼaka Sọl. \+xt 1Sa 22:3-4\+xt* Agbụrụ nna nna ochie Devid sitekwara nʼala Moab. \+xt Rut 1:22; 4:22\+xt*\ft*\f* O mere ka ha dinaa nʼala. O jikwa ụdọ ọtụtụ tụa ha. Ọtụtụ abụọ ọbụla nʼime ha ka egburu. Ọtụtụ nke atọ ka a hapụrụ ka ha dịrị ndụ. Ya mere, ndị Moab ghọrọ ndị ohu Devid, na-ebutakwara ya ụtụ kwa afọ ọbụla. \p \v 3 Devid merikwara Hadadeza nwa Rehob, eze Zoba. Mgbe ọ gara inweghachita ogidi e jiri mara ya, nʼakụkụ osimiri Yufretis. \v 4 Devid nwudere otu puku ịnyịnya ya na-adọkpụ ụgbọ agha, puku ndị agha asaa ndị na-agba ụgbọ agha, tinyere ndị agha ji ụkwụ eje dị iri puku abụọ. O bipụrụ akwara ụkwụ ịnyịnya ndị ahụ niile ọ dọtara nʼagha, ma hapụ naanị narị ịnyịnya. \p \v 5 Mgbe ndị Aram nke Damaskọs bịara inyere Hadadeza eze Zoba aka, Devid gburu iri puku ndị agha abụọ na abụọ nʼime ha. \v 6 O wuru ogige ndị agha nʼalaeze ndị Aram nke Damaskọs. Ndị Aram ghọrọ ndị ohu Devid, na-ewetakwa ụtụ ịnata ihuọma. \nd Onyenwe anyị\nd* nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara. \p \v 7 Devid chịkọtara ọta ọlaedo ndịisi agha Hadadeza ji lụọ agha webata ha na Jerusalem. \v 8 Site na Teba\f + \fr 8:8 \fr*\ft Ma ọ bụkwanụ, \ft*\fqa Beta\fqa*\f* nakwa Beirotai, bụ obodo Hadadeza na-achị. Eze Devid weere ọtụtụ bronz dị ukwuu. \p \v 9 Mgbe Tou, eze Hamat, nụrụ na Devid emeriela ndị agha Hadadeza niile, \v 10 o zipụrụ Joram, nwa ya nwoke, ka ọ gaa kelee Devid, nʼihi mmeri o meriri Hadadeza nʼagha, bụ onye ya na Tou nọ nʼagha. Joram ji ọtụtụ akụrụngwa nke ọlaọcha, nke ọlaedo na nke bronz bịa. \p \v 11 Eze Devid doro akụrụngwa ndị a niile nsọ nye \nd Onyenwe anyị\nd*, dịka o si mee ọlaọcha na ọlaedo si na mba niile ndị ọ lụgburu. \v 12 Mba ndị a bụ: Edọm, Moab, ndị Amọn, ndị Filistia na Amalek. O dokwara nsọ nye \nd Onyenwe anyị\nd* ihe ọ kwatara nʼagha site nʼaka Hadadeza nwa Rehob, bụ eze Zoba. \p \v 13 Devid meere onwe ya aha, mgbe o si nʼitigbu puku ndị ikom Edọm iri na asatọ na Ndagwurugwu Nnu lọghachite. \p \v 14 O wuru ogige ndị agha nʼala Edọm niile, ndị Edọm niile ghọrọ ndị na-ejere Devid ozi. \nd Onyenwe anyị\nd* nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara. \s1 Ndị na-ejere Devid ozi \p \v 15 Devid chịrị ndị Izrel niile, na-emere ndị ya ihe dị mma na ihe ziri ezi. O mesokwaghị onye ọbụla mmeso ọjọọ. \v 16 Onyeisi ndị agha ya bụ Joab\f + \fr 8:16 \fr*\ft Joab bụ nwa nwanne nwanyị Devid.\ft*\f* nwa Zeruaya; ode akwụkwọ obodo bụ Jehoshafat, nwa Ahilud. \v 17 Zadọk\f + \fr 8:17 \fr*\ft Zadọk bụ nwa nwa Elieza, onye nchụaja, \+xt 2Ih 24:3\+xt* nke nọgidere nʼarụ ọrụ ya nʼikwesị ntụkwasị obi nye Devid. Ọ bụ ya tere Solomọn mmanụ ịbụ eze nʼọnọdụ Devid. \+xt 1Ez 1:32-35; 1Ih 23:1; 29:22\+xt*\ft*\f* nwa Ahitub, na Ahimelek nwa Abịata, bụ ndị nchụaja; Seraya bụ ode akwụkwọ eze. \v 18 Benaya, nwa Jehoiada, bụ onyeisi ndị Keret na Pelet.\f + \fr 8:18 \fr*\ft Ndị Keret bụ ndị si obodo Kriit, ebe ndị Pelet si nʼobodo Filistia. Ha bụ ndị agha e goro ego na-eche eze nche, gụọ akwụkwọ \+xt 1Ih 18:17\+xt*\ft*\f* Ụmụ ndị ikom Devid bụkwa ndị nchụaja. \c 9 \s1 Devid na Mefiboshet \p \v 1 Otu ụbọchị, Devid jụrụ ajụjụ sị, “O nwere onye fọdụrụ ndụ nʼezinaụlọ Sọl? Achọrọ m igosi onye ahụ obi ebere nʼihi Jonatan.” \p \v 2 Ọ nụrụ ihe banyere otu nwoke aha ya bụ Ziba, onye bụ otu nʼime ndị ohu Sọl. O ziri ozi ka a kpọọ ya. Mgbe ọ bịara nʼihu Devid, eze jụrụ ya sị, “Ọ bụ gị bụ Ziba?” \p Ọ zara sị, “E, onyenwe m, ọ bụ m ohu gị.” \p \v 3 Eze jụrụ ya sị, “Ọ dị onye fọdụrụ ndụ nʼezinaụlọ Sọl? Ọ bụrụ na ọ dị onye fọdụrụ, achọrọ m igosi ya ụdị obiọma Chineke na-egosi.” \p Ziba zara ya sị, “Otu nwa nwoke Jonatan, nke dara ngwụrọ nọ ndụ.” \p \v 4 Eze jụrụ, “Ebee ka ọ nọ?” \p Ziba zaghachiri, “Ọ nọ na Lo Deba, nʼụlọ Makia, nwa Amiel.” \p \v 5 Ya mere eze Devid ziri ka e site nʼobodo Lo Deba, nʼụlọ Makia nwa Amiel kpọta ya. \p \v 6 Mgbe Mefiboshet nwa Jonatan, nwa Sọl, bịara nʼebe Devid nọ, o hulatara isi, kpọọrọ ya isiala, nʼọnọdụ nsọpụrụ. \p Mgbe ahụ, Devid kpọrọ ya aha sị, “Mefiboshet,” \p Mefiboshet zara sị ya, “A bụ m ohu gị.” \p \v 7 Ma Devid sịrị ya, “Atụla egwu, nʼezie, aga m egosi gị obiọma nʼihi nna gị Jonatan. Aga m enyeghachi gị ala niile nna nna gị Sọl nwere. Ma ị ga-eso soro m na-eri nri na tebul m oge niile.” \p \v 8 Mefiboshet dara nʼala nʼihu eze sị, “Eze, onye ka m bụ i ji egosi nkịta nwụrụ anwụ dịka m obi ebere?” \p \v 9 Eze kpọrọ Ziba ohu Sọl ahụ sị ya, “Enyeghachila m nwa nwa nna gị ukwu ihe niile Sọl na ụlọ ya nwere. \v 10 Gị na ụmụ gị ndị ikom na ndị ozi gị ga-arụ ọrụ nʼubi ya ịrụpụta nri. Ma Mefiboshet, nwa nwa nna gị ukwu ga na-eri ihe na tebul m.” Ziba, nwere ụmụ ndị ikom iri na ise, na iri ndị ozi abụọ. \p \v 11 Ọ sịrị eze, “Onyenwe m, ohu gị ga-eme ihe niile eze nyere m nʼiwu.” Site nʼoge ahụ, Mefiboshet riri nri na tebul\f + \fr 9:11 \fr*\ft Maọbụ, \ft*\fqa okpokoro iri ihe\fqa*\f* Devid dịka ọ bụ otu nʼime ụmụ ndị ikom eze. \p \v 12 Mefiboshet nwekwara otu nwa nwoke aha ya bụ Mika. Ziba na ndị niile bi nʼụlọ ya niile ghọrọ ndị ohu Mefiboshet. \v 13 Ma Mefiboshet biri na Jerusalem nʼihi na ọ bụ na tebul eze ka ọ na-eri nri mgbe niile. Ọ bụ onye dara ngwụrọ nʼụkwụ ya abụọ. \c 10 \s1 Devid emerie ndị Amọn \p \v 1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, eze ndị Amọn\f + \fr 10:1 \fr*\ft Ndị Amọn bụ mba na-ebi nʼọzara, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke osimiri Jọdan.\ft*\f* nwụrụ. Hanọn nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. \v 2 Mgbe ahụ, Devid chere sị, “Aga m egosi Hanọn nwa Nahash obi ebere dịka nna ya si gosi m obi ebere.” Ya mere, Devid zipụrụ ndị ozi ka ha gaa kasịe ya obi nʼihi ọnwụ nna ya. \p Mgbe ndị ikom Devid rutere nʼala ndị Amọn, \v 3 ndịisi ala Amọn sịrị Hanọn bụ onyenwe ha, “Ị na-eche na Devid na-akwanyere nna gị ụgwụ site na izite ndị ozi ya ka ha bịa kasịe gị obi? Ọ bụ na Devid eziteghị ha ịbịakwute gị, naanị ka ha bịa mee nledo nʼobodo a, nyochapụta ya ma kwatuo ya?” \v 4 Nʼihi nke a, Hanọn jidere ndị ozi Devid nʼike, kpụchapụ otu mpaghara afụọnụ nwoke ọbụla, bipụkwa uwe mwụda ha nʼetiti ike ha, zilaga ha. \p \v 5 Mgbe a gwara Devid ihe mere, o zipụrụ ndị ozi ka ha gaa zute ndị ikom ahụ, nʼihi na e mere ha ihe ihere nʼebe ọ dị ukwuu. Eze sịrị, “Nọdụnụ na Jeriko ruo mgbe afụọnụ unu tolitere, mgbe ahụ unu ga-alọta.” \p \v 6 Ma mgbe ndị Amọn chọpụtara na ha abụrụla ihe ịsọ oyi nʼebe Devid nọ, ha gara goo iri puku ndị agha abụọ ji ụkwụ eje site nʼAram, Bet-Rehob nakwa Zoba. Ha gokwara eze Maaka ya na puku ndị ikom, tinyekwara iri puku ndị ikom na puku abụọ ọzọ site nʼala Tob. \p \v 7 Mgbe Devid nụrụ nke a, o zipụrụ Joab na ndị agha ya niile bụ dike na dimkpa nʼagha. \v 8 Ndị Amọn pụtara doo onwe ha nʼusoro ibu agha, nʼọnụ ụzọ ama nke obodo ha. Ma ndị Aram, ndị si Zoba na Rehob, na ndị ikom Tob na Maaka, nọpụrụ onwe ha na mbara ala. \p \v 9 Mgbe Joab hụrụ na agha dị megide ya nʼihu na azụ, ọ họpụtara ụfọdụ ndị ọkachamara site nʼetiti ndị agha Izrel, doo ha nʼusoro izute ndị Aram. \v 10 O tinyere ndị ikom fọdụrụ nʼokpuru ọchịchị Abishai, nwanne ya, zipụkwa ha izute ndị Amọn nʼagha. \v 11 Joab sịrị, “Ọ bụrụ na ndị agha Aram akarịa m ike, pụta bịa nyere m aka; ma ọ bụrụkwanụ na ndị Amọn akarịa gị ike, aga m apụta bịa napụta gị. \v 12 Nwee obi ike, ka anyị lụọ ọgụ a dịka ndị dị ike, nʼihi ndị anyị, na obodo niile nke Chineke anyị. Ka \nd Onyenwe anyị\nd* meekwa ihe dị mma nʼanya ya.” \p \v 13 Mgbe ahụ, Joab na ndị agha so ya bịara nso ibuso ndị Aram agha, ha sitere nʼihu ha gbapụ ọsọ. \v 14 Mgbe ndị Amọn hụrụ ka ndị Aram na-agbapụ ọsọ, ha onwe ha gbakwara ọsọ nʼihu Abishai, gbaba nʼime obodo. Ya mere, Joab sitere nʼịlụso ndị Amọn agha lọghachi, bịa na Jerusalem. \p \v 15 Mgbe ndị Aram hụrụ na ndị Izrel tigburu ha; ha lara, chịkọtaa onwe ha ọnụ. \v 16 Hadadeza mere ka a kpọta ndị Aram site nʼofe ọzọ nke Osimiri Yufretis. Ha gara Hilam, ha na ọchịagha ndị agha Hadadeza, a na-akpọ Shobak, onye na-edu ha. \p \v 17 Mgbe a gwara Devid banyere nke a, ọ chịkọtara ndị Izrel niile, gafee Jọdan, jeruo Hilam. Ndị Aram doro usoro agha ha izute Devid, lụsokwaa ya agha. \v 18 Ma ha sitere nʼihu ndị Izrel gbaa ọsọ, Devid gburu narị ndị ikom asaa na-anya ụgbọ agha nke ịnyịnya na-adọkpụ. Gbukwaa iri puku ndị agha anọ na-eji ụkwụ eje. O tidara Shobak, bụ ọchịagha ndị agha ha, ọ nwụọ nʼebe ahụ. \v 19 Mgbe ndị eze niile nọ nʼokpuru ọchịchị Hadadeza hụrụ na Izrel etigbuola ha, ha mere ka ha na ndị Izrel dịrị nʼudo, bụrụkwa ndị nọ nʼokpuru ha. \p Ya mere, ndị Aram tụrụ egwu inyere ụmụ Amọn aka ọzọ. \c 11 \s1 Devid na Batsheba \p \v 1 Nʼoge ọkọchị, mgbe ndị eze na-apụ ibu agha, Devid zipụrụ Joab ọchịagha ya, na ndị agha Izrel. Ha bibiri ndị Amọn, nọchibidokwa Raba. Ma Devid nọdụrụ na Jerusalem. \p \v 2 Nʼotu uhuruchi, Devid sitere nʼihe ndina ya bilie, gagharịa nʼelu ụlọeze ya. Ọ sitere nʼelu ụlọ ahụ hụ otu nwanyị na-asa ahụ. Nwanyị ahụ mara mma nke ukwu nʼile anya. \v 3 Devid ziri ozi ka a jụta onye nwanyị ahụ bụ, ma a gwara ya na ọ bụ Batsheba, nwa Eliam, nwunye Ụraya onye Het. \v 4 Devid ziri ka a gaa kpọta ya. Mgbe ọ bịara, ya na Devid dinara. (Ka ọ ghụchasịrị onwe ya site nʼadịghị ọcha ya nke ọnwa ahụ.) Ọ laghachiri nʼụlọ ya. \v 5 Nwanyị a mechara dị ime, bịa ziga ozi ka agwa Devid. Ọ sịrị, “Adị m ime.” \p \v 6 Mgbe Devid nụrụ ya, o zigaara Joab ozi sị ya, “Zitere m Ụraya, onye Het.” \v 7 Mgbe Ụraya bịakwutere ya, Devid jụrụ ya otu Joab mere, na otu ndị agha Izrel dị na otu agha si aga. \v 8 Devid sịrị Ụraya, “Laa nʼụlọ gị gaa saa ụkwụ gị.” Ụraya si nʼụlọeze pụọ. E zipụkwara onyinye nke ndị na-ejere eze ozi ji sochie ya azụ. \v 9 Ma Ụraya agaghị nʼụlọ ya. Kama o so ndị na-ejere eze ozi dinaa nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọeze. \p \v 10 Mgbe a gwara Devid na Ụraya alaghị nʼụlọ ya, Devid kpọrọ Ụraya, jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụghị ije dị anya ka i si lọta? Gịnị mere ị larughị nʼụlọ gị?” \p \v 11 Ụraya zara Devid, “Lee, igbe ọgbụgba ndụ \nd Onyenwe anyị\nd*, na Izrel na Juda niile nọ nʼụlọ ikwu. Nna m ukwu Joab na ndị agha nna m ukwu nọ nʼọhịa. M ga-esi aṅaa laa nʼụlọ m, iri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ na isoro nwunye m dinaa? Ana m aṅụ iyi na agaghị m eme ihe dị otu a.” \p \v 12 Devid gwara ya sị, “Ọ dị mma, nọdụ nʼebe a taa, echi ị ga-alaghachikwa nʼọgbọ agha.” Ụraya kwenyere nọdụ na Jerusalem ụbọchị ahụ, nakwa ụbọchị na-eso ya. \v 13 Emesịa, Devid kpọrọ ya oriri, meekwa ya ka ọ ṅụbiga mmanya oke, ma nke a emeghị ka ọ laa nʼụlọ ya nʼabalị ahụ, kama ọ bụkwa nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọeze ka o dinara nʼetiti ndị na-ejere eze ozi. \p \v 14 Nʼụtụtụ echi ya, Devid degaara Joab akwụkwọ, zighachịkwa ya site nʼaka Ụraya. \v 15 Ihe ọ dere nʼakwụkwọ ahụ bụ nke a, “Tinye Ụraya nʼihu agha ebe ọgụ siri ike. Mgbe ndị iro na-apụkwute unu, laanụ azụ, ma hapụnụ Ụraya nʼihu ọgụ ka ndị iro gbuo ya.” \p \v 16 Ya mere, mgbe Joab gbara obodo ahụ gburugburu, o tinyere Ụraya nʼebe ọ maara na ndị dị ike nʼetiti ndị iro ha nọ. \v 17 Ndị ikom obodo ahụ pụtara buso Joab agha. Ụfọdụ ndị agha Devid nwụrụ. Ụraya onye Het, so na ndị egburu. \p \v 18 Mgbe ahụ, Joab zigara ozi gwa Devid otu agha si na-aga, \v 19 Ọ gwara onyeozi ahụ sị, “Mgbe ị gwachara eze akụkọ ihe gbasara otu agha si gaa \v 20 iwe nwere ike iwe eze nke ukwu, na o nwere ike jụọ gị sị, ‘Gịnị mere unu ji gaa mgbidi obodo ahụ nso ịlụ agha? Ọ bụ na unu amaghị na a ga-esi nʼelu mgbidi ahụ gbaa àkụ? \v 21 Onye gburu Abimelek nwa Jeru-Beshet? Ọ bụghị na mgbidi obodo ka nwanyị nọ tụdaa aka nkume dagburu ya na Tebez? Gịnị mere unu ji jeruo mgbidi ahụ nso?’ Ọ bụrụ na ọ jụọ gị ihe dị otu a, gwa ya, ‘Ohu gị bụ Ụraya, onye Het anwụọkwala.’ ” \p \v 22 Onyeozi ahụ biliri ije, mgbe o rutere, ọ gwara Devid ihe niile Joab ziri ya ka o zie. \v 23 Onyeozi ahụ sịrị Devid, “Ndị ikom ahụ ji ike karịrị anyị, ha pụtara ị buso anyị agha na mbara ma anyị chụghachiri ha azụ. Chụruo ha nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ. \v 24 Mgbe ahụ, ndị ọgba ụta sitere nʼelu mgbidi malite ịgba ndị ohu gị àkụ, ụfọdụ nʼime ndị ikom eze nwụrụ. Ohu gị Ụraya, onye Het, sokwa na ndị nwụrụ.” \p \v 25 Devid sịrị onyeozi ahụ, “Otu a ka ị ga-agwa Joab, ‘Ka ihe a ghara iwute gị nʼobi, nʼihi na mma agha na-egbu otu onye dịka o si egbu onye ọzọ. Lụsie ọgụ ike, lụgbukwaa obodo ahụ.’ Jiri okwu ndị a gbaa ya ume.” \p \v 26 Mgbe nwunye Ụraya nụrụ na di ya anwụọla, o ruru ụjụ nʼihi ya. \v 27 Mgbe oge iru ụjụ ya gabigara, Devid ziri ka a kpọta ya nʼụlọeze. Ọ ghọkwara nwunye ya. Mụọra ya nwa nwoke. Ma ihe Devid mere jọrọ njọ nʼanya \nd Onyenwe anyị\nd*. \c 12 \s1 Netan abaara Devid mba \p \v 1 Ya mere, \nd Onyenwe anyị\nd* zigara Netan ka o jekwuru Devid. Mgbe Netan bịakwutere Devid, ọ kọọrọ ya akụkọ a, “E nwere ndị ikom abụọ bi nʼotu obodo, otu bụ ọgaranya ma nke ọzọ bụ ogbenye. \v 2 Onye ọgaranya a nwere ọtụtụ igwe atụrụ na igwe ehi. \v 3 Ma nwoke ogbenye ahụ enweghị ihe ọbụla karịa otu nwa nne atụrụ nta nke ọ zụtara. Ọ zụlitere ya, o tolite nʼetiti ya na ụmụ ya. Ọ na-eri nri site na ihe oriri ya, na-aṅụ mmiri site nʼiko mmiri ya, nʼobi ya ka ọ na-edinakwa. Ọ nọ ọnọdụ dịka nwa nwanyị nye ya. \p \v 4 “Otu ụbọchị, onye ọbịa bịara nʼụlọ onye ọgaranya ahụ. Ma kama ọgaranya ahụ ga-ewere otu atụrụ maọbụ ehi nke ya siere onye ọbịa ya nri, ọ gara were nne atụrụ ogbenye ahụ, gbuo ya, jiri ya siere ọbịa ya nri.” \p \v 5 Devid were oke iwe megide nwoke ahụ, ọ sịrị Netan, “Ana m aṅụ iyi nʼaha \nd Onyenwe anyị\nd* dị ndụ na onye mere ihe dị otu a aghaghị ịnwụ! \v 6 Ọ ga-ejikwa nwa atụrụ okpukpu anọ kwụghachi ogbenye ahụ ụgwọ otu atụrụ ahụ o weere, nʼihi na onye ọgaranya ahụ egosighị na o nwere obi ebere ọbụla.” \p \v 7 Mgbe ahụ, Netan sịrị Devid, “Ọ bụ gị bụ nwoke ahụ! Otu a ka \nd Onyenwe anyị\nd*, Chineke Izrel sịrị, ‘Mụ onwe m tere gị mmanụ ịbụ eze Izrel, mụ onwe m napụtakwara gị site nʼaka Sọl. \v 8 Enyere m gị ụlọ nna gị ukwu, nyefekwa ndị inyom nna gị ukwu nʼaka gị, na alaeze Izrel na Juda, ka ha bụrụ nke gị. Ma ọ bụrụ na nke a ezughị, agaara m atụkwasịrị gị ihe ndị a niile okpukpu okpukpu. \v 9 Gịnị mere i ji lelịa okwu \nd Onyenwe anyị\nd* anya, mee ihe a jọgburu onwe ya? Nʼihi na i jirila mma agha gbuo Ụraya onye Het, zurukwa nwunye ya nʼohi. Ọ bụkwa mma agha ndị Amọn ka i ji gbuo ya. \v 10 Ya mere, nʼihi ihe a i mere, mma agha agaghị esi nʼezinaụlọ gị pụọ, nʼihi na i ledara m anya kpọrọ nwunye Ụraya onye Het ka ọ bụrụ nwunye gị.’ \p \v 11 “Ihe a ka \nd Onyenwe anyị\nd* kwuru, ‘Aga m eme ka ihe ọjọọ si nʼezinaụlọ gị bilie megide gị. Nʼihu gị ka m ga-eduru ndị nwunye gị dunye otu onye dị gị nnọọ nso, ya na ha ga-edinakọ nʼehihie ọcha, nʼihu ndị Izrel niile. \v 12 I mere mmehie gị na nzuzo, ma aga m eme nke a na mbara, nʼihu Izrel niile.’ ” \p \v 13 Mgbe ahụ, Devid sịrị Netan, “Emehiela m megide \nd Onyenwe anyị\nd*.” \p Netan zara sị ya, “\nd Onyenwe anyị\nd* nʼonwe ya agbagharakwala gị mmehie gị, ị gaghị anwụ. \v 14 Ma nʼihi na i meela ka ndị iro \nd Onyenwe anyị\nd* nwe ohere ikwulu na ilelị ya anya, nwa nwoke ahụ amụụrụ gị ga-anwụ.” \p \v 15 Mgbe Netan lara, \nd Onyenwe anyị\nd* mere ka nwantakịrị ahụ nwunye Ụraya mụụrụ Devid daa ọrịa. \v 16 Devid rịọrọ Chineke arịrịọ banyere nwantakịrị ahụ. O buru ọnụ, dinaa nʼala efu abalị ahụ niile nʼihu \nd Onyenwe anyị\nd*. \v 17 Emesịa, ndị okenye ụlọ ya rịọrọ Devid ka o bilie rie nri, ma ọ jụrụ iri ihe ọbụla. \p \v 18 Nʼụbọchị nke asaa, nwantakịrị ahụ nwụrụ. Mgbe ahụ, ndị na-ejere Devid ozi tụrụ egwu otu ha ga-esi gwa ya na nwantakịrị ahụ anwụọla. Nʼihi na ha kwuru nʼime onwe ha sị, “Mgbe nwantakịrị ahụ ka dị ndụ, anyị gwara ya okwu ma o geghị anyị ntị. Anyị ga-esi aṅaa gwa ya na nwantakịrị ahụ anwụọla? O nwere ike imerụ onwe ya ahụ.” \p \v 19 Mgbe Devid hụrụ na ha na-ekwurịta okwu nʼetiti onwe ha na nzuzo; ọ matara na nwa ahụ anwụọla. Ọ jụrụ ha sị, “Nwata ahụ ọ nwụọla?” \p Ha zara sị ya, “E, ọ nwụọla!” \p \v 20 Mgbe ahụ, Devid sitere nʼala ebe o dina, bilie, saa ahụ, gbanwee uwe ya, baa nʼụlọ \nd Onyenwe anyị\nd*, kpọọrọ ya isiala. Ọ lọghachiri nʼụlọ ya nye iwu ka e wetara ya ihe oriri. O rikwara nri. \p \v 21 O juru ndị na-ejere ya ozi anya, nʼihi ya ha jụrụ ya ajụjụ si, “Gịnị mere i ji eme omume dị otu a? Mgbe nwantakịrị ahụ nọ ndụ, i buru ọnụ, kwaakwa akwa, ma ugbu a, nwa ahụ anwụọla, ị kwụsịla iru ụjụ. Ugbu a, ị biliela na-erikwa nri.” \p \v 22 Devid zara ha sị, “Eburu m ọnụ, kwaakwa akwa mgbe nwa ahụ nọ ndụ, nʼihi na ekwuru m sị, ‘ma eleghị anya, \nd Onyenwe anyị\nd* ga-enwe ọmịiko nʼebe m nọ mee ka nwa ahụ dị ndụ.’ \v 23 Ma ugbu a ọ nwụrụ, gịnịkwa ka m nwere dịka uru ibu ọnụ ọzọ? M pụrụ ime ka ọ dị ndụ ọzọ? Aga m alakwuru ya, ma ọ gaghị alaghachikwutekwa m.” \p \v 24 Devid kasiri Batsheba nwunye ya obi, emesịa, mgbe ya na ya dinakọrọ, ọ tụụrụ ime ọzọ mụọ nwa nwoke onye ha kpọrọ aha ya Solomọn. Ma \nd Onyenwe anyị\nd* hụrụ nwantakịrị ahụ nʼanya. \v 25 O zigara ozi site nʼaka Netan, onye amụma, ka a gụọ ya Jedidaya nʼihi \nd Onyenwe anyị\nd*. \p \v 26 Nʼoge a, Joab busoro Raba obodo ndị Amọn agha dọta isi obodo eze ha nʼagha. \v 27 Joab zigara Devid ozi sị ya, “Ebuola m agha megide Raba dọta isi mmiri ọṅụṅụ ya nʼagha. \v 28 Ugbu a chịkọtaa ndị agha fọdụrụ bịa lụpụchaa agha a, ka ị dọta obodo a nʼagha. Ọ bụrụ na i meghị otu a, aga m adọta obodo a nʼagha, a ga-akpọkwasịkwa ya aha m.” \p \v 29 Nʼihi nke a, Devid duuru ndị agha Izrel jeruo Raba, buso ya agha, meriekwa ya. \v 30 Devid kpupuru okpueze nke dị nʼisi eze ha, e kpunye ya nʼisi nke ya onwe ya. Ịdị arọ nke okpueze ahụ ruru kilogram ọlaedo iri atọ na anọ, nke e ji nkume ndị dị oke ọnụahịa chọọ mma. Devid sitekwara nʼobodo ahụ kwakọrọ ọtụtụ ihe nkwata nʼagha. \v 31 Ọ kpọpụtara ndị nọ nʼebe ahụ, manye ha nʼịrụ ọrụ nke e ji mma nkwọ e ji awa osisi, na igwe e ji egwu ala na anyụike nʼarụ. O mere ka ha rụọ ọrụ nʼebe a na-akpụ blọk brik. Devid mekwara otu ihe a nʼobodo niile nke ụmụ Amọn. Emesịa, ya na ndị agha ya niile laghachiri na Jerusalem. \c 13 \s1 Amnọn na Tama, na ọnwụ Amnọn \p \v 1 Absalọm nwa Devid nwere otu nwanne nwanyị mara mma, aha ya bụ Tama.\f + \fr 13:1 \fr*\ft Tama bụ nwa nwanyị Maaka, nwa Talmi, eze Geshua \+xt 2Sa 3:3\+xt* Amnọn bụ ọkpara Devid, nke Ahinoam nwunye mbụ ya mụtara. Nʼusoro omenaala, ọ bụ Amnọn kwesiri ịnọchi anya eze ma ọ nwụọ.\ft*\f* Ma Amnọn, otu nʼime ụmụ ndị ikom Devid, hụrụ nwaagbọghọ a nʼanya. \p \v 2 Ma ịhụnanya a Amnọn hụrụ Tama nwanne ya nwanyị mere ya ka ọ daa ọrịa, nʼihi na ọ bụ ihe rara Amnọn ahụ ịchọpụta ụzọ ya na Tama ga-esi nwee mmekọ, ebe ọ bụ na Tama bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke.\f + \fr 13:2 \fr*\ft Ụmụ nwanyị ndị na-alụbeghị di na-ebi naanị ha nʼebe e doziri ha ọnọdụ. Adịghị ekwe ka ha ga leta ndị ikom, ọ bụladị ndị ụmụnna ha, bụ ndị nna ha mụtara.\ft*\f* \p \v 3 Ma Amnọn nwere otu enyi dị aghụghọ, onye aha ya bụ Jonadab, nwa Shimea, nwanne Devid. \v 4 Otu ụbọchị, Jonadab bịakwutere Amnọn jụọ ya sị, “Gịnị mere, gị bụ nwa eze ji na-ata ahụ ụtụtụ niile? Ọ bụ na ị gaghị akọrọ m?” \p Amnọn gwara ya sị, “Ahụrụ m Tama nʼanya, bụ nwanne Absalọm, nwanne m nwoke.” \p \v 5 Jonadab gwara ya sị, “Ọ dị mma. Lee ihe ị ga-eme. Gaa dinaa ala, dịka a ga-asị na ahụ adịghị gị. Mgbe nna gị bịara ileta gị, gwa ya okwu sị ya, ‘Achọrọ m ka nwanne m nwanyị bụ Tama bịa nye m ihe oriri. Achọrọ m ka ọ nọdụ nʼihu m sie nri ahụ, mgbe m na-ele ya anya, ka o jirikwa aka ya nye m nri ahụ.’ ” \p \v 6 Amnọn mere otu a. Mgbe eze bịara ileta ya, Amnọn rịọrọ ya sị, “Biko, ka Tama bịa ebe a gheere m achịcha ole na ole ebe m ga-ahụ ya anya. Ka o jirikwa aka ya dozie ya nʼihu m ka m rie ya.” \p \v 7 Devid kwenyere, zie Tama ka ọ gaa nʼụlọ Amnọn gaa siere ya nri. \v 8 Tama gara nʼụlọ Amnọn, banyekwa nʼime ụlọ ebe o dinaa, ka Amnọn na-ele ya anya mgbe ọ na-agwọgharị ụtụ ọka. Emesịa, Tama gheere ya achịcha mara mma. \v 9 Mgbe o cheziri achịcha ahụ nʼihu Amnọn, Amnọn jụrụ iri ya. \p Ihe o mere mgbe ahụ bụ inye ndị na-ejere ya ozi nọ nʼebe ahụ iwu sị ha niile pụọ ngwangwa. Ha niile pụkwara. \v 10 Mgbe ahụ, Amnọn gwara Tama okwu sị, “Ugbu a, wetara m nri ahụ nʼime ụlọ ndina m, bịa jiri aka gị nye m ya.” Tama bugaara ya achịcha ahụ nʼime ụlọ ebe ihe ndina ya dị. \v 11 Ma mgbe Tama guzo nʼihu ya, Amnọn jidere ya nʼike sị ya, “Bịa, soro m dinaa, nwanne m nwanyị.” \p \v 12 Tama zara sị ya, “Mba! Nwanne m nwoke. Emerụla m. Ihe dị otu a ekwesighị ime nʼala Izrel. Emela ihe ọjọọ dị otu a. \v 13 Olee ihe ga-abụ ọnọdụ m? Oleekwanụ ihe ga-abụ ọnọdụ gị? Olee ebe m ga-agbala izo onwe m nʼihi ihe ihere ga-adịrị m ma i mee ihe dị otu a? Ị ga-adị ka otu nʼime ndị nzuzu ọjọọ dị nʼIzrel. Biko, gwa eze, ọ ga-ekwe ka ị lụọ m.” \v 14 Ma Amnọn egeghị ntị. Ebe ọ bụ na ọ ka Tama ike, o jidere ya dinaa ya nʼike merụọ ya. \p \v 15 Emesịa, Amnọn kpọrọ Tama asị. Nʼezie, ọ kpọrọ ya asị ugbu a karịa ịhụnanya ọ hụrụ ya na mbụ. Ọ gwara Tama okwu sị ya, “Bilie si nʼebe a pụọ ọsịịsọ!” \p \v 16 Ma Tama kwara akwa sị ya, “Mba! Ịjụ m otu a ka njọ karịa ihe ọjọọ i mere m.” \p Ma Amnọn egeghị ya ntị. \v 17 Ọ kpọrọ nwokorobịa na-ejere ya ozi sị ya, “Chụpụ nwanyị a nʼezi, kpachiere m ụzọ nʼazụ.” \v 18 Onyeozi ya chụpụrụ ya nʼezi, kpachie ụzọ nʼazụ ya. Uwe mwụda nwere aka ogologo ka Tama yi, nʼihi na ọ bụ ụdị nke ụmụ ndị inyom eze na-amaghị nwoke na-eyi. \v 19 Tama dọwara uwe\f + \fr 13:19 \fr*\ft \+xt Jos 7:6; 2Sa 1:2; Job 2:12; 42:6\+xt*\ft*\f* mwụda ahụ o yi nʼahụ, werekwa ntụ kpokwasị onwe ya nʼisi, buru aka ya nʼisi na-eti mkpu akwa dịka ọ na-ala. \p \v 20 Nwanne ya nwoke, Absalọm jụrụ ya sị, “Amnọn, nwanne gị nwoke, o dinakwuuru gị? Ma ugbu a, nwanne m, gba nkịtị, nwanne gị nwoke ka ọ bụ. Etinyela ihe a mere nʼobi.” Tama nọrọ dịka onye mmadụ niile jụrụ ajụ nʼụlọ nwanne ya nwoke, bụ Absalọm. \p \v 21 Mgbe eze Devid nụrụ ihe ndị a niile, iwe were ya nke ukwuu. \v 22 Absalọm agwaghị Amnọn okwu ọbụla, maọbụ nke dị mma, maọbụ okwu ọjọọ. Ma ọ kpọrọ Amnọn asị nke ukwuu nʼihi ọnọdụ iweda nʼala o wedara nwanne ya Tama, mee ya ihe ihere. \s1 Absalọm egbuo Amnọn \p \v 23 Mgbe afọ abụọ gasịrị, mgbe ndị na-akpụchara Absalọm ajị ụmụ atụrụ ya nọ na Baal-Hazọ, nʼoke ala Ifrem, ọ kpọkọtara ụmụ ndị ikom eze niile ka ha bịa nʼebe ahụ. \v 24 Absalọm jekwuuru eze sị ya, “Ndị na-akpụcha ajị ụmụ atụrụ ohu gị bịara. Eze na ndịisi ozi ya, ha ga-abịa sonyere m?” \p \v 25 Ma eze zara sị ya, “Mba, nwa m, anyị niile agaghị abịa, anyị ga-abụ ibu dị arọ nye gị.” Nʼagbanyeghị na Absalọm rugidere ya ma o kweghị aga, kama ọ gọziri ya. \p \v 26 Mgbe ahụ, Absalọm rịọrọ nna ya sị, “Ọ dị mma, ọ bụrụ na ị gaghị abịa, ị ga-emekwa ka nwanna m nwoke Amnọn, na ụmụ eze ndị ọzọ bịa?” \p Eze jụrụ ya sị, “Nʼihi gịnị ka Amnọn ga-eji soro gị gaa?” \v 27 Ma Absalọm rụgidere ya, ya mere o zipụrụ Amnọn na ụmụ eze ndị ọzọ ka ha soro ya gaa. \p \v 28 Mgbe ahụ, Absalọm nyere ndị na-ejere ya ozi iwu banyere Amnọn sị, “Cherenụ ruo mgbe mmanya bidoro igbu ya, mgbe m sịkwara unu tigbuo ya, unu atụla egwu, tigbuonụ ya. Ọ bụ m na-ekwu ihe ga-eme nʼebe a. Nweenụ obi ike, meekwanụ ya.” \v 29 Mgbe oge ruru, ndị ozi Absalọm tigburu Amnọn. Mgbe ahụ, ụmụ eze niile biliri makwasị nʼịnyịnya ha gbalaga. \p \v 30 Mgbe ha ka nọ nʼụzọ na-agbaga Jerusalem, ozi eruolarị Devid ntị sị, “Absalọm egbuchaala ụmụ eze niile, ọ dịkwaghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ!” \v 31 Eze biliri ọtọ, dọwaa uwe ya, daa nʼala, gbatịa onwe ya nʼihi obi ọjọọ. Ndị na-ejere ya ozi dọwakwara uwe ha nʼihi egwu na obi ọjọọ. \p \v 32 Ma Jonadab, nwa Shimea, nwanne Devid, sịrị, “Onyenwe m, echekwala na e gburu ụmụ ndị ikom eze niile, kama ọ bụ naanị Amnọn! Nke a bụ ihe Absalọm jikere ime site mgbe Amnọn wakporo nwanne ya nwanyị bụ Tama, dina ya. \v 33 Ma ugbu a, ka onyenwe m bụ eze ghara itinye akụkọ banyere ọnwụ ụmụ ndị ikom eze niile, nʼobi ya. Ọ bụ naanị Amnọn nwụrụ.” \p \v 34 Ma Absalọm gbara ọsọ gbalaga. \p Ọ dịghị anya nwoke na-anọ nʼelu mgbidi Jerusalem na-eche nche, lepụrụ anya hụ ndị mmadụ ka ha si nʼụzọ dị nʼakụkụ ugwu nta na-abịa. Nwoke ahụ gara gwa eze sị ya, “Ahụrụ m ndị si nʼakụkụ Horonaim, nʼakụkụ ugwu na-abịa.” \p \v 35 Jonadab gwara eze sị, “Lee, ọ bụ ụmụ ndị ikom eze na-alọta dịka m kwuru.” \p \v 36 Mgbe ha lọbatara, ha bidoro ịkwa akwa nke ukwuu. Eze na ndị na-ejere ya ozi sokwa kwaa akwa. \p \v 37 Absalọm gbara ọsọ gbakwuru Talmai nwa Amihud, eze Geshua. Ma eze Devid ruru ụjụ nke ukwuu maka ọnwụ Amnọn. \p \v 38 Mgbe Absalọm gbara ọsọ gbaga Geshua, ọ nọrọ nʼebe ahụ afọ atọ. \v 39 Ọ gụrụ eze bụ Devid agụụ ịgakwuru Absalọm, nʼihi ọ kasịela obi maka ọnwụ Amnọn. \c 14 \s1 Absalọm alọghachi Jerusalem \p \v 1 Joab, nwa Zeruaya matara na obi eze dị nʼebe Absalọm nọ. \v 2 Joab zigara ozi na Tekoa, si nʼebe ahụ kpọta otu nwanyị maara ihe. Mgbe nwanyị ahụ bịaruru, Joab gwara ya sị, “Mee onwe gị dịka onye na-eru ụjụ. Yiri akwa mkpe, etekwala mmanụ otite. Kpaa agwa dịka nwanyị nọ nʼiru ụjụ ogologo oge. \v 3 Emesịa, jekwuru eze, gwa ya okwu ndị a m na-agwa gị.” Joab tinyere okwu ndị ahụ nʼọnụ ya. \p \v 4 Mgbe nwanyị ahụ si Tekoa gara na nke eze, ọ dara nʼala kpuo ihu ya nʼala ịsọpụrụ eze. Ọ sịrị, “Biko nyere m aka, gị onye a na-asọpụrụ!” \p \v 5 Eze jụrụ ya ajụjụ sị, “Gịnị bụ mkpa gị?” \p Ọ zara sị, “Abụ m nwanyị isi mkpe, di m anwụọla. \v 6 Enwere m ụmụ ndị ikom abụọ ndị gara lụọ ọgụ nʼọhịa. Mgbe ha na-alụ ọgụ ahụ, o nweghị onye pụtara gboo ha. Nʼihi ya, otu nʼime ha tigburu ibe ya. \v 7 Ma ugbu a, ndị ikwu di m na-esogbu m na-asị ‘Kpọpụta onye ahụ gburu nwanne ya ka anyị gbuo ya nʼihi ndụ nwanne ya o wepụrụ, ka anyị si otu a memilaa onye nke fọdụrụ ga-erita oke ezinaụlọ.’ Ha chọrọ isi otu a menyụọ icheku ọkụ nke fọdụụrụ m, nke bụ na di m agaghị enwezikwa aha maọbụ onye fọdụụrụ ya nʼelu ụwa.” \p \v 8 Eze sịrị nwanyị ahụ, “Laa nʼụlọ gị, aga m ahụ na o nweghị onye metụrụ ya aka.” \p \v 9 Ma nwanyị ahụ si Tekoa sịrị ya, “Ka onyenwe m, bụ eze, gbaghara mụ na ezinaụlọ m, ka ikpe ọmụma ọbụla ghara ịdịrị eze na ocheeze ya.” \p \v 10 Eze zara ya, “Enyela onwe gị nsogbu maka nke ahụ. Ọ bụrụ na onye ọbụla agwa gị okwu ọbụla, kpọtara m ya. Onye dị otu a agaghị enyekwa gị nsogbu ọzọ.” \p \v 11 Mgbe ahụ ọ zara, “Biko, ka eze kpọkuo aha \nd Onyenwe anyị\nd* Chineke ya ka ọ kwụsị onye na-agwa ọchụ, ka ọ ghara igbu onye ọzọ, ka a gharakwa ịla nwa m nwoke nʼiyi.” \p Ọ sịrị, “Dịka \nd Onyenwe anyị\nd* na-adị ndụ,\f + \fr 14:11 \fr*\ft \+xt 1Sa 14:45; 1Ez 1:52; Mat 10:30; Ọrụ 27:34\+xt*\ft*\f* otu agịrị isi agaghị esi nʼisi nwa gị dapụ nʼala.” \p \v 12 Mgbe ahụ, nwanyị ahụ sịrị, “Biko kwere ka ohu gị nwanyị gwa onyenwe m eze otu mkpụrụ okwu ọzọ.” \p Ọ sịrị, “Gaa nʼihu kwuo.” \p \v 13 Nwanyị ahụ sịrị, “Ọ bụ nʼihi gịnị ka ị chere ihe dị otu a megide ndị nke Chineke? Mgbe eze na-ekwu otu a, ọ bụ na ọ dịghị ama onwe ya ikpe, nʼihi na eze a jụla ịkpọghachi nwa ya a chụpụrụ achụpụ? \v 14 Anyị niile ga-anwụ. Anyị dịkwa ka mmiri a wụsara nʼala, nke a na-apụghị ịchịkọtakwa ọzọ. Ma Chineke adịghị anapụ mmadụ ndụ ya, ma ọ na-emeghepụ ụzọ ga-eme ka onye ọ chụpụrụ achụpụ lọghachikwutekwa ya. \p \v 15 “Ma ugbu a, ebe m bịara ịgwa onyenwe m bụ eze, okwu a, nʼihi na ndị mmadụ emenyela m egwu. Ohu gị chere nʼobi ya, ‘Aga m agwa eze okwu; ma eleghị anya, ọ ga-emezuru ohu ya nwanyị ihe ọ rịọrọ. \v 16 Ma eleghị anya eze ga-anapụta ohu ya nwanyị site nʼaka nwoke ahụ na-agbalị ibipụ mụ na nwa m nwoke site nʼihe nketa nke Chineke.’ \p \v 17 “Ugbu a, ohu gị nwanyị na-asị, ‘Ka okwu onyenwe m eze kwuru wetara m izuike, nʼihi onyenwe m eze na-enyochapụta ihe ọma maọbụ ihe ọjọọ dịka mmụọ ozi Chineke. Ka \nd Onyenwe anyị\nd* Chineke gị nọnyere gị.’ ” \p \v 18 Mgbe ahụ, eze gwara nwanyị ahụ okwu sị, “Achọrọ m ka ị gwa m eziokwu nʼajụjụ a m na-aga ịjụ gị.” \p Nwanyị ahụ zara sị, “Ka onyenwe m, bụ eze kwuo ihe dị ya nʼobi.” \p \v 19 Devid jụrụ ya sị, “Aka Joab ọ dị nʼokwu ndị a niile?” \p Nwanyị ahụ zara sị ya, “Dịka ị na-adị ndụ, onyenwe m, bụ eze, ọ dịghị onye ọbụla ga-esi nʼihe onyenwe m bụ eze kwuru, chee ihu nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe. E, ọ bụ ohu gị Joab nyere m iwu ime nke a, ya gwakwara ohu gị nwanyị okwu niile ndị a. \v 20 Ohu gị bụ Joab mere ihe a ka ọ gbanwee otu ọnọdụ ihe dị ugbu a. Onyenwe m nwere amamihe dịka ndị mmụọ ozi Chineke. Ọ maakwara ihe niile na-eme nʼala.” \p \v 21 Eze sịrị Joab, “Ọ dị mma, aga m eme ya. Gaa kpọghachite nwokorobịa ahụ bụ Absalọm.” \p \v 22 Joab dara nʼala kpuo ihu ya nʼala, kpọọ isiala, gọzie eze. Joab sịrị, “Taa ka ohu gị maara na ahụtala m amara nʼihu gị, onyenwe m bụ eze, nʼihi na eze e merela ohu ya ihe ọ rịọrọ.” \p \v 23 Joab biliri gaa Geshua, kpọlata Absalọm na Jerusalem. \v 24 Mgbe ha bịaruru, eze gwara Joab okwu sị, “Gwa ya ka ọ laa nʼụlọ ya. Ọ gaghị abịa nʼihu m, nʼihi na-achọghị m ịhụ ya anya.” Ya mere, Absalọm lara nʼụlọ ya. Ọ hụkwaghị eze anya. \p \v 25 Ọ dịghị nwoke mara mma dịka Absalọm nʼala Izrel niile. Ọ dịkwaghị onye na-adịghị ekwu okwu banyere ịma mma ya. Nʼihi na ntụpọ ọbụla adịghị ya nʼahụ site nʼopi isi ya ruo nʼọbọ ụkwụ ya. \v 26 Mgbe ọbụla ọ kpụchara ntutu isi ya, nʼihi na ọ bụ otu ugboro nʼafọ ka ọ na-akpụcha agịrị isi mgbe o bidoro ịnyị ya arọ. Ọ na-atụ agịrị isi a na-akpụchapụta ya nʼisi, ịdị arọ ya na-eru narị shekel abụọ\f + \fr 14:26 \fr*\ft Nke a bụ kilo abụọ na ụma atọ\ft*\f* ma a tụọ ya nʼihe ọtụtụ eze. \p \v 27 Absalọm mụtara ụmụ ndị ikom atọ, na otu nwanyị, aha ya bụ Tama. Nwaagbọghọ a mara mma nke ukwuu. \p \v 28 Mgbe Absalọm nọrọ afọ abụọ na Jerusalem na-ahụghị eze anya, \v 29 o ziri ozi ka Joab bịa, ka ọ gaa ziere ya eze ozi, ma Joab abịaghị. Absalọm zigakwara ozi ọzọ ka ọ bịa ma Joab ekweghị ịbịa. \v 30 Nʼikpeazụ, Absalọm gwara ndị na-ejere ya ozi okwu sị ha, “Gaanụ sunye ubi ọka balị Joab dị nʼakụkụ nke m ọkụ.” Ha mekwara dịka a gwara ha. \p \v 31 Mgbe ahụ, Joab biliri jee nʼụlọ Absalọm, ma sị ya, “Gịnị mere ndị na-ejere gị ozi ji gbaa ubi m ọkụ?” \p \v 32 Absalọm sịrị ya, “Lee ezitere m gị ozi, sị, ‘Bịa nʼebe a ka m ziga gị na nke eze ka ị jụta, “Nʼihi gịnị ka m ji site na Geshua lọghachita? Ọ gara a kara m mma ma a sị na m nọ nʼebe ahụ ruo ugbu a.” ’ Ugbu a, achọrọ m ka mụ hụ ihu eze, ọ bụrụ na onwe ajọ omume dị nʼime m, ya mee ka m nwụọ.” \p \v 33 Joab gakwuru eze, gwa ya ihe Absalọm kwuru. Mgbe ahụ, eze kpọrọ Absalọm, onye batara ma kpọọ isiala nʼihu eze. Eze sutukwara ya ọnụ. \c 15 \s1 Nzube ọjọọ Absalọm \p \v 1 Mgbe nke a gasịrị, Absalọm zụtaara onwe ya ụgbọ agha na ịnyịnya na-adọkpụ ya. O nwetakwaara onwe ya iri ndị ikom ise ndị na-agba ọsọ nʼihu ya. \v 2 Nʼisi ụtụtụ, ọ na-ebili gaa guzo nʼakụkụ ọnụ ụzọ e si abata Jerusalem. Ọ bụrụ na ọ hụ onye ọbụla nwere okwu ọ chọrọ ka eze mara ihe banyere ya, Absalọm na-akpọ onye ahụ jụọ ya sị, “Olee obodo i si bịa?” Onye ahụ na-aza sị, “Ohu gị si nʼotu nʼime ebo dị nʼIzrel.” \v 3 Absalọm na-agwa onye ahụ sị, “Ahụrụ m na okwu gị niile bụ eziokwu. Ma ọ na-ewute m na eze enweghị onye na-enyere ya aka ịnụ okwu ndị a niile.” \v 4 Absalọm na-ekwukwa sị, “Asị na m bụ onye ikpe nʼala Izrel, onye ọbụla nwere okwu na ụka gaara abịakwute m ka m mee ka ikpe ziri ezi rute ya aka.” \p \v 5 Mgbe onye ọbụla bịara ịkpọ isiala nye ya nʼọnọdụ nsọpụrụ, ọ na-eseti aka ya, jide onye ahụ sutu ya ọnụ. \v 6 Otu a ka Absalọm sị na-akpaso ndị Izrel agwa, bụ ndị ahụ niile na-abịakwute eze na-arịọ maka ikpe ziri ezi. O si otu a zuru obi ndị Izrel niile nʼohi. \p \v 7 Mgbe afọ anọ gasịrị, Absalọm bịakwutere eze rịọọ ya sị, “Biko kwere ka m jee Hebrọn mezuoro \nd Onyenwe anyị\nd* nkwa m kwere ya. \v 8 Mgbe ohu gị bi na Geshua nʼime Aram, ekweere m nkwa a, ‘Ọ bụrụ na \nd Onyenwe anyị\nd* ga-eme ka m lọghachi ọzọ na Jerusalem, aga m efe ya ofufe na Hebrọn.’ ” \p \v 9 Eze sịrị ya, “Gaa nʼudo.” Ya mere, ọ pụrụ gaa Hebrọn. \p \v 10 Mgbe ahụ, Absalọm zigara ndị ozi na nzuzo, ka ha gaa nʼebo niile nke ala Izrel. Nke a bụ ihe o ziri ha, “Mgbe unu nụrụ ụda opi ike, tienụ mkpu sị, ‘Absalọm abụrụla eze na Hebrọn.’ ” \v 11 Narị mmadụ abụọ si Jerusalem soro Absalọm gaa dịka ndị ọ kpọrọ oku oriri ma ha amaghị ihe ọbụla. \v 12 Mgbe Absalọm nọkwa na-achụ aja ahụ, o ziri ozi ka a kpọọ Ahitofel\f + \fr 15:12 \fr*\ft Ahitofel bụ nna nna Batsheba, nke a dị nʼakwụkwọ \+xt 2Sa 11:3; 23:34\+xt*\ft*\f* onye Gailo, otu nʼime ndị na-adụ Devid ọdụ, ka o si Gailo bịa nke bụ obodo ya. Nke a mere ka nkwekọrịta nzuzo ọjọọ ahụ na-esi ike karịa, ndị dịnyere Absalọm na-amụbanyekwa. \s1 Mgbapụ Devid \p \v 13 Ọ dịghị anya, onyeozi bịaruru Jerusalem gwa Devid na ndị Izrel niile kwagidere Absalọm. \p \v 14 Mgbe ahụ, Devid gwara ndị ọrụ ya niile ndị ya na ha nọ na Jerusalem, sị, “Bilienụ! Anyị aghaghị ịgbapụ, ma ọ bụghị otu a, ọ dịghị onye nʼime anyị ga-agbanarị Absalọm. Anyị ga-ahapụ ugbu a, ma ọ bụghị ya, ọ ga-eme ngwa gafee anyị wetara anyị mbibi, werekwa mma agha gbuchapụ ndị niile nọ nʼobodo a.” \p \v 15 Ndị na-ejere ya ozi zara sị ya, “Anyị dịnyere gị! Anyị jikekwara ime ihe ọbụla onyenwe anyị eze kwuru.” \p \v 16 Ya mere, eze na ndị ụlọ ya niile si na Jerusalem pụọ. Ọ dịghị onye ọ hapụrụ karịakwa ndị iko ya nwanyị iri nʼihi ilekọta obieze ahụ. \v 17 Eze biliri pụọ, ya na ndị niile so ya, ha kwụsịrị nʼoke ala nke obodo ahụ. \v 18 Ndị niile na-ejere ya ozi, gafere nʼakụkụ ya, ha na ndị Keret na Pelet, na narị ndị ikom isii ndị Git, bụ ndị so ya site na Gat, gafekwara nọrọ nʼihu eze. \p \v 19 Mgbe ahụ, Devid tụgharịrị kpọọ Itai, onye Git, ọchịagha narị ndị agha isii ahụ sị ya, “Gịnị mere i ji eso m? Laghachi azụ soro eze Absalọm, nʼihi na ị bụ ọbịa nʼIzrel, onye gbatara ọsọ ndụ. \v 20 Ọ dịbeghị anya kemgbe ị bịara. M ga-esi aṅaa kwere ka i soro m na-awagharị, ebe ọ bụ na m amaghị ebe m na-aga. Chịrị ndị agha gị laghachi. Ka obiọma na ikwesi ntụkwasị obi dịnyere unu.” \p \v 21 Ma Itai zara eze sị, “Dịka \nd Onyenwe anyị\nd* na-adị ndụ, onyenwe m na-adịkwa ndụ, ebe ọbụla onyenwe m bụ eze ga-anọ, ma ọ pụtara ndụ maọbụ ọnwụ, nʼebe ahụ ka odibo gị ga-anọkwa.” \p \v 22 Devid sịrị Itai, “Gaa nʼihu, gabiga.” Ya mere Itai, onye Git gabigara ya na ndị ikom ya niile, na ezinaụlọ niile ndị so ya. \p \v 23 Obodo niile tiri mkpu akwa mgbe ndị ahụ niile na-agabiga. Eze gafere ọdọ mmiri Kidrọn, ya na ndị mmadụ niile chere ihu nʼụzọ ọzara. \p \v 24 Zadọk bịakwara, ya na ndị Livayị niile, ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Ha dọbara igbe ọgbụgba ndụ Chineke nʼala. Abịata chụgidere aja tutu ruo mgbe mmadụ niile sitere nʼobodo ahụ gabigasịrị. \p \v 25 Mgbe ahụ, eze sịrị Zadọk, “Bughachi igbe Chineke a nʼime obodo. Ọ bụrụ na m ahụta amara nʼanya \nd Onyenwe anyị\nd*, ọ ga-akpọghachi m mee ka m hụ ya, na ebe obibi ya anya ọzọ. \v 26 Ma ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ihe banyere gị adịghị atọkwa m ụtọ,’ lee m, ya mee m otu o si dị ya mma nʼanya.” \p \v 27 Mgbe ahụ, eze gwara Zadọk bụ onye nchụaja sị, “Ọkwa ị bụ onye ọhụ ụzọ? Laghachi nʼobodo nʼudo, kpọrọ Ahimaaz nwa gị nwoke, na Jonatan nwa Abịata. Gị na Abịata kpọrọ ụmụ unu ndị ikom abụọ ndị a laghachi nʼobodo. \v 28 Aga m akwụsị chere nʼebe e si akwọfe osimiri Jọdan, ruo mgbe ozi ga-esi nʼebe ị nọ bịa.” \v 29 Mgbe ahụ, Zadọk na Abịata bughachiri igbe Chineke na Jerusalem. Ha nọdụkwara nʼebe ahụ. \p \v 30 Ma Devid na ndị so ya chere ihu irigo Ugwu Oliv. Mgbe ọ na-aga, Devid nọ na-akwa akwa. O yikwaghị ihe ọbụla nʼụkwụ ya, ma o ji ihe kpuchie isi ya.\f + \fr 15:30 \fr*\ft Nke a na-egosipụta ọnọdụ obi ọjọọ na iru ụjụ. Gụọ \+xt 2Sa 19:4; Est 6:12; Izk 24:17,23; Aịz 20:2-4\+xt*\ft*\f* Ndị niile so ya kpuchikwara isi ha na-akwakwa akwa ka ha na-arịgo. \v 31 Mgbe a gwara Devid na Ahitofel onye na-adụ ya ọdụ dịnyere Absalọm, Devid kpere ekpere sị, “O \nd Onyenwe anyị\nd*, biko, tụgharịa ndụmọdụ Ahitofel ka ọ bụrụ ndụmọdụ nzuzu.” \p \v 32 Mgbe Devid bịaruru nʼelu Ugwu Oliv, ebe ndị mmadụ na-anọ na-efe Chineke ofufe, Hushaị, onye Akai\f + \fr 15:32 \fr*\ft Ndị Juu na ndị Akai nwere ka ha si bụrụ nwanne, e dere nke a nʼakwụkwọ. \+xt Jos 16:2\+xt*\ft*\f* nọ nʼebe ahụ na-eche izute ya. Uwe ya dọwakwara adọwa, aja dịkwa ya nʼisi. \v 33 Ma Devid sịrị ya, “Ọ bụrụ na i soro m, ị ga-abụ ibu arọ nye m. \v 34 Ma ọ bụrụ na ị laghachi nʼobodo, sị Absalọm, ‘Aga m abụ ohu gị, eze. Abụ m ohu nna gị nʼoge gara aga, ugbu a aga m abụ ohu gị.’ Nʼụzọ dị otu a ị ga-enyere m aka mebie ndụmọdụ Ahitofel. \v 35 Ọ bụ na Zadọk na Abịata ndị nchụaja agaghị eso gị nọdụ nʼebe ahụ? Gwa ha ihe ọbụla ị ga-anụta nʼụlọeze. \v 36 Ụmụ ha ndị ikom, Ahimaaz nwa Zadọk na Jonatan nwa Abịata so ha nọdụ nʼebe ahụ. Zitere m ha ka ha gwa m ihe ọbụla ị nụtara.” \p \v 37 Ya mere Hushaị, enyi Devid, bịarutere Jerusalem mgbe Absalọm na-abata obodo ahụ. \c 16 \s1 Devid na Ziba \p \v 1 Mgbe Devid gafechara elu ugwu ahụ na-agbada nʼakụkụ nke ọzọ ya, Ziba, onye na-elekọta akụ Mefiboshet, guzo na-eche ya. Ọ chị ịnyịnya ibu bu narị ogbe achịcha abụọ, na otu narị ụyọkọ mkpụrụ vaịnị a mịkpọrọ amịkpọ na narị ụyọkọ mkpụrụ osisi ndị ọzọ, na karama akpụkpọ buru ibu mmanya juru nʼime ya. \p \v 2 Eze jụrụ Ziba sị, “Gịnị mere i ji bute ihe ndị a?” \p Ziba zara sị, “Ịnyịnya ibu ndị a bụ nke ndị ụlọeze ga-anọkwasị. Achịcha na mkpụrụ osisi ndị a bụ nke ndị ikom gị ga-eri. Mmanya a bụ nke ndị na-ada mba nʼọzara ga-aṅụ.” \p \v 3 Eze jụrụ ya sị, “Ebeekwanụ ka nwa nna gị ukwu nọ?” \p Ziba zara ya sị, “Ọ nọ na Jerusalem nʼihi na ọ sịrị, ‘Taa ụlọ Izrel ga-enyeghachi m alaeze nna nna m.’ ” \p \v 4 Eze gwara Ziba sị ya, “Nʼihi ya, enyela m gị ihe niile Mefiboshet nwere, ha ga-abụkwa nke gị.” \p Ziba sịrị, “Ka m hụta amara nʼihu eze, bụ onyenwe m.” \s1 Shimei abụọ Devid ọnụ \p \v 5 Dịka eze bụ Devid na-abịaru obodo Bahurim,\f + \fr 16:5 \fr*\ft \+xt 2Sa 3:16\+xt*\ft*\f* lee, otu nwoke sitere nʼagbụrụ ụlọ Sọl sitere nʼebe ahụ pụta. Ọ bụ Shimei\f + \fr 16:5 \fr*\ft \+xt 2Sa 19:21; 1Ez 2:8,44-46\+xt*\ft*\f* nwa Gera. Ọ na-akọcha mgbe ọ na-apụta ya. \v 6 Ọ chịịrị nkume na-atụ Devid na ndị ozi eze niile. Ọ bụ ezie na ndị agha Izrel na ndị na-eche Devid nche gbara ya gburugburu nʼaka nri na aka ekpe. \v 7 Ma dịka Shimei na-akọcha, ọ sịrị, “Si nʼebe a pụọ, si nʼebe a pụọ, gị ogbu mmadụ, gị onye ọjọọ! \v 8 \nd Onyenwe anyị\nd* akwụghachila gị ụgwọ ọbara niile ị wụsiri nʼezinaụlọ Sọl, onye ị nọchiri ọnọdụ ya dịka eze. \nd Onyenwe anyị\nd* anapụla gị alaeze ahụ, were ya nye Absalọm nwa gị! Ugbu a, ihe i metara abịala gị ụgwọ, gị ogbu mmadụ.” \p \v 9 Abishai, nwa Zeruaya\f + \fr 16:9 \fr*\ft Zeruaya bụ nwanne nwanyị Devid, ya mere Joab na Abishai bụ ụmụ nwanne ya.\ft*\f* gwara eze okwu sị, “Nʼihi gịnị ka nkịta a nwụrụ anwụ ga-eji na-akọcha onyenwe m bụ eze? Biko, ka m gafee gaa bipụ ya isi.” \p \v 10 Ma eze zara sị, “Gịnị jikọrọ mụ na unu, unu ụmụ ndị ikom Zeruaya. Ọ bụrụ na ọ na-akọcha m nʼihi na \nd Onyenwe anyị\nd* sị ya ‘Kọchaa Devid,’ onye pụrụ ịjụ ajụjụ sị, ‘Gịnị mere ị ji na-eme ihe dị otu a?’ ” \p \v 11 Mgbe ahụ, Devid gwara Abishai na ndị ozi ya okwu sị, “Nwa m nwoke, onye si nʼahụ m na-agbalị ịnapụ m ndụ m. Gịnị ga-eme ka onye Benjamin a ghara ime karịa? Hapụ ya, ya kọchaa, nʼihi na \nd Onyenwe anyị\nd* agwala ya ka ọ kọchaa m. \v 12 Ma eleghị anya, \nd Onyenwe anyị\nd* ga-ahụ ọnọdụ ahụhụ m, nyeghachikwa m ngọzị nʼọnọdụ nkọcha ndị a.” \p \v 13 Ya mere, Devid na ndị ya gakwara nʼihu ije ha nʼụzọ ahụ ma Shimei sokwara ha na-aga nʼakụkụ ugwu ahụ na-akọcha ha. Ọ nọgidekwara na-atụ Devid nkume, na-ekpolikwa aja elu ka ọ na-awụsa ha nʼahụ. \v 14 Ya mere, eze na ndị niile so ya gagidere bịaruo nʼakụkụ Jọdan nʼọnọdụ ike ọgwụgwụ. Nʼihi ya, ha nọdụrụ nʼebe ahụ zuo ike. \s1 Ndụmọdụ Hushaị na Ahitofel \p \v 15 Ma Absalọm na ndị Izrel abatalarị Jerusalem. Ahitofel sokwa ya. \v 16 Mgbe Hushaị, enyi Devid, onye Akai bịaruru, ọ gara hụ Absalọm sị ya, “Ka eze dị ogologo ndụ, ka eze dị ndụ.” \p \v 17 Absalọm sịrị Hushaị, “Ọ bụ otu a ka i si egosi ịhụnanya i nwere na-ebe enyi gị nọ? Gịnị mere i soghị ya?” \p \v 18 Hushaị zara Absalọm sị, “Mba! Onye ahụ \nd Onyenwe anyị\nd* na ọha mmadụ na ndị Izrel niile họpụtara, nke onye ahụ ka m ga-abụ. Ọ bụkwa onye ahụ ka m ga-adịnyere. \v 19 Ma onye kwanụ ka m kwesiri ijere ozi? Ọ bụghị nwa eze? Ejeere m nna gị ozi, ugbu a anọkwa m jikere ijere gị ozi!” \p \v 20 Absalọm tụgharịrị gwa Ahitofel okwu sị, “Gịnị ọzọ ka m ga-eme? Nye anyị ndụmọdụ gị. Gịnị ka anyị kwesiri ime?” \p \v 21 Ahitofel zara, “Ga dinaa ndị iko nwanyị nna gị ndị ahụ ọ hapụrụ ka ha lekọtaa ụlọ. Mgbe ahụ, Izrel niile ga-anụ na ị meela onwe gị ihe na-asọ oyi nʼebe nna gị nọ, aka ndị niile nọnyere gị ga-akwụkwa chịm.” \v 22 Ya mere, ha manyeere Absalọm ụlọ ikwu nʼelu ụlọ; ọ kpọkwaara ndị iko nwanyị nna ya dinaa ha nʼotu nʼotu, nʼihu ndị Izrel niile. \p \v 23 Nʼoge ahụ, ndụmọdụ ọbụla Ahitofel dụrụ dị ka a ga-asị na ọ bụ ozi si nʼọnụ Chineke nʼonwe ya bịa. Ọ bụladị nʼebe Devid nọ, na nʼebe Absalọm nọkwa, otu a ka esi bulie ndụmọdụ ọbụla Ahitofel nyere elu. \c 17 \p \v 1 Ahitofel gwara Absalọm sị ya, “Kwere ka m họpụta puku ndị ikom iri na abụọ ka m duru ha chụso Devid ọsọ nʼazụ nʼabalị taa. \v 2 Aga m abịakwasị ya mgbe ike gwụrụ ya, mgbe obi ya na-ada mba. Aga m emenye ya egwu nke ga-eme ka ọ maa jijiji. Mgbe ahụ, ndị niile so ya ga-agbasasịkwa. Ọ bụ naanị eze ka m ga-egbu \v 3 Aga m eme ka ndị ya niile lọghachikwute gị. Ọnwụ nke otu nwoke a ị na-achọsi ndụ ya ike ga-eme ndị ọzọ niile ịlọghachikwute gị, onye ọbụla ga-anọ nʼudo.” \v 4 Atụmatụ ahụ ziri ezi nʼanya Absalọm na ndị okenye niile nke Izrel.\f + \fr 17:4 \fr*\ft Ha nabatara atụmatụ ahụ\ft*\f* \p \v 5 Ma Absalọm kwuru sị, “Kpọọ Hushaị onye Akai ka anyị jụọ ya ihe ọ chere banyere okwu a.” \v 6 Mgbe Hushaị bịakwutere ya, Absalọm sịrị ya, “Ahitofel nyere ndụmọdụ dị otu a. Gịnị ka ị chere? Anyị ga-eme ihe o kwuru? Ọ bụrụ na anyị agaghị eme ya, gị onwe gị kwuo nke gị.” \p \v 7 Hushaị zara Absalọm sị, “Ndụmọdụ Ahitofel dụrụ nʼoge a adịghị mma. \v 8 Ọ sịrị, Gị onwe gị maara nna gị na ndị ikom ya; ha bụ ndị dike nʼagha, mkpụrụobi ha dịkwa ilu ugbu a dịka anụ ọhịa bịa a gbabara aka nwa nʼọhịa. Nna gị bụ onye ihe banyere agha doro anya. Ọ gaghị eso ndị ya nọọ ọnọdụ abalị. \v 9 Ọ bụladị ugbu a, o zoola onwe ya nʼime otu olulu maọbụ nʼime ọgba nkume. Ọ bụrụ na ọ pụta buru ụzọ buso ndị agha gị agha, onye ọbụla nụrụ ya ga-ekwu sị, ‘Etigbuola ndị agha Absalọm oke ntigbu.’ \v 10 Mgbe ahụ, ọ bụladị dimkpa nʼagha ndị nwere obi ọdụm, ụjọ ga-atụkwa ha. Ha agaghị ekwekwa ịga nʼihu ọgụ. Nʼihi na Izrel niile maara na nna gị bụ dike. Ha maakwara na ndị agha ya bụkwa ndị obi kara aka. \p \v 11 “Ndụmọdụ m na-enye bụ nke a: chịkọtaa ndị Izrel niile, site na Dan ruo Bịasheba, ha dịka aja nke dị nʼakụkụ oke osimiri. Ọ bụkwa gị ga-edu ha nʼagha ahụ. \v 12 Mgbe ahụ, anyị ga-ebuso ya agha ebe ọbụla anyị hụrụ ya; anyị ga-abịakwasị ya dịka igirigi si adakwasị ala. Anyị ga-egbu ya, gbukwaa ndị niile so ya. Otu onye agaghị afọdụkwa nʼime ha. \v 13 Ọ bụrụkwa na o zoo onwe ya nʼotu obodo, mgbe ahụ Izrel niile ga-eweta ụdọ nʼobodo ahụ, anyị ga-adọtu ya dọbanye ya na ndagwurugwu, ruo mgbe ọ bụladị otu nkume ga-afọdụ nʼebe ahụ.” \p \v 14 Absalọm na ndị ikom Izrel niile sịrị, “Ndụmọdụ Hushaị, onye Akai dị mma karịa nke Ahitofel.” Ma \nd Onyenwe anyị\nd* ekpebielarị imebi ezi ndụmọdụ Ahitofel ka o si otu a wetara Absalọm ihe ndakwasị ọjọọ. \p \v 15 Hushaị gwara Zadọk na Abịata, ndị nchụaja, “Otu a na ihe ndị a ka Ahitofel dụrụ Absalọm na ndị okenye Izrel nʼọdụ ka ha mee, ma otu a na nke a ka mụ onwe dụkwaranụ nʼọdụ. \v 16 Ugbu a, meenụ ngwa, ziga ozi gwa Devid sị, ‘Anọkwala ọnọdụ abalị nʼụzọ ngabiga nke osimiri nʼime ọzara, kama gabiga na-atụfughị oge, ma ọ bụghị otu a, ma eze ma ndị niile ya na ha soo ga-abụ ndị elodara.’ ” \p \v 17 Jonatan na Ahimaaz nọ nʼakụkụ En-Rogel ka a ghara ihu ha mgbe ha na-abata nʼobodo. Otu nwaagbọghọ na-eje ozi na-aga zie ha ozi, ha onwe ha agaa zie eze Devid. \v 18 Ma otu nwokorobịa hụrụ ha gaa gwa Absalọm. Ya mere, ha abụọ mere ngwangwa baa nʼụlọ otu nwoke onye Bahurim, onye nwere olulu mmiri nʼogige ya, ha rịdara nʼime olulu ahụ \v 19 Nwunye nwoke ahụ weere ihe mkpuchi ya tụsaa nʼọnụ olulu mmiri ahụ gbasaakwa mkpụrụ ọka nʼelu ya.\f + \fr 17:19 \fr*\ft \+xt Jos 2:4-6\+xt*\ft*\f* Ọ dịghị onye maara maka ya. \p \v 20 Mgbe ndị ozi Absalọm bịaruru jụọ nwanyị ahụ, “Olee ebe Ahimaaz na Jonatan nọ”? \p Nwanyị ahụ zara, “Ha agafeela mmiri iyi.” Ndị ozi Absalọm chọrọ ha ma ha ahụghị ha. Ha laghachiri na Jerusalem. \p \v 21 Mgbe ha lawara, mmadụ abụọ ahụ sitere nʼolulu mmiri ahụ rigopụta, gaa gwa eze Devid. Ha sịrị ya, “Bilie gafeenụ mmiri ngwangwa, nʼihi na Ahitofel adụọla Absalọm ọdụ otu a na otu a megide gị.” \v 22 Nke a mere Devid na ndị niile so ya biliri gafee osimiri Jọdan. Mgbe chi ụtụtụ na-abọ, ha niile nọ nʼofe nke ọzọ Jọdan. \p \v 23 Mgbe Ahitofel hụrụ na-emeghị ndụmọdụ ya, o biliri jikwaa ịnyịnya ibu ya, laa nʼụlọ ya nʼobodo ya. Mgbe o ruru nʼụlọ ya, o doziri nʼezinaụlọ ya nʼusoro, were ụdọ kwụgbuo onwe ya. Ọ nwụrụ. E lie ya nʼili nna ya. \s1 Ọnwụ Absalọm \p \v 24 Devid batara Mahanaim oge Absalọm gabigara Jọdan, ya na ndị ikom Izrel so ya. \v 25 Absalọm họpụtakwara Amasa mee ya onyeisi ndị agha, nʼọnọdụ Joab. Amasa bụ nwa nwoke Itra, onye Ishmel,\f + \fr 17:25 \fr*\ft Lee anya na \+xt 1Ih 2:17\+xt*. Ụfọdụ akwụkwọ mgbe ochie nke ndị Hibru nakwa ndị ọzọ na-asị \ft*\fqa Onye Izrel\fqa*\f* onye lụrụ Abigel, nwa nwanyị Nahash, onye bụkwa nwanne nwanyị Zeruaya nne Joab. \v 26 Absalọm na ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼala Gilead. \p \v 27 Mgbe Devid bịarutere Mahanaim, Shobi nwa Nahash onye obodo Raba nke dị nʼala ndị Amọn, na Makia\f + \fr 17:27 \fr*\ft Makia bụ nwoke ahụ nabatara Mefiboshet nʼụlọ ya. \+xt 2Sa 9:4\+xt*\ft*\f* nwa Amiel onye si Lo Deba, na Bazilai, onye Gilead si Rogelim \v 28 wetara ute e ji edina ala, na ite isi nri, na efere e ji eri nri bụ ọrụ onye ọkpụ ite. Tinyere ọka wiiti na ọka balị, ụtụ ọka na ọka a ṅara nʼọkụ, akịdị na lentil. \v 29 O wetakwara mmanụ aṅụ, na bọta, atụrụ na chiizi nke sitere na mmiri ara ehi nye Devid na ndị so ya ka ha rie. Nʼihi na ha sịrị, “Ike agwụla ndị mmadụ, agụụ na-agụ ha, akpịrị na-akpọkwa ha nkụ, nʼime ọzara.” \c 18 \p \v 1 Devid gụkọtara ndị ya na ha so ma họpụta ndịisi agha. Doo ụfọdụ ka ha chịa ọtụtụ puku ndị agha, ụfọdụ ka ha chịa ọtụtụ narị ndị agha. \v 2 Devid zipụrụ ndị agha ya, otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nʼokpuru Joab, Ọ họpụtakwara Abishai, nwanne Joab, nwa Zeruaya, ka ọ chịa otu ụzọ. Ma otu ụzọ nke fọdụrụ ka o tinyere nʼaka Itai onye Gat. Eze gwara ndị agha ahụ sị, “Mụ onwe m ga-edu unu gaa agha.” \p \v 3 Ma ndị ikom ahụ sịrị, “Ị gaghị apụkwa ọzọ nʼihi na ọ bụrụ na anyị atụgharịa bido ịgba ọsọ, ọ bụrụkwa na otu ọkara nʼime anyị anwụọ, nke ahụ agaghị emetụ ha nʼobi. Naanị gị ka ha na-achọ. Ị dịkwa mkpa karịa puku ndị agha iri. Ọ ga-akara anyị mma ugbu a ka ị na-ezitere anyị inyeaka site nʼime obodo.” \p \v 4 Eze zara nʼikpeazụ sị, “Ihe ọbụla dị mma nʼanya unu ka m ga-eme.” \p Ya mere, eze guzoro nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama dịka ndị ikom ya niile na-apụ nʼusu nke ọtụtụ narị, nakwa nʼusu nke ọtụtụ puku. \v 5 Eze nyere ndịisi agha ya, bụ Joab, Abishai na Itai, iwu sị ha, “Bikonu, nʼihi m, werenụ nwayọọ nʼebe nwokorobịa ahụ bụ Absalọm nọ.” Ndị agha niile nụkwara mgbe eze nyere ndịisi niile iwu a banyere Absalọm. \p \v 6 Ndị agha Devid si nʼobodo pụọ izute ndị Izrel nʼagha. Alụrụ agha a nʼọhịa Ifrem. \v 7 Ndị agha Devid tigbukwara ndị agha Izrel. Ha gburu iri puku ndị agha abụọ nʼụbọchị ahụ. \v 8 Agha ahụ gbasara nʼelu ala ahụ niile. Ndị nwụrụ nʼọhịa nʼetiti ụmụ Izrel karịrị ndị e gburu egbu. \p \v 9 Absalọm zutere ndị agha Devid. Ọ na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ya nʼoge a, dịka ịnyịnya ahụ sitere nʼokpuru osisi ook ukwu dị nʼọhịa ahụ na-agbafee, agịrị isi ya konyere nʼalaka osisi ahụ, tụhịkọtaakwa, nke mere na ọ kwụrụ nʼetiti eluigwe na ala. Ma ịnyịnya ya gbaara na-aga. \p \v 10 Otu nʼime ndị ikom ahụ hụrụ ya, kọọrọ Joab, “Lee, ahụrụ m Absalọm ebe ọ kwụ nʼelu osisi ook.” \p \v 11 Joab sịrị nwoke ahụ onye gwara gị, “Gịnị, ị hụrụ ya? Gịnị mere i tigbughị ya ka o ruo nʼala nʼebe ahụ? Mgbe ahụ, agaara m enye gị shekel ọlaọcha iri, na belịt a na-enye onye bụ dike nʼagha.” \p \v 12 Ma nwoke ahụ zara sị, “A sịkwarị na e nyere m puku ọlaọcha nʼaka m a, agaraghị m egbu ya. Nʼihi na anyị niile nụrụ mgbe eze na-agwa gị na Abishai na Itai sị, ‘Lezienụ anya banyere nwokorobịa bụ Absalọm, nʼihi m.’ \v 13 A sị na m gburu ya, ọ ga-abụ imegide eze. Ọ ga-emesiekwa chọpụta onye mere ya. Ma gị onwe gị agaraghị apụta kwuchite ọnụ m.” \p \v 14 Joab sịrị, “Ọ bụghị otu a ka m ga na-eche nʼihu gị.” Ya mere, ọ chịịrị ùbe atọ nʼaka ya, dubaa ha nʼobi Absalọm, mgbe Absalọm ka dị ndụ makwụrụ nʼelu osisi ook. \v 15 Ụmụ okorobịa iri ndị na-ebu ihe agha Joab gbara Absalọm gburugburu, tigbuo ya. \p \v 16 Emesịa, Joab fụrụ opi ike nke mere ka ndị agha Devid na-achụ ndị Izrel kwụsị ịchụ ha ọsọ, nʼihi na Joab kwụsịrị ha. \v 17 Ha buuru ozu Absalọm tụba ya nʼolulu ukwu dị nʼoke ọhịa ahụ, werekwa nkume tụọ ya nʼelu. Ndị agha Izrel niile gbalara nʼụlọ ha. \p \v 18 Nʼoge Absalọm dị ndụ, o wuuru onwe ya ogidi ncheta. O wuru ogidi a na Ndagwurugwu Eze, nʼihi na o chere nʼime onwe ya sị, “Enweghị m nwa nwoke ga-aza aha m.” Ya mere, ọ gụrụ ogidi ahụ aha nke ya onwe ya. Ọ bụkwa Ogidi Absalọm ka a na-akpọ ya ruo taa. \s1 Iru ụjụ Devid \p \v 19 Mgbe ahụ, Ahimaaz, nwa Zadọk,\f + \fr 18:19 \fr*\ft \+xt 2Sa 15:36; 17:17\+xt*\ft*\f* bịakwutere Joab sị ya, “Biko, ka m gbara ọsọ gaa zie eze oziọma a, na \nd Onyenwe anyị\nd* azọpụtala ya site nʼaka ndị iro ya.” \p \v 20 Ma Joab zara sị ya, “Ọ bụghị gị ga-ezi eze ozi taa. I nwere ike ime ya mgbe ọzọ, ma ọ bụghị taa, nʼihi na nwa eze nwụrụ.” \p \v 21 Joab gwara otu nwoke onye Kush sị ya, “Gaa gwa eze ihe ị hụrụ.” Nwoke ahụ kpọrọ isiala, gbapụ ọsọ. \p \v 22 Ahimaaz nwa Zadọk rịọkwara Joab ọzọ sị ya, “Otu ọbụla o si dị, biko kwere ka m gbaso onye Kush a.” \p Ma Joab zara sị, “Nwa m nwoke, gịnị mere i ji chọọ ị ga? I nweghị ozi ọbụla ị ga-ezi nke ga-ewetara gị ụgwọ ọrụ.” \p \v 23 Ọ rịọrọ sị, “Otu ọbụla o si dị, hapụ m ka m gaa.” \p Nʼikpeazụ Joab kwenyere sị ya, “Ọ dị mma, gbara ọsọ gaa.” Ahimaaz sitere nʼụzọ dị mkpụmkpụ nke gafere obosara ala Jọdan buru nwoke Kush ahụ ụzọ gbaruo. \p \v 24 Devid nọ nʼọnụ ụzọ ama nʼoge a. Mgbe onye nche rigoruru nʼelu mgbidi ebe ọ na-anọ, ọ hụrụ otu nwoke ka ọ na-agba ọsọ naanị ya. \v 25 Onye nche ahụ kpọrọ Devid oku gwa ya na o nwere onye na-abịa. \p Ma eze zara ya sị, “Ọ bụrụ naanị ya, o nwere oziọma.” Mgbe onyeozi ahụ na-abịaru nso, \p \v 26 onye nche ahụ lepụkwara anya hụ otu nwoke ọzọ ka o ji ọsọ na-abịa naanị ya. Ọ kpọkwara oku ọzọ sị, “Onye ọzọ na-abịakwa.” \p Eze zara sị, “Onye ahụ ga-enwekwa oziọma.” \p \v 27 Onye nche ahụ zara sị, “Onye nke mbụ na-abịa dị ka Ahimaaz, nwa Zadọk,” \p Eze zara sị, “Ọ bụ ezi mmadụ, ọ bụkwa oziọma ka o ji na-abịa.” \p \v 28 Mgbe ahụ, Ahimaaz kpọrọ eze oku sị, “Udo!” Ọ kpọrọ isiala nye eze. Kpuokwa ihu ya nʼala sị, “Ngọzị na-adịrị \nd Onyenwe anyị\nd* Chineke gị. Onye nke mebiri nzube ndị ahụ niile weliri aka imegide onyenwe m bụ eze.” \p \v 29 Eze jụrụ ya sị, “Oleekwanụ maka nwokorobịa ahụ bụ Absalọm? Ọ nọkwa nʼudo?” \p Ahimaaz zara sị, “Mgbe Joab zipụrụ ohu eze, na mụ onwe m, oke ụzụ dị, ma amaghị m ihe kpatara ya.” \p \v 30 Eze gwara ya sị, “Chere nʼebe a.” Ahimaaz chigharịrị chere. \p \v 31 Mgbe ahụ, onye Kush ahụ bịarutere sị, “Onyenwe m bụ eze, nụrụ oziọma a. Taa \nd Onyenwe anyị\nd* ekpepụtala gị site nʼịnapụta gị nʼaka ndị niile biliri imegide gị.” \p \v 32 Eze jụrụ onye Kush ahụ, “Nwokorobịa ahụ bụ Absalọm, ọ nọkwa nʼudo?” \p Onye Kush ahụ zaghachiri, “Ka ndị iro onyenwe m bụ eze na ndị niile na-ebili imejọ gị dị ka nwokorobịa ahụ!” \p \v 33 Okwu a metụrụ eze nʼahụ nke ukwuu, o biliri rigoo nʼụlọ nke dị nʼọnụ ụzọ ama, nọdụ nʼebe ahụ kwaa akwa. Ọ nọ na-akwa akwa mgbe ọ na-aga, na-eti mkpu akwa na-asị, “O, nwa m, Absalọm! O nwa m, nwa m, Absalọm. A sịkwarị na m nwụrụ nʼọnọdụ gị! O, Absalọm nwa m, nwa m oo!” \c 19 \p \v 1 Ọ dịghị anya ozi ruru Joab ntị sị, “Lee, eze na-akwa akwa, na-eru ụjụ nʼihi Absalọm.” \v 2 Mgbe ndị agha ya nụrụ na eze nọ nʼoke iru ụjụ nʼihi nwa ya, mmeri ha ghọọrọ ha ihu mgbarụ nʼụbọchị ahụ. \v 3 Ndị agha Devid niile zobatasịrị onwe ha nʼime obodo dịka a ga-asị na ha bụ ndị ihere na-eme dịka ndị e meriri nʼagha. \v 4 Eze kpuchiri ihu ya nọgidekwa na-akwa akwa na-asị, “O, nwa m Absalọm! O! Absalọm nwa m, nwa m!” \p \v 5 Emesịa, Joab jekwuuru eze nʼụlọ sị ya, “Anyị zọpụtara ndụ gị, na ndụ ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom, na ndị nwunye gị, na ndị iko gị nwanyị taa, ma lee ka ị si emeso anyị. Ị na-eme ka ihere mee anyị, dịka a ga-asị na anyị mere ihe ọjọọ. \v 6 Ị hụrụ ndị iro gị nʼanya, ma na-akpọ ndị hụrụ gị nʼanya asị. I meela ya ka ọ pụta ìhè taa na o nweghị ihe ndị ọchịagha gị na ndị agha gị bụ nʼanya gị. Ahụrụ m na ọ gaara abụ ihe ziri ezi nʼanya gị ma a sịkwarị na Absalọm dị ndụ taa, ma anyị niile anwụọ. \v 7 Ugbu a, pụọ gaa kelee ndị agha gị. Eji m aha \nd Onyenwe anyị\nd* na-aṅụ iyi na-asị na ọ bụrụ na ị pụghị nʼezi kelee ha, otu onye nʼime ha agaghị afọdụ nʼebe a mgbe chi taa jiri, mgbe ahụ ihe ga-ajọrọ gị njọ karịa ihe niile i jirila anya gị hụ na ndụ gị.” \p \v 8 Ya mere, eze biliri nọdụ ọdụ nʼọnụ ụzọ ama. Mgbe ndị agha nụrụ na eze nọ nʼọnụ ụzọ ama, ha niile pụtara guzo nʼihu ya. \p Ma nʼoge a, ndị Izrel niile agbalaala, onye ọbụla nʼụlọ ya. \s1 Devid alọghachi Jerusalem \p \v 9 Nʼetiti ebo Izrel niile, ndị mmadụ nọ na-arụ ụka na-asị, “Eze napụtara anyị site nʼaka ndị iro anyị. Ọ bụ ya napụtara anyị site nʼaka ndị Filistia. Ma ugbu a, o sitela nʼala a gbapụ nʼihi Absalọm.” \v 10 Absalọm, onye anyị tere mmanụ ka ọ chịa anyị anwụọla nʼagha. Gịnị mere, unu a gaghị ekwu okwu i kpọghachite eze anyị? \p \v 11 Eze Devid zigaara Zadọk na Abịata, ndị nchụaja ozi a, “Jụọnụ ndị okenye Juda sị, ‘Nʼihi gịnị ka unu ga-eji bụrụ ndị ikpeazụ ime ka eze lọghachi nʼobi ya, ebe ọ bụ na ihe a na-ekwu nʼala Izrel niile eruola eze ntị nʼebe o bi? \v 12 Ụmụnne m ka unu bụ, ọkpụkpụ m na anụ ahụ m. Gịnị mere unu ga-eji bụrụ ndị ikpeazụ ga-akpọlata eze nʼụlọ ya?’ \v 13 Gwakwanụ Amasa sị ya, ‘Ọ bụ na ị bụghị ọkpụkpụ m na anụ ahụ m? Ka Chineke mesoo m mmeso otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na ị bụghị ọchịagha m malite taa nʼọnọdụ Joab.’ ” \p \v 14 Amasa mere ka obi ndị okenye Juda rulata, dịka otu mmadụ. Ha zigara eze ozi, sị, “Lọghachikwute anyị, gị na ndị ohu gị niile.” \v 15 Mgbe ahụ, eze lọghachitere na Jọdan. \p Ndị ikom Juda bịarutere Gilgal izute eze, na ịkpọfeta ya Jọdan. \v 16 Shimei, nwa Gera, onye Benjamin, nwoke ahụ sitere na Bahurim, mere ngwangwa soro ndị ikom Juda pụta izute eze Devid. \v 17 Ya na puku ndị ikom Benjamin sokwa. Ziba, onyeozi Sọl, na ụmụ ya ndị ikom iri na ise, na iri ndị ozi abụọ ndị ozi ya, mekwara ngwangwa ịbịarute Jọdan tupu eze erute nʼebe ahụ. \v 18 Ha gabigara mmiri nʼebe ọ dị nta ịkwọfe ndị ụlọeze nʼụgbọ mmiri, na ime ihe ọbụla dị mma nʼanya ya. \p Mgbe Shimei nwa Gera gafere Jọdan, ọ dara nʼala nʼihu eze, \v 19 sị ya, “Ka Onyenwe m, ghara ịgụkọrọ m njehie m nye m. Echetakwala otu ohu gị si mee ihe nʼezighị ezi nʼụbọchị onyenwe m hapụrụ Jerusalem pụọ. Ka eze ghara itinye ya nʼobi ya, \v 20 nʼihi na mụ bụ ohu gị maara na m mehiere, ma taa abịara m dịka onye mbụ site nʼagbụrụ Josef, ịbịa zute onyenwe m, bụ eze.” \p \v 21 Abishai nwa Zeruaya jụrụ eze sị ya, “Ọ bụ na Shimei agaghị anwụ nʼihi ihe a? Nʼihi nkọcha ọ kọchara onye \nd Onyenwe anyị\nd* tere mmanụ bụ eze.”\f + \fr 19:21 \fr*\ft \+xt Ọpụ 22:28; 1Sa 26:9\+xt*\ft*\f* \p \v 22 Ma Devid sịrị, “Gịnị jikọtara mụ na unu ụmụ ndị ikom Zeruaya, nke mere na taa unu aghọọla ndị na-emegide m? O kwesiri ka e gbuo onye ọbụla nʼala Izrel taa? Ọ bụ na m amaghị na taa, abụ m eze Izrel?” \v 23 Ya mere eze gwara Shimei sị, “I gaghị anwụ. Eze jiri ịṅụ iyi kwee ya nkwa a.” \p \v 24 Mefiboshet, nwa nwa Sọl bịarukwara izute eze. Site nʼụbọchị eze hapụrụ Jerusalem, ọ sabeghị ụkwụ ya, ma uwe ya, ọ kpụghịkwa afụọnụ ya tutu ruo mgbe eze lọtara nʼudo. \v 25 Mgbe o si Jerusalem pụta izute eze, eze jụrụ ya ajụjụ sị, “Mefiboshet, gịnị mere i soghị m gaa?” \p \v 26 Ọ zara ya sị, “Onyenwe m, eze, agwara m Ziba ohu m ka o doziere m ịnyịnya ibu m, ka m soro eze, ma ebe m bụ onye ngwụrọ, ọ ghọgburu m. \v 27 O kwuluru ohu gị nʼebe onyenwe m bụ eze nọ. Ma onyenwe m bụ eze dịka mmụọ ozi Chineke, nʼihi ya mee m ihe masịrị gị. \v 28 Nʼagbanyeghị na ụlọ nna m niile dịka ndị nwụrụ anwụ nʼebe onyenwe m bụ eze nọ, ma i nyere ohu gị ọnọdụ nʼetiti ndị na-eri nri nʼelu tebul gị. Gịnị bụ ikike ọzọ m nwere iji rịọọ eze arịrịọ?” \p \v 29 Eze sịrị ya, “Nʼihi gịnị ka ị ka na-ekwuru okwu? Enyela m gị na Ziba iwu ka unu kee ala ahụ nʼetiti onwe unu.” \p \v 30 Mefiboshet sịrị eze, “Ka o were ihe niile ebe onyenwe m bụ eze lọghachiri nʼụlọ ya nʼudo.” \p \v 31 Bazilai onye Gilead\f + \fr 19:31 \fr*\ft \+xt 2Sa 17:27-29; 1Ez 2:7\+xt*\ft*\f* sikwa na Rogelim bịa iso eze kwọfee osimiri Jọdan, na izilaga ya site nʼebe ahụ. \v 32 Nʼoge a, Bazilai bụ agadi nwoke, onye gbara iri afọ asatọ. Ọ lekọtara eze mgbe eze nọ na Mahanaim, nʼihi na ọ bụ ọgaranya. \v 33 Eze gwara Bazilai sị ya, “Soro m gafee osimiri ka i soro m biri na Jerusalem. Aga m elekọtakwa gị.” \p \v 34 Ma Bazilai zara eze sị ya, “Afọ ole ka ọ fọdụrụ m ịdị ndụ m ga-eji soro eze gaa Jerusalem? \v 35 Agbaala m iri afọ asatọ. Enwere m ike ịkọwa ihe dị iche nʼetiti ihe dị mma na nke na-adịghị mma. O nwere ụzọ ohu gị si anụ ụtọ ihe oriri na ihe ọṅụṅụ? O nwere ụzọ m si anụ olu ndị ikom na ndị inyom na-abụ abụ? Gịnị mere ohu gị ga-eji buru ibu arọ nye onyenwe m na eze? \v 36 Ohu gị ga-eso eze gafee osimiri Jọdan, maọbụ nʼihi gịnị ka eze ga-eji nye m onyinye ọzọ dị iche. \v 37 Biko, ka ohu gị laghachi, ka m nwee ike nwụọ nʼobodo m, nʼakụkụ ili nna m na nne m. Ma lee ohu gị bụ Kimham, ka o soro onyenwe m, bụ eze gafee. Gị mekwara ya ihe ọbụla dị mma nʼanya gị.” \p \v 38 Eze zara sị ya, “Ọ dị mma, Kimham ga-eso m gafee, aga m emekwara ya ihe ọma niile ị rịọrọ m.” \p \v 39 Ya mere, ndị ahụ niile gabigara Jọdan, mgbe ahụ eze gabigakwara. Eze suturu Bazilai ọnụ, gọziekwa ya, Bazilai laghachiri nʼụlọ ya. \p \v 40 Mgbe eze gabigara ruo Gilgal, Kimham sokwa ya gafee. Ndị agha Juda niile na otu ọkara ndị agha Izrel niile mere ka eze gabiga. \p \v 41 Ọ dịghị anya, ndị ikom Izrel niile nọ na-abịakwute eze na-asị ya, “Gịnị mere ụmụnna anyị, ndị ikom Juda, jiri zopu eze kpọfeta ya na ezinaụlọ na ndị ikom ya niile osimiri Jọdan?” \p \v 42 Ma ndị ikom Juda zara ndị ikom Izrel, “Anyị mere nke a nʼihi na eze bụ onye metụtara ahụ anyị. Gịnị mere iwe ji ewe unu maka nke a? Anyị eriela ihe ọbụla site na nri eze? Ka anyị anarala ihe ọbụla dobere onwe anyị?” \p \v 43 Ma ndị ikom Izrel zara sị, “Anyị dị ebo iri nʼIzrel, nʼihi ya, anyị nwere oke iri nʼime Devid karịa unu. Gịnị mere unu ji lelịa anyị anya? Chetakwanụ na ọ bụ anyị bu ụzọ kwuo okwu maka nlọta ya ịbụ eze anyị ọzọ.” \p Ma ndị ikom Juda ejighị olu ọma nye ndị Izrel ọsịsa. \c 20 \s1 Nnupu isi Sheba megide Devid \p \v 1 Mgbe ahụ, otu onye okwu na ụka, aha ya bụ Sheba, nwa Bikri, onye Benjamin nọ nʼebe ahụ nʼoge a. Ọ fụrụ opi ike ya tie mkpu sị, \q1 “Anyị enweghị oke nʼime Devid, \q2 anyị enwekwaghị ihe nketa nʼime nwa Jesi. \q1 Ndị Izrel, onye ọbụla laa nʼụlọ ikwu ya!” \p \v 2 Ya mere, ndị ikom Izrel niile tụgharịrị hapụ Devid, soro Sheba nwa Bikri. Ma ndị ikom Juda nọgidere soro eze ha site na Jọdan ruo Jerusalem. \p \v 3 Mgbe Devid lọghachitere nʼụlọ ya na Jerusalem. O nyere iwu ka ndị iko ya nwanyị iri ndị ahụ ọ hapụrụ ilekọta ụlọ, ndị ahụ ha na Absalọm dinara, nọrọ nʼụlọ dị iche, ebe a nọ na-eche ha nche. Eze abakwurughị ha ọzọ. Ha bụ ndị emechibidoro ụzọ, ha na-ebi ndụ dịka ndị di ha nwụrụ anwụ tutu ruo ụbọchị ọnwụ ha. \p \v 4 Mgbe ahụ, eze gwara Amasa okwu sị, “Kpokọta ndị agha Juda ka ha bịakwute m nʼime abalị atọ. Gị onwe gị kwa ga-eso ha bịa nʼoge ahụ.” \v 5 Amasa pụrụ jee ịkpọkọta ndị Juda; ma o were ya ọtụtụ oge karịa abalị atọ. \p \v 6 Devid sịrị Abishai, “Lee nwoke a bụ Sheba nwa Bikri na-aga ime ihe ọjọọ ga-adị njọ karịa nke Absalọm mere. Chịrị ndị agha nna gị ukwu chụso ya, ma ọ bụghị ya, ọ ga-achọta obodo e wusiri ike gbaba, ebe anyị na-apụghị inweta ya.” \v 7 Ya mere ndị agha Joab, na ndị Keret na Pelet, na ndị niile bụ dike na dimkpa nʼagha pụrụ nʼikike ọchịchị Abishai. Ha si Jerusalem pụọ ịchụso Sheba nwa Bikri. \p \v 8 Mgbe ha rutere nʼoke nkume ahụ dị na Gibiọn, Amasa pụtara izute ha. Joab yi uwe agha ya nʼoge a; ọ fanyekwara mma agha ya nʼọbọ nʼukwu ya. Mgbe ọ gara nʼihu, mma ahụ si nʼọbọ ya dapụta. \p \v 9 Joab kelere Amasa sị ya, “Kedụ ka ị dị nwanna m.” Mgbe ahụ, Joab ji aka nri ya jide Amasa nʼahụọnụ isutu ya ọnụ, \v 10 Amasa elezighị anya hụ na mma agha nta dị nʼaka Joab. Joab mabanyere ya nʼime afọ Amasa, mee ka mgbịrị afọ ya sọsikwaa nʼala. Ọ maghị ya mma ahụ ugboro abụọ, nʼihi na otu ugboro ahụ mere ka Amasa nwụọ. Mgbe ahụ, Joab na nwanne ya Abishai chụsoro Sheba nwa Bikri nʼazụ. \p \v 11 Mgbe ahụ, otu nʼime ndị agha Joab guzo nʼakụkụ Amasa sị, “Onye ọbụla dịnyeere Joab na Devid ya bịa soro Joab nʼazụ.” \v 12 Ma Amasa tọgbọ nʼala nʼetiti ụzọ. Ọbara sikwa ya nʼahụ na-asọpụta. Mgbe nwoke ahụ hụrụ na ọtụtụ ndị agha na-agbakọ ile Amasa, o bupụrụ ozu ya nʼụzọ, were uwe kpuchie ya nʼọhịa. \v 13 Mgbe e bupụsịrị ozu Amasa nʼụzọ, ndị agha niile sooro Joab gaa ijide Sheba, nwa Bikri. \p \v 14 Sheba gabigara ebo niile nke Izrel ruo Ebel-Bet-Maaka, gabigakwa oke ala ndị Bikri, bụ ndị zukọtara soro ya. \v 15 Ndị agha Joab bịara gbochie ya na Ebel-Bet-Maaka. Ha wuru ihe mgbochi ruo obodo ahụ, nọbichie mgbidi dị ya gburugburu. Ebe ha nọ na-akụ mgbidi ahụ ihe, ka ha kwatuo ya. \v 16 Otu nwanyị maara ihe si nʼobodo ahụ kpọọ oku sị, “Geenụ m ntị, geenụ m ntị, gwanụ Joab ka ọ bịa nʼebe a. Achọrọ m ịgwa ya okwu.” \v 17 Joab pụtara gaa ya nso. Nwanyị ahụ jụrụ sị, “Ọ bụ gị bụ Joab?” \p Ọ zara sị, “E, ọ bụ m.” \p Mgbe ahụ, ọ gwara ya, “Gee ntị, ka i nụ ihe ohu gị nwere ikwu.” \p Joab sịrị ya, “Ana m ege ntị.” \p \v 18 Ọ gara nʼihu sị, “Nʼoge ochie a na-ekwu sị, ‘Gaa jụta ase nʼEbel,’ nʼụzọ dị otu a ka ha si ekwubi okwu. \v 19 Anyị bụ ndị udo na ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼIzrel. I na-achọ ibibi obodo bụ nne nʼIzrel. Gịnị mere i ji chọọ iloda ihe nketa nke \nd Onyenwe anyị\nd*?” \p \v 20 Joab zara sị, “Mba! Ọ bụghị uche m ịla obodo a nʼiyi. \v 21 Ọ bụghị otu a ka okwu ahụ dị. Otu nwoke a na-akpọ Sheba nwa Bikri, nke si nʼobodo ugwu Ifrem e weliela aka ya imegide eze, bụ Devid. Nyefee nwoke a ọsịịsọ nʼaka m, aga m esi nʼobodo a pụọ.” \p Nwanyị ahụ sịrị Joab, “A ga-atụpụtara gị isi ya site na mgbidi.” \p \v 22 Nwanyị ahụ ji ndụmọdụ nke amamihe ya gakwuru ndị obodo. Ha bipụrụ Sheba nwa Bikri isi, tụpụtara ya Joab. Ya mere na ọ fụrụ opi ike ya, ndị ikom ya sitere nʼobodo ahụ lasaa, onye ọbụla lara nʼụlọ nke ya. Joab laghachikwuru eze na Jerusalem. \s1 Ndịisi na-ejere Devid ozi \li1 \v 23 Ọ bụ Joab ka e mere onyeisi agha na-achị ndị agha niile nke Izrel. \li1 Benaya nwa Jehoiada bụ onye na-achịkọta ndị Keret na ndị Pelet na-eche eze nche. \li1 \v 24 Adoniram\f + \fr 20:24 \fr*\ft Nʼime ụfọdụ akwụkwọ ndị Hibru maọbụ Griik, ị ga-ahụ Adoram, ọ bụ otu onye ahụ.\ft*\f* na-ahụ maka ihe banyere ndị ọrụ mmanye. \li1 Jehoshafat nwa Ahilud bụ onye na-edekọta ihe niile na-eme nʼobodo. \li1 \v 25 Sheva bụ ode akwụkwọ eze, \li1 Zadọk na Abịata bụ ndị nchụaja. \li1 \v 26 Ira, onye si nʼobodo Jaịa, bụ onye nchụaja eze Devid. \c 21 \s1 Ịbọ ọbọ ndị Gibiọn \p \v 1 Ụnwụ dara afọ atọ nʼoge Devid na-achị, afọ kwa afọ. Devid chọrọ ihu \nd Onyenwe anyị\nd*. Mgbe ahụ, \nd Onyenwe anyị\nd* sịrị, “Ọ bụ maka Sọl na ọbara ụlọ ya kwafuru, nʼihi na o gburu ndị Gibiọn.” \p \v 2 Eze kpọrọ ndị Gibiọn, gwa ha okwu. (Ndị Gibiọn abụghị ndị Izrel, kama ha bụ ndị fọdụrụ nʼime ndị Amọrait,\f + \fr 21:2 \fr*\ft Ndị Amọrị bụ aha e ji maara ndị niile bi nʼala Kenan, tupu ndị Izrel e merie ma achụpụ ha. \+xt Jen 15:16; Jos 24:18\+xt*\ft*\f* ndị bi nʼala Kenan mgbe ụmụ Izrel batara. Mgbe ahụ ha batara, ndị Izrel ṅụrụ iyi nye ndị Gibiọn\f + \fr 21:2 \fr*\ft Ndị Gibiọn bụ ndị Hiv \+xt Jos 9:7; 11:19\+xt*\ft*\f* na ha agaghị egbu ha, ma Sọl sitere nʼịnụ ọkụ nke obi nʼihi Izrel na Juda chọọ ikpochapụ ha.) \v 3 Devid jụrụ ndị Gibiọn ajụjụ sị, “Gịnị ka m ga-emere unu? Gịnị ka m ga-eji kpuchie mmehie a e mere megide unu, ime ka unu gọzie ihe nketa \nd Onyenwe anyị\nd*?” \p \v 4 Ndị Gibiọn zara ya sị, “Nsogbu anyị na Sọl na ndị ụlọ ya abụghị ihe a ga-eji ọlaọcha maọbụ ọlaedo mezie. Anyị achọkwaghị ka onye ọbụla nʼIzrel nwụọ nʼihi anyị.” \p Devid sịrị ha, “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?” \p \v 5 Ha zara eze sị, “Kwere ka anyị wezuga nwoke ahụ wetaara anyị mbibi na ịla nʼiyi, onye ahụ mere ka anyị ghara inwe ebe obibi ọbụla nʼala Izrel. \v 6 Ka akpọnye anyị ndị ikom asaa site nʼụmụ ya, ka anyị kwụgbuo ha nye \nd Onyenwe anyị\nd* na Gibea Sọl, onye \nd Onyenwe anyị\nd* họpụtara.” \p Eze zara sị, “Aga m akpọnye unu ha.” \p \v 7 Ma eze nwere ọmịiko nʼahụ Mefiboshet nwa Jonatan, nwa Sọl, nʼihi ịgba ndụ dị nʼetiti ya na Jonatan nʼihu \nd Onyenwe anyị\nd*. \v 8 Ma eze kpọọrọ Amoni na Mefiboshet, ụmụ ndị ikom abụọ nke Rizpa, nwa nwanyị Aịa, bụ ndị ọ mụtaara Sọl. Nakwa ụmụ ndị ikom ise nke Merab nwa Sọl mụtara mgbe ọ bụ nwunye Adriel, nwa Bazilai onye Mehola. \v 9 O nyefere ha niile nʼaka ndị Gibiọn; ndị Gibiọn kwụbakwara ha nʼugwu nʼihu \nd Onyenwe anyị\nd*. Ha asaa nwụrụ nʼotu ụbọchị na mmalite owuwe ihe ubi nke ọka balị. \p \v 10 Ma Rizpa, nwa nwanyị Aịa were akwa mkpe gbasara onwe ya nʼelu nkume. O kweghịkwa ka anụ ufe bekwasị ha nʼehihie, maọbụ anụ ọhịa nʼabalị. Ọ nọgidere nʼebe ahụ site nʼoge mmalite owuwe ihe ubi tutu ruo mgbe mmiri bidoro izokwasị anụ ahụ ha. \v 11 Mgbe a gwara Devid ihe Rizpa, nwa nwanyị Aịa, iko nwanyị Sọl mere, \v 12 ọ gara chịkọtaa ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya Jonatan site nʼaka ndị nwe obodo Jebesh Gilead. Ha gara na nzuzo zuru ozu Sọl na Jonatan site nʼama dị na Bet-Shan, ebe ndị Filistia kwụbara ha, oge ha gburu Sọl na Gilboa. \v 13 Devid sitere nʼebe ahụ chịkọtaa ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya nwoke Jonatan, chịkọtaakwa ọkpụkpụ ndị ahụ akwụgburu. \p \v 14 Ha liri ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya nwoke Jonatan nʼobodo Zela nʼala Benjamin, nʼime ili Kish nna Sọl, meekwa ihe ndị ọzọ niile eze nyere nʼiwu. Mgbe nke a gasịrị, Chineke zara ekpere nʼihi ala ahụ. \s1 Agha megide ndị Filistia \p \v 15 Emesịa, ndị Filistia busokwara Izrel agha ọzọ. Devid na ndị agha ya pụkwara ịlụso ha ọgụ. Nʼoge ha na-alụ ọgụ a, ike gwụrụ Devid nke ukwuu. \v 16 Mgbe ahụ, Ishibi-Benob, otu onye agbụrụ Rafa, onye ịdị arọ nke bronz dị nʼọnụ ùbe ya ruru kilogram atọ na ọkara, onye jikwa mma agha ọhụrụ, bịaruru Devid nso chọọ igbu ya. \v 17 Ma Abishai nwa Zeruaya bịara nyere Devid aka, tigbuo onye Filistia ahụ. Site nʼoge ahụ, ndị ikom Devid ṅụrụ iyi sị ya, “Ị gaghị esokwa anyị gaa ibu agha ọzọ! Ka a ghara imenyụ oriọna Izrel.” \p \v 18 Mgbe oge gaturu, ha na ndị Filistia lụrụ agha ọzọ na Gob. Nʼoge a, Sibekai,\f + \fr 21:18 \fr*\ft Sibekai onye Husha, bụ onye sitere nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ndịda Betlehem. Ọ bụ onyeisi agha nkewa nke asatọ nʼetiti ndị ọchịagha Devid. \+xt 1Ih 11:29; 27:11\+xt*\ft*\f* onye Husha, gburu Saf, otu nʼime ndị agbụrụ Rafa. \p \v 19 Nʼagha ọzọ ha na ndị Filistia lụrụ na Gob, Elhanan\f + \fr 21:19 \fr*\ft Ọ bụ nwanne nna Devid \+xt 1Ih 11:26\+xt*\ft*\f* nwa Jaịa\f + \fr 21:19 \fr*\ft Maọbụ, \ft*\fqa Jaare-Oregim\fqa*\f* onye Betlehem gburu nwanne Golaịat onye Gat,\f + \fr 21:19 \fr*\ft Dịka akụkọ a kọrọ nʼakwụkwọ Ihe E Mere nʼụbọchị ndị eze, \+xt 1Ih 20:5\+xt* si dị, Elhanan, nwa Jaịa, gburu Lahmi nwanne Golaịat. Akụkọ a dakọtara na nke a kọrọ nʼakwụkwọ \+xt 1Sa 17\+xt*, ebe e dere na Devid tigburu Golaịat. Eleghị anya, ndị ndepụta okwu chere na “Lahmi nwanne ya,” pụtara “onye Betlehem.”\ft*\f* onye ùbe ya nwere osisi dị ogologo dịka nke onye na-ekwe akwa ji ekwe akwa. \p \v 20 Nʼagha ọzọkwa, bụ nke a lụrụ na Gat, e nwere otu nwoke gbara oke dimkpa, nke nwere mkpịsịaka isii nʼaka ya ọbụla, nweekwa mkpịsịụkwụ isii nʼụkwụ ya ọbụla, ya bụ, a gụkọtaa ha niile, iri mkpịsịaka na mkpịsịụkwụ abụọ na anọ. Ọ bụkwa onye amụrụ nʼagbụrụ Rafa. \v 21 Mgbe ọ kọchara Izrel, Jonatan nwa Shimei, nwanne nwoke Devid, gburu ya. \p \v 22 Mmadụ anọ ndị a bụ ndị agbụrụ Rafa dị na Gat. Devid na ndị agha ya gburu ha niile. \c 22 \s1 Abụ otuto Devid \p \v 1 Devid buuru \nd Onyenwe anyị\nd* okwu niile nke abụ a mgbe \nd Onyenwe anyị\nd* napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl. \v 2 Ọ sịrị: \q1 “\nd Onyenwe anyị\nd* bụ oke nkume m. Ọ bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m. \q2 \v 3 Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya. \q2 Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m. \q1 Ya bụ oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya, ebe mgbaba m, na onye nzọpụta m, \q2 site nʼaka ndị na-eme ihe ike. \b \q1 \v 4 “Akpọkuru m \nd Onyenwe anyị\nd*; onye e kwesiri inye otuto. \q2 Azọpụtara m site nʼaka ndị iro m. \q1 \v 5 Ebili mmiri nke ọnwụ gbara m gburugburu; \q2 Ịchị ọkụ nke mbibi ọjọọ kpuchiri m.\f + \fr 22:5 \fr*\ft Mmekpa ahụ nke na-eweta mbibi bịakwasịrị m\ft*\f* \q1 \v 6 Ụdọ niile nke ili kere m agbụ, \q2 Ọnya nke ọnwụ guzogidere m. \b \q1 \v 7 “Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m \nd Onyenwe anyị\nd*, \q2 akpọkuru m Chineke m. \q1 Akwa m ruru ya ntị. \q2 O sitekwara nʼụlọnsọ ukwu ya nụ olu m. \q1 \v 8 Ụwa mere mkpọtụ maa jijiji, \q2 ntọala eluigwe makwara jijiji, \q2 ha mara jijiji nʼihi iwe nke na-ewe ya. \q1 \v 9 Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta; \q2 Ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta. \q2 Icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta. \q1 \v 10 O kewara mbara eluigwe, rịdata; \q2 oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya. \q1 \v 11 Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim felie elu, \q2 O feliri elu nʼelu nku nke ifufe. \q1 \v 12 O mere ọchịchịrị ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu, \q2 bụ ọchịchịrị mmiri igwe ojii nke mbara eluigwe. \q1 \v 13 Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya, \q2 amụma egbe eluigwe nwupụtara ire ọkụ. \q1 \v 14 \nd Onyenwe anyị\nd* sitere nʼeluigwe bigbọọ. \q2 Olu Onye kachasị ihe niile elu dara ụda. \q1 \v 15 Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa. \q2 O jikwa oke amụma nke egbe eluigwe chụsaa ha. \q1 \v 16 E kpughere ala ala nke oke osimiri. \q2 Gbakwa ntọala niile nke ụwa ọtọ, \q1 site nʼịba mba nke \nd Onyenwe anyị\nd*, \q2 na nkuume si nʼimi ya pụta. \b \q1 \v 17 “O sitere nʼelu setịpụ aka ya, \q2 jidesie m aka ike, ọ dọpụtara m site nʼogbu mmiri niile. \q1 \v 18 Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike, \q2 bụ ndị kpọrọ m asị, ndị dịkwa ike karịa m. \q1 \v 19 Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m. \q2 Ma \nd Onyenwe anyị\nd* bụrụ m ihe ndabere. \q1 \v 20 Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara, \q2 Ọ napụtara m nʼihi na ihe m na-atọ ya ụtọ. \b \q1 \v 21 “\nd Onyenwe anyị\nd* mesoro m dịka ezi omume m si dị, \q2 Ọ kwụghachiri m dịka ịdị ọcha nke aka m si dị. \q1 \v 22 Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke \nd Onyenwe anyị\nd*; \q2 ikpe amaghị m nʼihi ịgbakụta Chineke azụ. \q1 \v 23 Iwu ya niile dị nʼihu m, \q2 esibekwaghị m nʼụkpụrụ ya wezuga onwe m. \q1 \v 24 Abụ m onye na-enweghị ịta ụta nʼihu ya, \q2 edebekwara m onwe m pụọ na mmehie. \q1 \v 25 \nd Onyenwe anyị\nd* kwụghachiri m dịka ezi omume m si dị, \q2 dịka ịdị ọcha m si dị nʼanya ya. \b \q1 \v 26 “Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi, \q2 nʼebe onye zuruoke nọ, ị na-egosi onwe gị onye zuruoke. \q1 \v 27 Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha, \q2 ma nye ndị ụzọ ha na-ezighị ezi, Ị na-egosi onwe gị dịka onye dị aghụghọ. \q1 \v 28 Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi, \q2 ma anya gị dị nʼahụ ndị mpako, I mee ka ha dị ala. \q1 \v 29 Ọ bụ gị, \nd Onyenwe anyị\nd*, bụ oriọna m, \q2 \nd Onyenwe anyị\nd* na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè. \q1 \v 30 Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ; \q2 sitekwa na Chineke m apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla. \b \q1 \v 31 “Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke; \q2 okwu ọnụ \nd Onyenwe anyị\nd* bụ ihe a nụchara anụcha. \q2 Ọ bụ ọta nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya. \q1 \v 32 Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị \nd Onyenwe anyị\nd*? \q2 Onye bụkwa Oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke? \q1 \v 33 Ọ bụ Chineke na-enye m ike, \q2 na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke. \q1 \v 34 Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele \q2 Ọ na-emekwa ka m kwụrụ chịm nʼebe niile dị elu. \q1 \v 35 Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha, \q2 ogwe aka m abụọ pụrụ ịrọji ụta bronz. \q1 \v 36 Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m, \q2 inyeaka gị emeela m ka m dị ukwuu. \q1 \v 37 Ị na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ. \q2 Ka nkwonkwo ụkwụ m ghara ịgbụchapụ. \b \q1 \v 38 “Achụrụ m ndị iro m ọsọ, kpochapụ ha. \q2 Alaghachighị m azụ tutu ruo mgbe ha niile lara nʼiyi. \q1 \v 39 Etidara m ha nʼala kpamkpam. Ha enwekwaghị ike ibilite. \q2 Ha dara nʼokpuru ụkwụ m abụọ. \q1 \v 40 Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha. \q2 I wedara ndị niile na-emegide m nʼala nʼihu m. \q1 \v 41 I meela ka ndị iro m tụgharịa gbalaga. \q2 Ebibiekwala m ha niile. \q1 \v 42 Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha. \q2 Ha kpọkuru \nd Onyenwe anyị\nd*, ma ọ zaghị ha. \q1 \v 43 Egwepịara m ha nke ọma, mee ka ha dịrị ka ntụ nke ala. \q2 Asụrụ m ha akwụ, zọtọọ ha dịka apịtị nke okporoụzọ. \b \q1 \v 44 “Ị napụtala m site nʼaka ndị niile na-alụso m ọgụ. \q2 Ị chebere m dịka onyeisi nke ọtụtụ mba. \q1 Ndị m na-amaghị na mbụ na-ejekwara m ozi. \q2 \v 45 Ndị ala ọzọ na-ehulata nʼihu m nʼihi egwu, \q2 ngwangwa ha nụrụ olu m, ha na-erube isi nye m. \q1 \v 46 Obi na-ada ha mba. \q2 Ha na-ama jijiji mgbe ha na-esite nʼebe niile ha e wusiri ike na-apụta. \b \q1 \v 47 “\nd Onyenwe anyị\nd* na-adị ndụ. Otuto dịrị oke nkume m. \q2 Mbuli elu dịrị Chineke m, bụ oke nkume ahụ, Onye nzọpụta m. \q1 \v 48 Ọ bụ Chineke ahụ, onye na-abọrọ m ọbọ. \q2 Onye na-emekwa ka mba dị iche iche nọrọ nʼokpuru m. \q2 \v 49 Onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m. \q1 I mere ka m dị elu karịa ndị iro m. \q2 Napụtakwa m site nʼaka nwoke na-eme ihe ike. \q1 \v 50 Nʼihi nke a, \nd Onyenwe anyị\nd*, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche. \q2 Aga m abụku aha gị abụ otuto. \b \q1 \v 51 “Chineke na-enye eze ya mmeri dị ukwuu. \q2 Ọ na-egosikwa onye ya o tere mmanụ obi ebere. \q2 Ihe ndị a ka ọ na-emere Devid na ụmụ ụmụ ya, ruo mgbe niile ebighị ebi.” \c 23 \s1 Okwu ikpeazụ Devid \p \v 1 Ndị a bụ okwu ikpeazụ Devid kwuru: \q1 “Okwu pụrụ iche si nʼọnụ Devid, nwa Jesi, \q2 ihe si nʼọnụ nwoke ahụ Chineke Onye kachasị ihe niile elu buliri elu. \q1 Nwoke ahụ onye Chineke nke Jekọb tere mmanụ, \q2 onye bụ ọka nʼịbụ abụ nʼala Izrel. \b \q1 \v 2 “Mmụọ \nd Onyenwe anyị\nd* kwuru okwu site nʼọnụ m, \q2 okwu ya dịkwa m nʼire. \q1 \v 3 Chineke Izrel kwuru okwu, \q2 Oke nkume Izrel sịrị m, \q1 ‘Mgbe mmadụ na-achị ndị ọzọ site nʼezi omume, \q2 mgbe ọ na-achị site nʼegwu Chineke. \q1 \v 4 Ọ dị ka ìhè nke ụtụtụ, mgbe anyanwụ na-achawapụta \q2 nʼụtụtụ nke igwe ojii na-adịghị. \q1 Dịka ìhè na-acha mgbe mmiri zochara \q2 nke na-eme ka ahịhịa ndụ na-epupụta nʼala.’ \b \q1 \v 5 “Ọ bụrụ na ihe banyere ụlọ m ezighị ezi nʼebe Chineke nọ. \q2 Nʼezie, ọ garaghị ekwe ka ọgbụgba ndụ ebighị ebi dịrị nʼetiti mụ na ya, \q2 Ọgbụgba ndụ e doro nʼusoro nke e mere ka o guzosie ike nʼụzọ niile. \q1 Nʼezie, ọ garaghị eme ka nzọpụta m zuo oke. \q2 Ma mezukwaara m ọchịchọ obi m niile. \q1 \v 6 Ma ndị ajọ mmadụ ka a ga-atụfu nʼakụkụ dịka ogwu, \q2 nke mmadụ anaghị eji aka ekpokọta. \q1 \v 7 Onye ọbụla metụrụ ogwu aka, \q2 bụ onye nwere ngwa ọrụ igwe maọbụ osisi ùbe. \q2 A na-esure ha ọkụ nʼebe ha tọgbọrọ.” \s1 Ndị ọka agha Devid \p \v 8 Ndị a bụ aha ndị dike nʼagha Devid nwere: \p Josheb-Bashebet, onye Takemon, bụ onyeisi nke mmadụ atọ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom asatọ, bụ ndị o gburu nʼotu mgbe ibu agha. \p \v 9 Onye nke na-eso ya bụ Elieza, nwa Dodayi, onye Ahohi. Dịka otu nʼime ndị dike atọ ahụ, ya na Devid nọ mgbe ha na-akwa ndị Filistia emo, bụ ndị zukọrọ na Pas Damim ibu agha.\f + \fr 23:9 \fr*\ft I lee anya nʼakwụkwọ \+xt 1Ih 11:13\+xt* nʼasụsụ Hibru Pas Damim \ft*\fqa pụtara gbakọrọ nʼebe ahụ\fqa*\f* Mgbe ahụ, ndị Izrel lara azụ, \v 10 ma Elieza guzoro na-alaghị azụ. O gbugidere ndị Filistia ruo mgbe ike gwuru aka ya. Aka ya rapakwaara na mma agha. \nd Onyenwe anyị\nd* nyekwara ha mmeri dị ukwuu nʼụbọchị ahụ. Ndị agha ahụ laghachikwutere Elieza, maọbụ naanị ka ha yipụsịa ndị ahụ e gburu egbu ihe ha yi nʼahụ. \p \v 11 Onye nke atọ bụ Shama, nwa Agee, onye Hara. Mgbe ndị Filistia chịkọtara onwe ha nʼotu ebe, nke e nwere otu ubi jupụtara na lentil, ma ndị agha Izrel niile sitere nʼebe ha nọ gbapụ. \v 12 Ma naanị Shama guzoro nʼetiti ubi lentil ahụ. Ọ napụtara ya, tigbuo ndị Filistia niile ahụ. \nd Onyenwe anyị\nd* nyere mmeri dị ukwuu. \p \v 13 Nʼoge owuwe ihe ubi, mmadụ atọ nʼime iri ndị dike atọ ahụ, jekwuru Devid nʼọgba nkume Adulam, mgbe otù ndị Filistia mara ụlọ ikwu ha na Ndagwurugwu Refaim. \v 14 Ma Devid nọ nʼebe ahụ ewusiri ike nʼoge ahụ, ma ọnọdụ ndị agha Filistia dị na Betlehem. \v 15 Agụụ mmiri gụrụ Devid nke ukwuu. Ọ sị, “Ọ ga-amasị m ma ọ bụrụ na o nwere onye ga-ekunye m mmiri ọṅụṅụ, site nʼolulu mmiri dị nso nʼọnụ ụzọ ama Betlehem!” \v 16 Ya mere, ndị dike nʼagha atọ ahụ wakpuru ọmụma ụlọ ikwu ndị Filistia, seta mmiri site nʼolulu mmiri ahụ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Betlehem, bulatara ya Devid. Ma Devid jụrụ ịṅụ ya, kama ọ wufuru ya nʼala nʼihu \nd Onyenwe anyị\nd*. \v 17 Ọ sịrị, “Ya bụrụ m ihe arụ, \nd Onyenwe anyị\nd*, na m ga-eme nke a. Nke a ọ bụghị ọbara ndị ikom a, ndị ji ndụ ha chụọ aja nʼihi ikute mmiri a?” Devid ekweghị aṅụ ya. \p Nke a bụ ụdị ike dike atọ ahụ kpara. \p \v 18 Abishai, nwanne Joab, nwa Zeruaya, bụ onyeisi ndị ikom atọ ahụ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom atọ, tigbukwaa ha niile. Nʼihi nke a ọ ghọrọ onye a ma ama dịka mmadụ atọ ndị a. \v 19 Ma anaghị asọpụrụ ya nʼebe ọ dị ukwuu karịa iri ndị ikom atọ ahụ? Ọ ghọrọ onyeisi ha. Ọ bụ ezie a na-agụnyeghị ya dịka otu onye nʼime ha. \p \v 20 Benaya, nwa Jehoiada, onye si Kabzeel, bụ dike nʼagha nke kpara ike dị ukwuu. O tigburu dimkpa abụọ ndị Moab, ndị bụ ọkaka nʼagha. O rịdakwukwara ọdụm nʼime olulu na-amị amị nʼụbọchị mkpụrụ mmiri na-ezo, gbuo ya. \v 21 O tigburu otu nwoke onye Ijipt, gbara dimkpa. Ọ bụ ezie na onye Ijipt ahụ ji ùbe nʼaka ya, ma Benaya ji naanị mkpọ jekwuru ya. Pụnara onye Ijipt ahụ ùbe dị nʼaka ya. Jiri ya magbuo ya \v 22 Nke a bụ ụdị ike Benaya nwa Jehoiada kpara. Ya onwe ya nwekwara aha dịka ndị dike atọ mbụ. \v 23 A na-asọpụrụ ya nʼebe ọ dị ukwuu karịa onye ọbụla nʼetiti iri dike atọ ndị ahụ, ma o rughị ogugo ndị dike atọ mbụ ahụ. Devid mere ya onyeisi ndị na-eche ya nche. \b \li4 \v 24 Nʼetiti iri ndị ikom atọ ahụ bụ: \b \li1 Asahel, nwanne Joab, \li1 Elhanan nwa Dodo, onye Betlehem \li1 \v 25 Shama, onye Harod, \li1 Elika, onye Harod, \li1 \v 26 Helez onye Palti, \li1 Ira, nwa Ikesh, onye Tekoa, \li1 \v 27 Abieza, onye Anatot, \li1 Mebunai, onye Husha, \li1 \v 28 Zalmon, onye Ahohi, \li1 Maharai, onye Netofa, \li1 \v 29 Heled,\f + \fr 23:29 \fr*\fq Heled \fq*\fqa bụkwa Heleb\fqa*\f* nwa Baana, onye Netofa, \li1 Itai, nwa Ribai, nke Gibea ụmụ Benjamin, \li1 \v 30 Benaya, onye Piraton, \li1 Hidaị, nke si nʼakụkụ iyi dị na Gaash, \li1 \v 31 Abi-Albon, onye Arba, \li1 Azmavet, onye Bahurim \li1 \v 32 Eliaba, onye Shaalbon, \li1 Ụmụ Jashen, \li1 Jonatan \v 33 nwa Shama, onye Hara \li1 Ahiam, nwa Shara nke Hara, \li1 \v 34 Elifelet, nwa Ahasbaị, onye Maaka, \li1 Eliam, nwa Ahitofel, onye Gailo, \li1 \v 35 Hezro, onye Kamel, \li1 Paraị, onye Aaba, \li1 \v 36 Igal nwa Netan, onye Zoba, \li1 nwa Hagri, \li1 \v 37 Zelek, onye Amọn, \li1 Naharai, onye Beerọt, onye na-ebu ihe agha Joab nwa Zeruaya, \li1 \v 38 Ira, onye Itra, \li1 Gareb, onye Itra \li1 \v 39 na Ụraya, onye Het. \b \li4 Ha niile dị iri ndị ikom atọ na asaa. \c 24 \s1 Devid agụọ ndị agha ya ọnụ \p \v 1 Ọzọkwa, \nd Onyenwe anyị\nd* were iwe dị ọkụ megide Izrel. Ọ kpaliri Devid imegide ha, sị, “Gaa gụọ Izrel na Juda ọnụ.” \p \v 2 Ya mere, eze gwara Joab na ndịisi ọchịagha ya ha so, “Jegharịa nʼebo niile nke Izrel, site na Dan ruo Bịasheba, gụkọtaa ndị tozuru ije agha nʼIzrel niile ka m nwee ike mata ole ọnụọgụgụ ha dị.” \p \v 3 Joab zaghachiri eze, “Ka \nd Onyenwe anyị\nd* bụ Chineke gị, mee ka ndị agha mụbaa, otu onye narị ụzọ, otu onye narị ụzọ karịa. Ka anya onyenwe m, bụ eze, hụkwa ya. Ma nʼihi gịnị ka onyenwe m bụ eze ji chọọ ime ihe dị otu a?” \p \v 4 Ma okwu eze dị ike karịa nke Joab na nke ndị ọchịagha ahụ. Ya mere, ha hapụrụ ihu eze pụọ ịgụ ndị agha Izrel ọnụ. \p \v 5 Mgbe ha gabigachara Jọdan, ha manyere ụlọ ikwu ha na nso Aroea, nʼaka nri obodo ahụ dị nʼetiti ndagwurugwu Gad na-eru Jeza, \v 6 ha gara Gilead ruokwa nʼala Taatim Hodshi, bịarukwaa Dan Jaan, jee gburugburu jeruo Saịdọn. \v 7 Ha jere ruokwa nʼebe e wusiri ike nke Taịa, na obodo niile nke ndị Hiv,\f + \fr 24:7 \fr*\ft Ndị Hiv, na ndị Kenan bụ ndị bi nʼala ahụ tupu ndị Izrel e merie ha nʼagha, chụpụ ha ma bichie ya.\ft*\f* na nke ndị Kenan. Nʼikpeazụ, ha gaara ruo Bịasheba nʼime ndịda Juda. \p \v 8 Mgbe ha jegharịchara nʼala ahụ niile; ha lọghachitere na Jerusalem na ngwụcha ọnwa nke itoolu na iri abalị abụọ ya. \p \v 9 Joab nyere eze ngụkọta ọnụọgụgụ nke ndị agha Izrel. NʼIzrel, ha dị narị puku asatọ, bụ ndị ikom ndị tozuru iji mma agha buo agha, na Juda ha dị narị puku ise. \p \v 10 Ma obi Devid bidoro ịta ya ụta mgbe ọ gụchara ndị ikom na-alụ agha ọnụ. Ọ sịrị \nd Onyenwe anyị\nd*, “Emehiela m nke ukwuu nʼihi ihe m mere. Ma ugbu a, \nd Onyenwe anyị\nd* biko, arịọ m gị, wezuga ikpe ọmụma nke dịịrị ohu gị; nʼihi na emeela m ihe nzuzu dị ukwuu.” \p \v 11 Nʼụtụtụ echi ya, tupu Devid na-eteta nʼụra, okwu \nd Onyenwe anyị\nd* eruola Gad onye amụma, bụ onye ọhụ ụzọ Devid, sị, \v 12 “Gaa gwa Devid, ‘Otu a ka \nd Onyenwe anyị\nd* na-ekwu: Ụzọ ihe atọ ka m na-eche gị nʼihu. Họrọ otu nʼime ha nke m ga-eme ka ọ bịakwasị gị.’ ” \p \v 13 Ya mere, Gad jekwuuru Devid sị ya, “Ọ bụ ka oke ụnwụ ịda nʼala gị afọ atọ? Ka ọ bụ na ị ga-agbalaga site nʼihu ndị iro gị ọnwa atọ, ka ha na-achụ gị ọsọ? Ka ọ bụ ka ajọ ọrịa na-efe efe daa nʼala gị mkpụrụ ụbọchị atọ? Ugbu a, chee echiche, kpebie ọsịsa ị chọrọ ka m weghachiri onye ahụ zitere m.” \p \v 14 Devid sịrị Gad, “Anọ m nʼoke nsogbu, ọ ka mma ka anyị daba nʼaka \nd Onyenwe anyị\nd* karịa ịdaba nʼaka mmadụ, nʼihi na obi ebere ya bara ụba.” \p \v 15 Nʼihi ya, \nd Onyenwe anyị\nd* zitere ajọ ọrịa na-efe efe nʼala Izrel, site nʼụtụtụ ahụ ruo oge akara aka. Ọ bụ iri puku mmadụ asaa nwụrụ site na Dan ruo Bịasheba. \v 16 Mgbe mmụọ ozi ahụ setịpụrụ aka ya ibibi Jerusalem, o wutere \nd Onyenwe anyị\nd* nʼihi oke mbibi ahụ. Ọ sịrị mmụọ ozi ahụ nke na-eweta nhụju anya nye ndị mmadụ, “O zuola. Seghachi aka gị.” Mgbe ahụ, mmụọ ozi \nd Onyenwe anyị\nd* nọ nʼebe ịzọcha ọka Arauna onye Jebus. \p \v 17 Mgbe Devid hụrụ mmụọ ozi ahụ na-etida ndị mmadụ, ọ sịrị \nd Onyenwe anyị\nd*, “Ọ bụ mụ onwe m mehiere; mụ bụ onye ọzụzụ atụrụ, mere ajọ omume. Ma ndị a bụ naanị ụmụ atụrụ, gịnị kwanụ ka ha mere? Ka aka gị dịgide naanị nʼahụ m, dịgidekwa nʼahụ ndị ụlọ m.” \s1 Devid ewuo ebe ịchụ aja \p \v 18 Nʼụbọchị ahụ, Gad bịara nʼụlọ Devid gwa ya sị, “Gaa, wuore \nd Onyenwe anyị\nd* ebe ịchụ aja nʼebe ịzọcha ọka Arauna, onye Jebus.” \v 19 Ya mere, Devid rubere isi gaa mee dịka iwu \nd Onyenwe anyị\nd* nyere site nʼọnụ Gad. \v 20 Mgbe Arauna weliri anya hụ eze na ndị ọrụ ya ka ha na-abịa nʼebe ọ nọ, ọ pụtara kpọọ isiala nye eze. Kpudokwa ihu ya nʼala. \p \v 21 Arauna sịrị, “Gịnị mere onyenwe m, bụ eze ji bịakwute ohu ya?” \p Devid zaghachiri, “Abịara m ịzụrụ ebe ịzọcha ọka gị, ka m nwee ike wuore \nd Onyenwe anyị\nd* ebe ịchụ aja; ka akwụsị ọrịa a na-efe efe dakwasịrị ndị mmadụ.” \p \v 22 Arauna sịrị Devid, “Ka onyenwe m, bụ eze were ihe ọbụla ọ chọrọ, werekwa chụọ aja. Lee ehi maka iji chụọ aja nsure ọkụ, leekwa ihe igwe ịzọcha ọka niile, na osisi ndị ahụ niile a na-anyanye ehi nʼolu,\f + \fr 24:22 \fr*\ft Lit. \ft*\fqa yoku\fqa*\f* ka ha bụrụ nkụ. \v 23 Eze, ihe ndị a niile ka mụ bụ Arauna na-enye eze, ka \nd Onyenwe anyị\nd* Chineke gị nabatakwa gị.” \p \v 24 Ma eze zaghachiri Arauna, “Ee, aghaghị m ịkwụzu gị ụgwụ ya, nʼihi na agaghị m achụrụ \nd Onyenwe anyị\nd*, bụ Chineke m aja nsure ọkụ nke na-agaghị efu m ihe ọbụla.” \p Ya mere, Devid zụrụ ebe ịzọcha ọka ahụ na ehi ahụ niile, kwụọ Arauna iri shekel ọlaọcha ise, nʼihi ha. \v 25 Devid wuru ebe ịchụrụ \nd Onyenwe anyị\nd* aja nʼebe ahụ. Chụọkwa aja nsure ọkụ na aja udo. Mgbe ahụ, \nd Onyenwe anyị\nd* zara ekpere o kpere nʼihi ala ahụ. Nrịa nrịa ahụ na-efe efe nke dakwasịrị Izrel kwụsịkwara.